Ndị uweojii ekwuola ka ha si nwuchie ndị 'Unknown Gunmen' kpara mkpa n'Owerri taa

Ndị uweojii ekwuola ka ha si nwuchie ndị 'Unknown Gunmen' kpara mkpa n'Owerri taa

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ka chi foo

    Daalụ dịka ị nọnyere anyị taa

  2. Igangan Update: Ndị oji egbe awakpoola ma gbuo ihe ruru mmadụ itolu n'Oyo Steeti.

    Ụlọ Eze Asigangan

    Ebe foto si, Monsuru Aderoju

    Ndị ojiegbe awakpoola ma gbuo ihe ruru mmadụ itolu n'obodo Igangan, dị n'okpuru ọchịchị Ibarapa nke dị n'Oyo steeti n'abalị satụde.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steti ahụ bụ Wale Osifeso kwuru na ndị nchekwa na ndị dinta gbara mbọ iji hụ na ndị omekome a emezughị uche obi ha.

    Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ndị mere ya bụ mwakpo na-asụ asụsụ ndị ọchiehi.

    Ndị omekome a wakporo ma gbaa Obi Eze obodo ahụ bụ Asingangan ọkụ ya na ụgbọala ndị nọ ebe ahụ.

    Cheta n'ọnwa ole gara aga, ndị obodo a chụpụrụ ndị Fulani bi ebe ahụ maka ebubo igbu otu nwa amaala ha.

  3. Gere akụkọ dị mkpa n'otu nkeji

  4. Ihe gọọmenti Anambra ga-emere ndị ọdachị Kwata dị n'Awka metụtara

    Obiano

    Ebe foto si, Obiano social media

    Gọọmenti Anambra steeti ekwuola na ha ga-akwụ ụgwọ ụlọọgwụ ndị ihe mberede okporoụzọ Kwata dị n’Awka mere n’ụbọchị anọ nke ọnwa June metụtara.

    Cheta na ihe ọdachị okporoụzọ a mere mgbe ụgbọala bu ehi, gbachapụrụ n’ụzọ ma gbuo mmadụ asatọ nakwa mebie ụfọdụ ụgbọala.

  5. "Anyị gbagburu ndị omekome ise, nata ha Ak47 ise "- Uweojii

    Ndị uweojii

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii nọ n’Imo steeti ekwuola etu ha si kwụsị ndị omekome biara ịwakpo isi ụlọọrụ ndị uweojii dịketere Works Layout n’akụkụ ụlọakwụkwọ Avan Nursery na Primary.

    Bala Elkana bụ ọnụ na-ekwuchitere nị uweojii n’Imo steeti kwuru na ha gbagburu ndị omekome ise ma nataa ndị omekome ahụ AK47 ruru anọ.

    Elkana na ndị ntaakụkọ nwere mklparịta ụka ebe o kwuru na ha zopụtara otu nwaanyị onye uweojii ndị omekome a nwuchiri ma mebie ogige ebe ha bi.

    Ọ makwara ọkwa sị, " Anyị na-enye ndị niile zuru egbe ndị uweojji ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Jun ka ha wehachi ya, maka ọ ga adị onye ahụ njọ ma anyị bido nzacha anyị mgbe ụbọchị ahụ gachara".

    Elkana kọwara na ọgwụ 'Ode eshi' ndị a ha gburu yi n'ahụ ha azọpụtaghị ha.

    O kwuru sị, " Anyị chọrọ ka ụlọ oriri na ọṅụnụ niile nọ n'Owerri bido rụwa ọrụ dịka ha si arụ na mbụ, ka Owerri lọhachi kwa dịka obodo aṅụrị eji mara ya".

    Gee mkparịta ụka Bala Elkana bụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo Steeti dịka ha gburu ndị chọrọ ịwakpo ụlọọrụ ha n'ụbọchị isii nke ọnwa Jun afọ 2021..

  6. Igbo ndị ọma!

    Anyị na-anabata ụnụ ebe a dịka anyị ga-ewetere ụnụ akụkọ kachasị mkpa n'ala Igbo, Naịjirịa, nakwa mba ụwa niile.

  7. Ka chi foo nu

    Daalụ dịka ị nọnyere anyị taa

  8. " A hụrụ m ozu mmadụ 35 na FMC Owerri" - Archishop Anthony J.V Obinna

    Archishop Anthony J.V Obinna

    Ebe foto si, Catholic Archdiocese of Owerri/Facebook

    Archbishop nke Owerre bụ Anthony J.V Obinna edepụtala akwụkwọ ozi degara Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma maka ọgbaahara nọ N'Imo steeti.

