Uche Mefor: Mpaghara Ipob nke m nọ na ya so hibe 'Biafra De facto Customary Government'
Ọ bụ n'abalị Satọde bụ ụbọchị 14 nke ọnwa Maachị ka Asarị Dokubo, Uche Mefor, Ralph Uwazurike na ụfọdụ ndị ọzọ zụtere ndị ntaakụkọ n'ọgba ozi Zoom were kwuo na ha ehibela atụmatu ha kpọrọ "Biafra Defacto Customary Government.
Ha sịkwa na Maazị Asari Dokubo ga-abụ onyeisi oche ogige ọhụrụ a dịka Uche Mefor ga-abu onye Ode Akwụkwọ ha.
Ihe pụtara na nzukọ ahụ na-aga n'ihu bụ na atụmatụ ọhụrụ sonyekwara na-ịchọ nwereonwe mpaghara Naịjirịa dị n'Ọwụwa Anyanwụ iji kewapụta mba a kpọrọ Biafra.
Ugbua, e nwere otu Indigenous People of Biafa (Ipob), nwee otu Lower Niger Congress (LSC), nwee Biafra Indepence Movement (BIM) nakwa Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra (Massob).
Mana Uche Mefor gwara BBC Igbo na atụmatụ ha bụ nchịkọta otu ndị a niile "maka ọdịmma ndị Biafra".
Ọ kọwara ihe mere ha jiri hibe ya bu ogige nakwa ihe mere ha jiri mee Maazị Asari Dokubo onyeisi oche.
Ọ sị, "Ọ bụghị Asari wepụtere onwe ya, na ọ bụ anyị niile weputere ya."
Gụọ akuko a n'uju.
Ọtụtụ ọnụ, otu ebumnuche
Otu ndị a niile na-ekwu na ha na-achọ otu ihe.
Mana, nke bu eziokwu bụ na ụzọ ha si aga dị iche iche.
LNC sị na ha chọrọ iso n'ụzọ ha kpọrọ "Constitutional Force Majeure" nke ha na otu ndi ọzọ gbakọrọ n'okpuru ogige a kpọrọ "Nigerian Indigenous Nationalities Alliance of Self-Determination".
Ha kọwara na site n'atụmatụ "Force Majeure" dịka nchabi ihe jikọrọ agbụrụ Naịjirịa niile ibu otu mba.
Ipob n'onwe ha na-achọ ka emee ntuliaka n'ọnụdụ nke Bekee kpọrọ "Referendum" iji mara ndị chọrọ ikewa nwereonwe ha na ndị chọrọ ịnọ na Naịjirịa.
Nke bụ eziokwu ma enyochaa ebumnuche otu ndị a niile bụ na, ha chọrọ otu ihe - nwereonwe.


