Radio Biafra: Ipob erughị ndị anyị ga-asa okwu - NBC

Ebe foto si, AFP
Ọkaiwu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Alloy Ejimakor agwaala National Broadcasting Commission ka ha gwa Ipob ebe redio Biafra ndị a ha kwuru na ha kụchiri ebe ha chọtara ya na Legos.
N'okwu ya, "ha gwakwa anyị ma ọ bụ nke ndi 'Ọchị ehi' hibere ka a na-ebogide ndị Ipob."
Mgbe BBC Igbo gbara mbọ ka ha nụta n'ọnụ NBC maka ya bụ nkuchi ha kuchiri redio Biafra ụfọdụ na Lagos, ọnye ụlọọrụ ahụ kwuru si na Radio Biafra enweteghị ikike imepe ụlọọrụ redio ahụ.
O kwuru na ọ bụrụ na Radio Biafra chọrọ imepe ụlọọrụ na Naịjirịa ha bia nwete ikike.
CheỤlọọrụ National Broadcasting Commission akụchiela radio Biafra na-agbasa ozi na Lagos.
Ha kwuru na ndị nwe redio a na-agbasa ozi nwereike ịkpalite iwe na ọnụma n'obodo n'ịgbasa ozi ụgha.
Ụlọrụ ahụ depụtara nke a n'akwụkwọ ozi ha wepụtara n'akara twitter ha. kwuru na ha ji ohere a adọ ụmụ Naịjirịa aka na ntị ka ha gbanahụ isi n'azụ ulọ emepe redio makana aka iwu ga-akpara ha ma nara ha
ngwọrụ ha ji hibe ya bụ redio.
Ha kwuru ka ụlọọrụ Department for State Security nakwa ndị uweojii Naịjirịa chọpụta ma nwụchie ndị ọ bụ ha mepere redio a iwu akwadoghị.
Lekwa akwụkwọ ozi ahụ ha wepụtara
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, @nbcgov