    Obinna kwuru na ọ gwara Uzodinma na ndị ọchịchị Igbo ndị ọzọ n'afọ gara aga ka ha chekwa ndị mmadụ na kwa ala Igbo niile gburugburu.

    O kwuru na ọ bụ maka mwakpo ndị ọchiehi mere o jiri gwa ha ya bụ okwum oge ahụ.

    Obinna kwuru na o mere njem n'ụlọ nga Federal Correction Centre nke dị n'Owerre n'ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Mee were hụ ndị ntoroọbịa otu narị na isii anwụchịrị maka ebubo ịgba gọọmentị Naijirịa mgba okpuru.

    O kwuru sị na atọhapubeghị ndị okoroobia ma ruo ugbua.

    Obinna kwukwara na ya gara Federal Medical Centre nke dị n'Owerre were hụ ozu mmadụ iri atọ na ise a na amaghị ndị ha bụ nke ndị oji egbe amaghị, ndị agha na ndị uweojii gburu.

    O kwuru sị, "E chere m maka ndị akpọrọ gaa ebe enweghị onye ma were gbuo, dịka anyị si anụ...Imo Steeti na-agba ọbara".

    O kwukwara sị, " Mụ na ndị niile dị ndụ ma ndị nke nwụrụla maka ọgbaahara a, anyị na-agwa Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma dịka onyeisi nchekwa na Imo steeti ka o bilie ma kwụsị ogbugbu a n'Imo Steeti".

    Obinna gwara Gọvanọ Imo steeti ka ọ lehara ihe niile ma kpọọ oku nzụkọ iji kwụsị ọgbaahara na-ememila Imo steeti.

  9. Gere akụkọ dị mkpa n'otu nkeji

  10. Ndị omekome awakpoola ma gbuo mmadụ ise n'obodo Igabi na Chikun nke dị na Kaduna Steeti

    Kaduna, Nigeria

    Ndị omekome egbuola mmadụ ise ma merụọ mmadụ abụọ ahụ dịka ha wakporo obodo ndị dị n'okpuru ọchịchị Igabi na Chikun nke dị na Kaduna steeti.

    Ọ bụ kọmịshaọna na-ahụ maka nchekwa obodo steeti ahụ bụ Samuel Aruwan kwuru nke a.

    Dịka o sịrị dị, ndị a gbara otu ụlọụka Assembles of God Church ọkụ ya na otu ụlọ obibi.

    Aruwan kwuru na ụfọdụ nwunye ndị ụkọ chukwu merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọagụ ugbua.

  11. Ndị oji egbe egbuola ihe dịka mmadụ 100 na mba Burkina Faso

    Mapụ Burkina Faso

    Onyeisiala mba Burkina Faso bụ Roche Kabore ekwuola na ihe dịka mmadụ otu narị anwụọla dịka ndị oji egbe wakporo obodo Solhan nke dị na mpaghara ugwu mba ahụ n'abali.

    Dịka ụlọ ntaakụkọ Reuters siri kwuo na ọ bụ akwụkwọ ozi gọọmentị mba ahụ depụtara ka ha kwuru na ụlọ ndị mmadụ na ahịa so na ihe gbara ọkụ.

    Enwebeghị otu kwuru na ọ bụ ha kpara ya bụ arụ kama mwakpo n'aka ụfọdụ ndị otu alakụba na akawanye njọ ọkachasị n'obodo ha na Niger maọbụ Mali nwere oke.

  12. Ngalaba NCDC edeputala na mmadụ 48 ọzọ ebutela ọrịa covid-19 na Naijirịa

    Ngalaba na-ahụ maka nje na Naijirịa bụ NCDC n'aha ịchafụ ekwuola na mmadụ iri anọ na asatọ ọzọ ebutela ọrịa covid-19 na Naijirịa.

    Ọnụ ọgụgụ ha gosiri na ọ bụ na Legọs steeti ka ọnụ ọgụgụ ha kachasị dịka mmadụ iri na isii bụtere ya ebe ahụ.

    Enweghị onye nwụrụla n'aka ya bụ ọrịa nsonso a.

    Coronavirus update

    Ebe foto si, NCDC

  13. Oduduwa Nation

    Ndị otu Yoruba na-achọ Oduduwa Nation na-enwe ọgbakọ ukwu ha nke ugboro isii bụ nke na-akpọtụ n'Ado Ekiti taa bụ Satọde.

    Ya bụ ọgbakọ nke ha kpọrọ Ekiti Mega Rally bụ ndị otu kpọrọ onwe ha Ilana Omo Odua na-eme ya n'isiobodo steeti ha nille.

