BBC Igbo Townhall Meeting: Anyị chọrọ ka a kpọọ ndị na-eto eto na ndị ọzọ ọgbakọ udo - Ohaneze, Mefor, Briggs wdg

Ndị welitere isi n' ala Igbo ekwuola na mmegbu na mkpagbu, adịghị n'otu na nkịtị ndị gọvanọ ọwụwa Anyanwụ na-agba so na ihe butere ndakpọ ọnọdụ nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ,
Ihe ndị a bụ okwu pụtara na mkparịtaụka obodo BBC kpokobara n'abalị Wenezde n'ikuku.
Lee ọkpụrụkpụ okwu pụtara:
Ndị gọvanọ anyị na-eme ihu abụọ- John Godson

Mazi John Godson sị na-enwere ihu abụọ ebe ndị gọọmentị nọ maka na ha anaghị ekwucha eziokwu.
"Anyị kwesiri ị na-adụ onwe anyị ọdụ maka ihe n'eme n'ala Igbo."
Ndị mmadụ kwukwara na ha nọ n'ụjọ n'Ụmụahia.
Ndị ahịa na-ekwu na ahịa adịghịzị maka ọnọdụ nchekwa n'ala Igbo.
N'otu aka ahụ, ndị ọrụ oyibo sị na ụmụakwọkwọ anaghị abịa akwụkwọ maka egwu ndị mwakpo.
Anyị na otu ndị na-eti mkpu mnwere onwe na-akpa etu aga esi weta udo- Alex Ogbonna(Ohaneze)

Ebe foto si, Alex Ogbonna
Alex Ogbonna - Ọ na-ewute Ọhaneze ndị Igbo na enwebeghị ezi nchịkọta mgbasara ndị nche Igbo agbanyeghị na enweela Ebube Agu.
Amalitela ịkpa ntaka ugbua na etiti ndị otu na-achọ mwere onwe nakwa ndị gọọmentị. Bishop Chukwuma bụ onye na-ekwuchitere ndị gọomenti.
Mazị Godson kwukwara na dịka anyị na-ekwu okwu udo anyị kwesiri ịna akwado maka ihe ọzọ nwere ikeịdapụta na ọgbaaghara a.
Kemgbe ka anyị hapụrụ ndị ọzọ ikọta ihe oriri anyị na-eri- Annkio Briggs

Annkio Briggs chetere ndị mmadụ ka ihe siri dịrị kemgbe a lụchara agha were ya tule ka ọ dị taa.
O kwuru na ka ha si kee steeti kerichara anyị dịka ndị Ọwụwa Anyanwụ na ndị Ọdịda anyanwụ mere ka anyị na-akpa oke n'ime onwe anyi.
Ọ sị na ya aghọtaghị ihe mere ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ na nke ndị ọdịda anyanwụ agaghị na-enwe ọgbakọ na-ekwu maka ọdị mma anyị.
Ọ sị na ọ gbagwojuru ya anya ka ndị Ugwu si ekwu mgbe ndị Ọdịda Anyanwụ ga-eri osikapa na ọ bụ tomatosụ.
Briggs na-ekwu na ya bụ ọnọdụ jọgburu onwe ya.
"Kemgbe ka anyị hapụrụ ndị ọzọ ikọta ihe oriri anyị."
"Ndị anyị na-akpọ ndị na-emegbu anyị, ị gaghị ahụ ebe ha na-akụgbu onwe ha. Anyị anaghị achọ ọdịmma nke anyị. Anyị kwesịrị ị na-achọ etu anyị ga-esi dị ndu."

