Asari Dokubo vs Nnamdi Kanu: Asari Dokubo ataala ụkwa jaa eze

Nnamdi Kanu na Asari Dokubo

Ebe foto si, Getty Images/Asari Dokubo/Facebook

Asari Dokubo ekwuola na onye ndụ IPOB bụ Nnamdi Kanu abụghị onye na-anabata ihe ọma mmadụ mere ya.

O kwu kwara na Nnamdi ebutego Ikpọ oke n'etiti ya na ndị niile chọrọ itinye aka kwilite atumatu na oga n'ịru Biafra, akatokwara agwa a.

O kwu kwara na Nnamdi jị okwu ndị Igbo akpata ego, na okweghi aka oru ozu onwere. O dọrọ ndị Igbo aka na nti kwu na Nnamdi abughi ezigbo onye ndu, na o bụ onye nachọ ọdịmma onwe onye nanị.

N'okwu ya, o sị na ndị Igbo kwesiri itụgharị uche na etu ha sị eso Nnamdi Kanu makana ọ naghị agwa ha eziokwu.

N'ọnụ ya, "ọ bụrụ na Kanu nyere m nde iri abụọnaira, e ji akwụkwọ alakụba an̄ụ iyi ka Allah gbuo m"

O kwuru na ọ na-ewute ya na ndị Igbo na-adọnyere onye dịka Kanu ukwu.

O kwara na Kanu ga-eji aka ya gbuo onwe ya ma na-adọ ya ka na ntị na ọ ga-akwatụ ya makana ihe ọ na-eme agaghị eweta Biafra maoli.

Mana ọnụ na-ekwuru Indigenous People of Biafra bụ Emma Powerful kwuru na o nweghị ihe Ipob ga-asa Dokubo n'okwu niile a

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Ihe mere m ji akatọ ụfọdụ ndị ọchịchị n'ala Igbo

Powerful kwuru na ọ bụrụ na ndị mmadụ chọrọ ikwete ihe niile Dokubo kwuru ha gaa n'ihu.

BBC Igbo juru ya maka ego nde iri abụọ naira Dokubo na-ago na Ipob nyere ya, Powerful kwetere na Ipob nyere Dokubo ego ahụ.

O kwuru na Ipob enweghị ihe ha ji okwu Dokubo kpọrọ.

"Asari Dokubo na IPOB enweghi nsogbu"

Cheta na oge gara aga otu onye na-ekwuchitere otu Ipob bụ Paul Achalla ekwuola na enweghị esemokwu dị n'etiti otu Ipob na Asari Dokubo kama na ọ bụ Dokubo na onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu nwere nghọtahie.

Nke a na-eme dịka Nnamdi Kanu na Asari Dokubo na-eborịta onwe ha ebubo nrụrụaka.

Dokubo nọrọ n'ihe onyonyo na-efegharị na social midia boo Kanu ebubo na ọ na-anata ego n'aka ndị gọvanọ ala Igbo.

N'otu aka ahụ Nnamdi Kanu boro Dokubo ebubo na o nyere ya nde Naịra iri abụọ.

Nke mere Dokubo ji were akwụkwọnsọ ndị alakụba bụ Koran nụo iyi dịka ọ si na Kanu soro ya nụọ iyi ma ọ bụrụ na aka ya dị ọcha

Dokubo gwakwara Kanu ka o mee ka o siri mee kama a nụbeghi ọsịsa Kanu.

Otu onye ọkaikpe na-anọchite anya otu Ipob bụ Paul Achala tinyere ọnụ na ya bụ okwu.

O kwuru sị "onye lere anya ọfụma ga-ahụta na onyeisi anyị na ndị Gọvanọ adịghị na mma".

Achala kwuru na ọ bụghị eziokwu na gọvanọ na-enye Kanu ego.

O kwukwara na-enweghị ego ọbụla gọọmentị ga-enye mmadụ ka ndị nchekwa DSS hapụ ịmata.

O kwuru sị " alụwa ọgụ a naghị achọ ya mma n'ihi na enweghị okwu no n'Akụkọ a".

Ajụrụ ya maka ihe Dokubo kwuru na ndị IPOB nọ n'ụlo ya, ọ zara sị ; " Asari kwetere na ọ bụ Biafra, ya na onyeisi anyi nwere nghọtahie ya na Biafra enweghi nghọtahe".

Achala kwuru na onye ọbụla kwenyere na Biafra bụ onye Ipob.

Kedu maka ị sị Asarị Dokubo ṅụo iyi kama Kanu aṅụghị?

O kwuru sị "Akwụkwọ nsọ akwadoghị ịnụ iyi, n'ihi na bibụlụ sị 'ka ee gi bụrụ ee gị'.

Achalla na a na-eji mmanụ eri okwu n'ihi na okwu dị na nka.

O kwukwara na-enwereike bụrụ ihe ha abụo kpatara n'ihi na nke mmadụ nụrụ ka nke akpara akpa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, 'Ahụzịghị m nwa m na nkwa niile o kwere m' - Nne Tine Ezekwe