    Ndị otu a emebuola udiri ọgbakọ a n'Ibadan,Osogbo,Abeokuta,Akure na Akure.

    N'ọgbakọ nke ikpeazụ ha nwere n'Akure, onyendu ndị otu a bụ Sunday Adeyemo, Igboho kenere gọvanọ steeti ahụ bụ Rotimi Akeredolu maka ịnabata ha agbanyeghị na Gọvanọ ahụ ji ọsọsọ gọpụ isi onwe ya sị na ya ekweteghị na ya bụ Oduduwa Nation.

    Gọvanọ Ekiti steeti enweghị ihe ọ na-ekwu maka ya bụ ọgbakọ ndị otu a mana onyendu ndị gọvanọ ọdịda anyanwụ bụ Kayode Fayemi na ekwusi ike na ya akwadoghị ndị Yoruba isi na Naịjirịa pụọ.

  14. 'Welatanụ aka n'ikpoko ụmụaka Igbo ndị ọrụ nchekwa' - Ohaneze ndị Igbo

    Ohaneze Ndi Igbo

    Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo etiela mkpu maka otu gọọmentị etịtị sị akpụkọ ụmụokorobia na mpaghara ahụ n'ụdị na ha na ebuso mpụ agha.

    Onyeisi ọhaneze ndị Igbo bụ George Obiozor, Mbazuruike Amaechi,Chukwuemeka Ezeife na ndị ọzọ akpokuola onyeisi ala Mohammadu Buhari ka ọ welata aka ike na ya bụ nsogbu, ọkachasị n'Imo steeti.

  15. Antonio Conte ọ na-ele Tottenham anya ka ndị owu na-asa?

    Antonio Conte

    Ebe foto si, PA Media

    N'egwuregwu, ụmụibe ọ dị ka mkparịta uka Tottenham Hotspur na Antonio Conte nwere maka ịnọchị anya onye nkuzi ha bụ Jose Mourinho akpụọla afọ n'ala.

    BBC Sport na-akọwa na nkwekọrịta a kpụrụ afọ n'ala maka na ego Tottenham wepụtere ịji goo ndị ọgbaboolụ ọhụrụ atụghị Conte n'anya.

    Nkwenye Conte gbadoro ukwu na ịzụta ndị ọkpa kara aka n'egwu bọọlụ ebe Totteham kwere n'ịzụta ụmụaka ka na-eto eto n'egwu bọọlụ na-adịghị oke ọnụ.

  16. Facebook ewetula mmachị Trump ruo afọ abụọ

    Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụmụibe ka na-ekwu ka ana ekwu, Facebook emeela mmachi ahụ ha machiri Onye bubu onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump afọ abụọ.

    Cheta na Facebook sị bụ na ya bụ mmachị ha machịrị Trump ga-abụ ebighị ebi site na ihe ha kpọrọ ndehie aka ọ dehiere maka ọgbaghara ndị otu ya mere na Capitol n'ọnwa Jenuwari.

  17. 'Ndị omeiwu eweghị ikike iji aka ha tinye ụgwọ ọnwa ha' - Ụlọikpe

    Ụlọomeiwu nta

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọikpe ukwu na Legọs enyela iwu ka ụlọọrụ Revenue Mobilisation, Allocation and Fiscal Commission kụdaa ụgwọọnwa ndị omeiwu dịka akụnaụba Naịjria si chọọ.

    Ikpe a nke Ọkaikpe ukwu Chuka Obiozor kpebiri na-akwọwa na ụlọomeiwu Naịjirịa enweghị ikike ikwu ego ole aga akwụ ha n'ụgwọọnwa.

  18. Ntuliaka nke ndị chọrọ ịzọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti ga-abụ n'ụbọchị 6 nke ọnwa Nọvemba

    ịtụ vootu

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ Inec ewepụtala usoro ha ga-eji mee ntuliaka Gọvanọ na steeti Anambra bụ nke ha sị ga-amalite n'ụbọchị isii ọnwa Nọvemba 2021.

    Festus Okoye bụ ọnụ na-ekwuru Inec kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ha kesara bụ ebe ọ nọ kwuo na pati niile ga-ezitere ha ndị nọchite anya ha malite n'ụbọchị iri nke ọnwa Juun ruo n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Julaị 2021.

  19. Ụmụibe unu asaala chi eeh! Ya dịrị nwoke mma, dịkwara nwaanyị mma taa bụ Afọ.

  20. Akụkọ Coronavirus n'Afrịka n'otu nkeji