Mazi Uche Mefor sị na o nweghị ebe e ji azụ aga ruo mgbe ndị ọchịchcị kpọkụrụ ndị ntorobia nakwa ndị ọzọ maka mkpakọrịta ụka puruiche.
Ọ sị na ndị ọchịchị ọwụwụ anya gbahapuru ụmụ ntorobịa maka na ihe na-eme bụ na iwe na-ewe ndị ntorobia.
Ọ sị na ọbụghị naanị ndị Ipob na MASSOB na-achọ maka mwere onwe.
Ma dụkwa ndị ọchịchị ọdụ sị ka ha ghara ịsọ ndị isi ha nọ na gọọmenti etiti anya amaka na ọ bụghị ha wepụtara ha.
Ọ sị ha "kporo ọgbakọ ụmụ ntorobia maka nkwekọrịta".
Ndị gọvanọ na ndị ọchịchị na-agba ọnyụpa n'okwu imetụtara ndị Ọwụwa Anyanwụ- Nnedi Ogazie

Ebe foto si, Nnedi Ogazie
Nnedi Ogazie sị na o nweghị udo obula aga ekpe ghara ụmụnwaanyị.
Ọ tụrụ arịrị na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ na-agba ọnyụpa, sị na ya aghọtaghị ihe ndị ọchịchị ala Igbo na-eme eme.
Ọ na-ebo ebubo na uche ndị ọchịchị ala Igbo anaghị anọ na mmepe ala Igbo.
Ọ sị na "ọ bụrụ na ụmụ anyị enweghị obi ụtọ, obi agaghị adị anyị mma"
Ọ na-ekwusi ike na ọ bụ naanị n'ala Igbo ka ana akpa oke.
Ọ sị na-ana achụ ndị Igbo ebe ọ bụla ha gara.
N'okwu ndakpọ nchekwa n'ọwụwa Anyanwụ, o kwuru na mbụ na ọsọ chụwa onye Igbo ọ gbalawa Ọwụwa Anyanwụ mana ọ ghịwa otu a ugbua n'ihi ihe na-akpọtụ na mpaghara ahụ.
"Ọ dị mkpa na ndị Igbo meziri ụlọ ka anyi hụ ebe anyị ga-agbaga ma ọsọ su".
Nwaada Judith na-ekwu na ọ bụghị naanị ndị Gọvanọ ka ya bụ ọrụ diiri, na ndị omeiwu kwesiri ịnwe otu olu n'ihe a na-eme.
Mazi Ogbonna ya zara na ndịdi ka anyi ga-eje nweta ihe niile anyị chọrọ.
Ọ sị na nsogbu anyị n'ala Igbo bụ na ndị ntorobia anaghị ekwe ekwe.
Mazi Ezeoke na-akọwa na ndị omeiwe ala Igbo kwesiri kwụsị ike ka ndị ha na-anọchite anya ha mara na ha gbara mbo.
Lilian Obiechina sị na ọdịghị mfe ibiakọ ọnụ dịka Briggs si kwuo maka ndọrọndọrọ ọchịchị.
Briggs zara na ọ ka mma na ndị agbụrụ a niile kwesiri ịhụ onwe ha dịka ndị nwere otu ndị iro.
Ọ sị na "anyị enweghị ohere ịkwu ihe anyị chọrọ maọbụ nke anyị achọghị". Anyị kwesiri ịge onwe anyị ntị ime ka anyị nwee nkwekọrịta otu anyị ga-esi lụọ ya bụ ọgụ".
Na mpịachi, Nnedịmma sị na "Izu ka mma na nne ji".
Godson sị na ọ ka mma ka anyị ihu onwe anyị na-anya maka ọ bụ ihe ga-enyere anyị aka ịme ka akụ rụọ ụlọ.
Ọ sị na nke a ga-enye aka ka ndị niile nọ n'ala Bekee nweike ịme ka akụ rụọ ụlọ
Uche Mefor na-asị na ọ bụ "Referendum" ga-egbo ọgụ a na ọnweghị ihe "restructuring" ga-emeta.
Ankkio Briggs sị na iwe dị ebe niile ọbụghị naanị n'ala Igbo.
Ọ sị na anyị kwesiri ịchọta ụzọ udo anyị ga-esi soro nsogbu anyị nwere.













