Lee otu ndị na-achọ Biafra

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-achọ ka ekewapụta mba a ga-akpọ Biafra site na Naịjirịa karịrị akarị.
Site na ndị dịka Indigenous People of Biafra (Ipob) na Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra (Massob) a ma ama nke ọma ruo na ndị dị ka Biafra Liberation Congress na anaghị ewuewu, otu kwuru na ha na-achọ Biafra dị ukwuu.
Ndị ọzọ gụnyere Biafran Revolutionary Organization, BRO, Eastern People Congress, EPC, Joint Revolutionary Council of Biafra, JRCB, Biafra Liberation Crusaders, BLC, and Salvation People of Biafra.
Ka a lụchara agha Naịjirịa na Biafra, ọtụtụ mmadụ enweghị aṅụrị maka etu Naịjirịa mere ndị e meriri n'agha, ọkachasi dịka ha nweburu okwukwe na Biafra ga-enwere onwe ha.
Afọ 51 gara ka ihe a mechara, mana ndị mmadụ ka tinyekwara uche n'atụmatụ a n'ihi ihe ha na-ahụta dịka 'mmegbu' n'aka gọọmenti etiti.

Lee otu ndị bu Biafra n'isi
1. MASSOB - Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra
Onye a ga-asi na ọ bụ ya bụ onye malitere nkata otu e ji achọ Biafra dara ụda ọfụma bụ Ralph Uwazulike bụ onye bidoro otu Massob.

Ebe foto si, AFP
Massob malitere mbọ ịchọ Bịafra mgbe Olusegun Obasanjo na-achị Naịjirịa dịka onyeisiala akwa agbada, nke Uwazuruike ji maka ya gaa mkpọrọ.
Mana otu ahụ kewara nke mere Uwazuruike jiri bido otu ọzọ a kpọrọ Biafra Independence Movement nke ọ bụ onye isi ha ugbua, ebe Uchenna Madu bụzị onye ndu MASSOB.
2. IPOB - Indigenous People of Biafra
Ipob bụ otu ọzọ na-agba mbọ maka nnwereonwe Bịafra nke onye bụbu onye nlekọta Radio Biafra bụ Maazi Nnamdi Kanu bụ onye ndu ha.
Ipob ṅụrụ iyi na ha agaghị ezu ike garue na gọọmenti etiti ekpebie okwu nnwereonwe Biafra site na ihiwe refarandum.

3. Biafra Zionist Movement
Otu 'Biafra Zionist Movement'(BZM) bụ otu ọzọ na-agba mbọ maka iweghachi Biafra dịka ọ dị tupu Naijiria enwee nnwereonwe.
Onyeisi otu a bụ Benjamin Onwuka, onye gọọmenti nwuchirila ugboro ugboro maka okwu gbasara Biafra.
Dịka otu onye kwuru na Twitter n'afọ gara aga, ọtụtụ chere na-ọka nọ na mkpọrọ ugbua ebe akụkọ na-ekwu na ọ nọghị ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị ọzọ:
Ọ bụghị sọsọ Uwazuruike, Nnamdị Kanu na Ben Onwuka bụ ndị nwere otu na-ekwu maka nnwereonwe Biafra, e nwekwara ndị ọzọ.
Ha bụ Felix Obioha nke Eastern Peoples Congress; Austin-Mary Ndukwu, Biafra Liberation Council; Osita Chukwuagbanarinam, Salvation People- Biafra; Jackson Nebechukwu, Ekwenche Organisation.
Ndị ozọ gụnyere; Adiele Chikadibia, Biafra Nations Youth League; Stanley C. Ajah, Biafra Revolution Organisation; Oliver Chidozie, Biafra Liberation Crusade; Ayers Shimobi, Biafra Movement for Sovereignty; Godwin Offor, Biafra Regional Emancipation Movement; Joseph Ohanenye, Bilie Organisation, Chukwuma Egemba nke Biafra in the Diaspora nakwa Ebuta Ogar, Biafra Nations Youth League (BNYL)Takon









