Ekwenyeghị m na o nwere ihe dịka Jubril nke Sudan so n'ihe na-esere mụ na ndị Ipob - Uche Mefor

Uche Mefor bụ onyeisi mgbasa ozi nke atụmatụ Biafra Defacto Customary Government, ma bụbụrụ Osote Onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ekwuola na okwu Jubril nke Sudan so n'ihe butere esemokwu n'etiti ya na Nnamdi Kanu.
Maazị Mefo kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ihe mmemme "Okwu A Kpụ N'Ọnụ" e mere n'ehihe Mọnde.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Cheta na Nnamdị Kanu bụ onyeisi Ipob na-ekwusi ike na Buhari anwụọla, ma sịkwa na-eji onye a kpọrọ Jubril nwoke Sudan nọchịe anya ya.
Maazi Kanu mechara sị na ọ bụzị nwoke Nije nọchiri anya Buhari dịka ọ sị na "Jubril anwụọla na Saụdị Arebịa".
Maazị Mefor sị na ya kwenyere na Buhari nọ ndụ, kama "ahụ adịghị ya mma."
Ihe ndị ọzọ dị ọkpụrụkpụ Maazị Mefor kwuru na mkaprịtaụka ahụ bụ:
1: Ọ bụ ndị otu patị "Peoples Democratic Party" (PDP) ka ha na Ipob nwere nkwekọrịta maka ntuliaka nke 2019 nke mere Kanu chiri si ka ndị otu ha soro tụọ vootu.
2: A na-akwụ m ụgwọ ọnwa n'Ipob dika Osote Onyeisi, nakwụkwa ndị ọzọ ụgwọ site n'ọrụ ha na-arụ. Amaghị m ihe mere o jiri bụrụ nke m ka akpụ n'ọnụ. Onyeisi Ipob bu Kanu na-akwụkwa onwe ya ụgwọ ọnwa.
3: Ekwere m n'uche e jiri hibe Eastern Security Network mana ekweghi n'atụmatu ha busowe agha. H akwesiri ịbụ ndị nchekwa makana iwu kwenyere ka mmadụ kwekwaa onwe ya.
4: Ọ bụ ndị ọchịchi ka ọ dịri ịhu n'obodo nwere nchekwa.
5: Akwadoghị m mwakpo a na-awakpo ụfọdụ ụlọ ọrụ ndị uweojii nakwa ndi ọrụ nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ.
6: Biafra Defacto Customary Government bụ atụmatu ime ka ndị niile na-achọ Biafra nọdụ n'otu.
7: Obi siri m ike dịka m hapụrụ Ipob. Obi adịghị eme m nmarara.
8: Ọ bụghị Asari Dokubo họpụtara onwe ya ịbụ onyeisi Biafra Defacto Customary Government. Anyi họpụtara ya iji gosi ịdịnotu.
9: Amaghi m maka echi banyere mkpesi mụ na Nnamdi Kanu.
10: Ekwenyere m na Biafra ga-abịa











