Nnamdi Kanu: Akụkọ na Ipob gburu ndị Fulani 19 bụ akụkọ ụgha

Nnamdi Kanu na Gidado Sidikki

Ebe foto si, Getty/BBC

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Dịka onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu na-agọ na o nweghị onye Fulani ndị otu ya gburu n'Anambara steeti, otu Cattle Breeders Association a ma dịka Miyetti Allah ekwuola na e gburu ndị otu ha mmadụ iri abụọ n'Anambra steeti n'izu gara aga.

Onyeisi Miyetti Allah n'Ọwụwa Anyanwụ bụ Alhaji Gidado Sikkidi na-akpo oku ka gọọmentị Anambara steeti na ndị uweojii steeti ahụ chọpụta ndị mere mpụ ahụ ma kpụpụ ha ụlọikpe.

Mbeku ahụ na-abịa dịka otu jịkọrọ ndị Fulani na Naijiria bụ Miyetti Allah Kautal Socio-cultural Association ṅụrụ iyi na ha ga-abọ ọbọ ndị be ha e gburu n'Anambara steeti.

Sikkidi gwara BBC na aka ha adịghị na iyi ịbọ ọbọ ọbụla n'ihi na "Allah amatala na ndị ahụ e gburu ga-anwụ ụbọchị ahụ".

Mana o kwuru na-ezie na e gburu ndị otu ha mmadụ iri abụọ gụnyere ụmụnwoke atọ, ụmụnwaanyị asaa, ụmụaka na-egbe igbe atọ ebe ha bi n'Awkuzu n'Anambara steeti n'izu gara aga.

Sikkidi, onye kwuru na a wakporo ndị be ha n'ime ndeli, n'ebe Elekere Abụọ sị, "Ụfọdụ n'ime ha e ji egbe gbagbuo ha, ụfọdụ bụ mma ka e jiri gbuo ha."

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ọchiehi nọ n'obodo ahụ agbapụla ọsọ ndụ ebe ọzọ.

Akụkọ na Ipob gburu ndị Fulani 19 bụ akụkọ ụgha - Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Ipob

Mana onye ndụ otu nnwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu agọọla na aka na ụkwụ Ipob adịghị na ya bụ mpiti kwere n'Awkuzu na nsonso a.

Kanu eboro ụlọakụkọ 'Daily Trust ebubo' ịgbasa akụkọ ụgha na ndị otu Ipob gburu ndị Fulani iri na itoolu n'Anambara steeti.

N'ozi o wepụtara n'akara Twitter ya ụbọchị Tozde, Nnamdi Kanu kwuru na akụkọ ahụ nke Daily Trust wepụtara bụ iji tinye ọkụ ka e nwere gbuwe ndị Igbo bi n'Ugwu Awụsa.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ụlọntaakụkọ Daily Trust depụtara akụkọ ụbọchị Tọzde (29/4/2021) nke kwuru na ndị nwere agba gbara nkịtị dịka e gburu ndị Fulani ọchịehi 19 n'Anambra steeti n'abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Epreelu(24/4/2021).

Ha boro ebubo na ọ bụ ndị Ipob kpara ya bụ mkpamkpa nke ha sịrị mere n' Ukpomashi dị n' Awkuzu dị n'Okpuru Ọchịchị Oyi n'Anambara steeti bụ ebe ha sị na ndị ji egbe wakporo ezinaụlọ otu nwoke a kpọrọ Ibrahim Medium, gbuo ya, ụmụnwaanyị itoolu, ụmụaka isii na ụmụnwoke atọ.

Akụkọ Daily Trust

Ebe foto si, Daily Trust

Akụkọ Daily Trust

Cheta na izu gara aga BBC wetara akụkọ na ụmụakwụkwọ mahadum'Chukwuemeka Ojukwu University'dị n'Igbariam gbara ọsọ ndụ dịka ndị amaghị ndị ha bụtara ozu ndị Fulani ruru itoolu e gburu egbu dọsa n'azụ ụlọ ha.

Mahadum ahụ dị n'Igbarịam dị n'agbata obodo ahụ na Ukpomasi Awkuzu bụ ebe njinji ahụ jiri.

n'Okwu na ndị nwere agba gbara nkịtị kemgbe e gbuchara ndị Fulani na steeti ahụ, Gọọmentị Anambara steeti kwuru na ha na ndị ihe mere metụtara na-enwe mkparịtaụka etu a gaa-esi akpa udo.

Oge BBC kpọrọ ya, Komishona mgbasaozi na steeti ahụ bụ Don Adinuba n'ekwentị ọ sịrị na "o nweghị ihe m ga-ekwu ugbua. Gọọmenti na ndị ihe metụtara na-akpa ugbua, ọ bụ ha kpacha agwasie ụnụ ihe a kpatara."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: