Uche Mefor: "Agaghị m Dubai ka ọ fọdụzie ịda n'ala nke ibu m gawa ụlọọgwụ"

Uche Mefor

Ebe foto si, Uche Mefor/Facebook

Uche Mefor onye bụbụ osote onyeisi ndị otu 'Indigenous People of Biafra' asaala ebubo ndị otu ahụ boro na ọ dara n'ala Dubai.

N'ozi o zigaara BBC Igbo, Mefor sị na onweghi mgbe o ji gaa na Dubai ka ọ fọdụzie ịda n'ala nke buru ya gawa ụlọọgwụ.

N'okwu ya "E nweghị mgbe m ji gaa Dubai ma fọdụzịe ịda n'ike maọbụ i gaa ụlọọgwụ"

"Ihe a bụ akụkọ ugha nke ndị otu Ipob na ekesa, ịhụ na ha meghariri ndị mmadụ anya. Ha mụtara agwa a n'aka onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu"

O gara n'ihu kwuo sị "Ha chọrọ iji ihe mmegharị anya a mee ka ndị mmadụ hapụ igbado anya n'ihe ọjọọ na mpụ niile ha merela n'ala Biafra"

Uche Mefor

Ebe foto si, Uche Mefor/Facebook

"'A buru otu Ipob ọnụ, eluigwe na ala niile gbadoro ha azụ maka mpụ ha merela"

Nke a bụ maka na akụkọ na-efegharị na nwa amadị ahụ gharịpụrụ oge ọ gara otu ọgbakọ na Dubai.

Ọtụtụ ọba ozi ịntaneetị ebuola ya bụ akụkọ. Otu onye tinyekwara akụkọ ahụ n'ebe nkwupụta okwu BBC Igbo na Facebook.

Ha na-ekwu na ụbọchị ihe ahụ mere bụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Ọgọst afọ 2021.

Dịka akụkọ ahụ si kwuo, ndị IPOB niile ṅụrụ iyi na ha agaghị agbakụta otu ahụ azụ; ha na-akọwa na ọ bụ iyi ahụ ha ṅụrụ kpatara ihe mere Uche Mefor.

Lee ihe anyị ma ugbua?

Uche Mefor

Ebe foto si, Uche Mefor/Facebook

Dịka Mazi Uche Mefor hapụchara IPOB nakwa Radio Biafra, o mepere ụlọọrụ nzikọrịta ozi nke ya ọ kpọrọ 'Biafra Human Rights And Freedom Radio' (BHFR).

Onye na-agbasa ozi n'ụlọọrụ ahụ bụ nwa amadị aha ya bụ George Onyibe, mana Uche Mefor na-eji akara Facebook ya ekesa mgbasa ozi ahụ kwa ụbọchị.

Aha onyonyo, Asari ejighi aka ya mee onwe ya onye isi oche Defacto Biafra Government - Uche Mefor

Oge ikpeazụ Mefor kesara ozi na Facebook bụ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Sepụtemba, n'elekere iri nke abalị.

Ọ bụrụ eziokwu na Uche Mefor dara na Dubai n'ụbọchị 29 nke Ọgọst, onyezi ji akara Facebook ya gbasaa ozi n'ụbọchị mbụ nke Septemba?

Gịnị na-esere Mefor na IPOB?

Uche Mefor na Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Radio Biafra

Nkọwa foto, Uche Mefor na Nnamdi Kanu oge ha abụọ bụ ji na mmanụ

O doro anya na Mazị Uche Mefor na ndị otu IPOB adịzịghị na mma kamgbe ọ gbara arụkwaghịm dịka osote onye isi ha.

Kamgbe ahụ, ọtụtụ akụkọ esila n'aka ndị IPOB pụta nke na-akatọ aha Mefor ma na-ekwu na ọ bụ ụgwọ ka ndị iro Biafra kwụrụ ya iji gbahapụ onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu.

Uche Mefor ekwuola ugboro ugboro na aka ya dị ọcha, ma kọwaa na ọ bụ maka na ọ chọpụtala na Nnamdi Kanu bụ onye aghụghọ kpatara o ji kwụsị iso ya.

N'ụbọchị 24 nke ọnwa Ọgọst, Mefor kwuru sị: "Dịka onye so hibe ntọala IPOB, ewepụla m ngọzị m na ya bụ otu ma bụkwaa ya ọnụ."

Ọ gwara ndị mmadụ ka ha wepụ uche n'akụkọ asị niile ndị IPOB na-ebugharị n'ihi na "eziokwu ga-apụta ihe ma oge ya ruo."