Unknown gunmen attacks: Anyị na-eche na aka ndị Ipob dị n'ọnwụ ndị eze odinala abụọ na Njaba - Ndi uweojii Imo

Ndị uweojii na Eze Anayochukwu Durueburuo, obi nke Okwudor, na Eze Sampson Osunwa

Ebe foto si, Nigeria Police Force

Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ha na-enyo na aka ndị otu Ipob dị na mwakpo nakwa ogbugbu ndị Eze ọdịnala abụọ na Njaba, Imo steeti ụbọchị Tuzde.

Ndị bu egbe wakporo ebe ndị eze na-eme ọgbakọ ma gbagbuo Eze Anayochukwu Durueburuo, obi nke Okwudor, na Eze Sampson Osunwa nke Ihebinowere, ebe mgbọ tụrụ ma merụọ Eze A. N Onyeka nke Nkume 'Autonomous Community' ahụ.

N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojji na steeti ahụ bụ Michael Abattam binyere aka, ọ sịrị, na ọ bụ n'ọgbakọ onyeisi Okpuru ọchịchị Njaba kpọrọ ndị ezeọdịnala mpaghara ahụ ka ya bụ mbiti kwere.

"N'abalị 19 nke ọnwa Itoolu nke afọ 2021, n'ebe Elekere atọ nke ehihie, anyị nwetara ozi na ndị omekome a na-eche na ha bụ ndị otu Ipob/ESN a machiri amachi wakporo ebe onyeisi okpuru ọchịchị Njaba na ndị eze ọdịnala na-enwe nzukọ."

" Onyeisioche Okpuru Ọchịchị Njaba bụ Emeka Ihenacho kporo ndị eze ọdịnala nzukọ na agwaghị ndị uweojii maọbụ ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ."

Aha onyonyo, 'Ka anyị mebe ka Chukwu chọrọ ka anyị na-eme ka obodo anyị dị mma' - Bishop Godfrey Onah

"Ka nzukọ ahụ na-aga n'ihu, ndị omekome bu egbe a na-enyo na ha bụ ndị IPOB/ ESN bịara gbaa ha egbe tupu ha awụba ọhịa."

Abattam kwuru na komishona ndị uweojii na Imo steeti bụ Rabiu Hussaini zigara ndị ọrụ ya pụrụ iche ebe ahụ dịka o nwetara ozi ihe na-eme mana na ndị omekome ahụ tinyere isi n'ọhịa oge ha hụrụ ndị ọrụ nchekwa.

O kwekwara nkwa na ha ga-esi imi n'ala chọpụta ndị aka ha dị na mkpamkpa ahụ kpara.

Aha onyonyo, “Ndị mmadụ na-arịọ m ka zọọ ọkwa Gọvanọ Enugu Steeti” – Chiwetalu Agu

Cheta na nsonso a, ndị ekperima ndị uweojii na-arụ aka na ha bụ ndị Ipob wakporo ogige ndị uweojii na Njaba, gbgba ya ọkụ ma gbuo ndị uweojii abụo.

Ndị 'unknown gunmen' agbagbuola eze ọdịnala abụọ na Njaba, Imo steeti

Eze Anayochukwu Durueburuo, obi nke Okwudor, na Eze Sampson Osunwa

Ebe foto si, Onye achóghí ka a kpó aha ya

Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ndị bu egbe agbagbuola eze abụọ na Njaba dị n'Imo steeti.

Ndị ekperima wakporo ndị eze ọdịnala ruru 20 ebe ha na-enwe ọgbakọ ụbọchị Tuzde na Nnenasa dị n'Okpuru Ọchịchị Njaba ma gbagbuo abụọ n'ime ha, ebe ụfọdụ ndị ọzọ merụrụr ahụ.

Ndị eze e gburu bụ Eze Anayochukwu Durueburuo, obi nke Okwudor, na Eze Sampson Osunwa nke Ihebinowere 'autọnomous community'.

Onye ntaakụkọ anyị kwuru na ndị eze ndị ọzọ merụrụ ahụ n'isi na aka ha, dịka ebugarala ụfọdụ ha n'ụlọ ọgwụ dị nso.

Eze Anayochukwu Durueburuo

Ebe foto si, Others

Nkọwa foto, Eze Anayochukwu Durueburuo bụ obi nke Okwudor tupu ọ nwụọ n'ụbọchị 19 nke ọnwa Oktoba afọ 2021

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mike Abatam gwara onye ntaakụkọ anyị na e gburu eze ọdịnala abụọ n'ezie.

Akụkọ ka na-abịa

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: