Nnamdi Kanu's seven count charge: Ebubo asaa ọhụrụ Gọọmentị Naijiria ji akpụpụ Nnamdi Kanu ụlọikpe

Ebe foto si, Ministry of Justice, Getty Images
Ụlọọrụ Ọkaiwu ukwu Naijiria ahazigharịala ebubo ha na-ebo onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu, onye a nwụchiri na Kenya n'ụbọchị 27 nke ọnwa Juun, afọ 2021.
N'abalị 21 nke ọnwa Oktoba afọ 2021, a na-ele anya na Gọọmentị etiti ga-akpụta Kanu ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ebubo ndị a ha hazigharịrị n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.
Nke a na-eme dịka ndị uweojii nzuzọ a kpọrọ DSS n'ịchafụ kwuru na ha emechala nchọpụta ha banyere nwa amadị ahụ.
Lee ebubo ọhụrụ ndị a boro ya dịka o si dị n'akwụkwọ ikpe kpụpụ ya ụlọikpe nke BBC Igbo nwetara :
Ebubo nke Mbụ
Na Nnamdi Kanu, onye Afaraukwu, Ibeku Umuahia nke Okpuruọchịchị Abia-North bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra nọrọ n'etiti 2021 na 2015 na London, mba Briten, gbasaa ozi site na Radio Biafra nke e gere n'Enugwu na ebe ndị ọzọ na Naijiria ma kọwapụta nkwado ya na ndị ọzọ na-achọ achọ ka steeti dị n'Ọwụwa Anyanwụ nakwa Ndịda-ndịda (South-South) nakwa nkwa Kogi na Benue kewapụ na Naijiria ma bụrụ mba Biafra nke bụ mpụ megidere akụkụ iwu 41c nke Naịjirịa afọ 2004.
Ebubo nke Abụọ

Ebe foto si, Federal Ministry of Justice
Na Nnamdi Kanu site n'ozi ọ gbasara na Radio Biafra n'abalị 28 nke ọnwa Eprelụ afọ 2015, nke e gere n'Enugwu na mpaghara ndị ọzọ dị na Naijiria kpọọ Onyeisiala Majọ Generalụ Muhammadu Buhari "onye na-emetọ ụmụaka"(paedophile)", onye na-eyi ndụ egwu (terrorist), "anụ ọhịa" (idiot), nke bụ okpotokpo asị ma bụrụ mpụ megidere akụkọ iwu 375 nke ala Naijiria.
Ebubo nke Atọ
Na Nnamdi Kanu n'ọnwa Maachị na Eprelụ afọ 2015 tụbatara na Naijiria ma dobe n'Ubulusiuzor dị n'Okpuru Ọchịchị Ihiala dị n'Anambara steeti, igwe mgbasaozi redio a kpọrọ "TRam 50L" nke o zoro na kọntena sị na ọ bụ ngwa e ji ebi ụlọ nke megidere akụkọ 47 iwu mpụ Naijria nke afọ 2004.
Ebubo nke Anọ

Ebe foto si, Federal Ministry of Justice
'Na gị bụ Nnamdi Kanu, kwuru na ịbụ onye otu 'Indigenous People of Biafra', otu a machiri amachi ma site n'otu a daa Akụkụ 16 nke iwu megidere iyi ndụ egwu nke afọ 2013."
Ebubo nke Ise
Na Nnamdi Kanu site n'ozi ọ gbasara na Radio Biafra n'abalị 22 nke ọnwa Eprelụ afọ 2021 nke e gere n'Enugwu na mpaghara ndị ọzọ dị na Naijiria kpalite ndị otu Indigenous People of Biafra, (Ipob) bụ otu a machiri amachi ka ha malite iyi ndụ egwu egwu site na ịchụwa ndị ọrụ nchekwa na ndị ezinaụlọ ha nke megidere Akụkụ nke Mbụ mpaghara Abụọ N'Iwu megidere iyi ndụ egwu nke afọ 2013.
Ebubo nke Isii

Ebe foto si, Federal Ministry of Justice
Na Nnamdi Kanu nọrọ n'abalị 16 nke ọnwa Mee afọ 2021 n'ịga n'ihu na ịda iwu megidere iyi ndụ egwu kwuru na mgbasaozi o mere site na Londo sị "N'izuụka abụọ, ihe ga-eme ga-ama ụwa jiji, ndị mmadụ ga-anwụ, ụwa gbaa gburu gburu ga-akwụrụ jụụ, kaa ihe a m kwuru n'aja." site na nke a daa Akụkụ Mbụ, mpaghara Abụọ n'Iwu megidere iyi ndụ egwu nke afọ 2013.
Ebubo nke Asaa
Na Nnamdi Kanu nọrọ n'abalị 31 nke ọnwa Mee, gaa n'ihu n'imebi iwu megidere iyi ndụ egwu site na ịgbasa ozi na onye ọbụla esonyeghị n'oku nọrọ n'ụlọ "dee akwụkwọ ike ekpe ya" nke mere na ụlọakụ, ụlọakwụkwọ, ahịa, ọdọahịa, ọdọ mmanụ ụgbọala emepeghị nke a na-enwe ngagharị ụgbọala nke megidere Akụkọ Mbụ, mpaghara Abụọ nke Iwu Megidere iyi ndụ egwu nke afọ 2013.













