Ọ fọrọ obere ihe ka m si ndị DSS kpọrọ gakwuru Nnamdi Kanu – Chiwetalu Agu
Dịka ndị ọrụ nchekwa tọhapụrụ Chiwetalu Agu bụ onye ejije Nollywood a ma ama, ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche taa bụ 15 Ọktoba ebe ọ kụwaara anyị akị oyibo Nsugbe gbasara ihe ọ gabigara na aka ndị ọrụ nchekwa n’izu gara aga.
O kwuru na bido mgbe ọ dị na nwata, na ọ bụ onye onyinye ya mere na mgbe o si njem site na Asaba na-aga Onitsha, ndị mmadụ gbakọrọ bịa izute ya dịka ọ bụ onye ama ama.
Ihe ọ na-eme oge anwụchiri ya?
Chiwetalu kwuru na ọ nwere obi ọmịkọ nye ndị ogbenye nọ n’etiti ndị gbakọtara izute ya, nke mere o ji bido kwewe achicha (bread) n’etiti okporo ụzọ Upper Iweaka nọ n’Onitsha.
Maazị Chiwetalu kwuru na achicha ọ zụtara ma kee ụbọchị ahụ ruru ọnụ ego puku iri.
N’okwu ya, o si na ya bụ mgbakọta mere ndị agha jiri bịa nwuchịe ya, o kwuru na mgbe ha bịara ịnwụchị ya, ọ jụrụ ha ihe ọ mere ma ha asagha ya.
Ha gara n’ịhụ dọrọ ya ma kpọbaa ya n’ime ụgbọala ha. O kwuru na ha dọkaturu akwa ya nke e sere ọwụwa anyanwụ.
"Ndị agha emetụghị m aka"
Mgbe BBC Igbo jụrụ ya maka kepu kepu kwuru na ndị agha tiri ya ihe ma merụọ ya ahụ mgbe ha bịara ịnwụchị ya, o kwuru na ya bụ akụkọ bụ akụkọ ugha mana na ihe mere bụ ha dọrọ ya na aka kpụba ya n’ime ụgbọala ha.
Maazị Chiwetalu gara n’ihu kwuo na ndị agha si n’Onitsha buru ya gaa ọdọ ndị agha nọ na Enugu Steeti bụ “82 Division” ma malite gbawa ya ajụjụ ọnụ nke gụnyere ihe mere o jiri nyiri akwa e sere ọwụwa anyanwụ na-ekesa achicha n’okporo ụzọ Onitsha.
O kwuru na ọ kọwara ndị agha atụmatụ ya nke bụ atụmatụ udo. Oge ha ahụghị ntụpọ ọ bụla n’aka ya, ha nyefere ya n’aka ngalaba ndị agha pụrụiche n’eme nnyocha bụ “Special Intelligence officers” na bekee.
"A gbara m ajụjụ ọnụ karịa elekere atọ"
O kwukwara na ndị ngalaba a gara n’ihu gbaa ya ajụjụ ọnụ ruo ihe kariri elekere itolu. O kwukwara na ha nyochara ime ekwe nti ya, ma jụọ ya ajụjụ banyere ihe niile ha hụrụ n’ime ya bụ ekwe nti.
Dịka ha mere nnyocha nke ha ma hapụ ịhụ ntụpọ ọbụla n’aka ya ha nyefere ya n’aka ngalaba ndị uweojii pụrụiche bụ ndị DSS n’aha ịchafụ.
Chiwetalu kwuru na ndị DSS buru ya n’ụgbọala ha n’isi ụtụtụ ụbọchị ahụ gawa isi ụlọọrụ ha nọ n‘Abuja.
Ihe ọ gabigara n'aka ndị DSS
Ọ kọwara BBC Igbo ihe ọ gabigara n’aka ndị DSS mgbe ha tinyere ya na nga pụrụiche, nke gụnyere na ha gbara ya ajụjụ ọnụ ma nyochakwa ekwe nti ya.
O kwukwara na ọ gwara ha maka ọrịa shuga ji ya nakwa maka ọya afọ ji ya nke mere na nri o na-eri jiri bụ nri pụrụiche.
Ọ bụ n'otu ụlọ ka ya na Nnamdị Kanu nọ
Maazị Chiwetalu kwukwara na ndị ọrụ DSS gwara ya na ebe edobere ya bụ n’okpuru ụlọ ebe edobere Maazị Nnamdi Kanu.
O kwuru na olileanya ya bụ ka ọ hụtụ Nnamdi Kanu ma nke a emeghi dịka enyeghi ya ohere ịhụ ya.
Ndi gbapụtara ya bụ ndị na-eme ejije ibe ya
Ọ kọwakwaara BBC Igbo na ndị ọgbọ ya n’eme ejije gbakọtara maka igbapụta ya nke gụnyere ọgbakọ ndị ejije a na-akpọ “Actors Guild of Nigeria”.
O kwuru na onyeisi ọgbakọ a bụ Emeka Rollas ziteere ya ndị enyemeka ndị gụnyere Maazị Steve Egbu, Mike Ozekhome, nakwa Monalisa Chinda.
O kwuru na dịka ndị ọrụ nchekwa hụrụ na aka ya dị ọcha nakwa ọ nweghi ihe ọjọọ ọ bụla ọ mere, ha gwara ya etu akparamagwa ọ kpara dịka onye a ma ama nwere ikike ikpalite ọgbaghara ma kwasa udo nọ ebe ahụ.
Ndụmọdụ o nyere ndị na-achị Naịjirịa
Na nchịkọta okwu ya, o kwuru na ọ bụ naanị udo ka o chọrọ nke bụ ndị mmadụ na arịọ ya ka ọ zọọ ọkwa gọvanọ Enugu Steetị, o kwuru na atụmatụ a dị mma mana ọ gaghị azọ ya bụ ọkwa dịka ụzọ ndị ndọrọndọrọ adighi mfe.
O kwukwara na dịka ọ bụ onye eziokwu, ọ banye ime ọrụ ndọrọndọrọ, ọ ga ekwu ka ndị ndọrọndọrọ kwụsị nrụrụaka, mpụ na aghụghọ, nke nwere ike ikpalite iwe ha ma mee ka ha chụpụ ya.
Ọ gara n’ihu kwuo na ọ ga edobe ya bụ akwa kpalitere ọgbaghara n’ime ụlọ pụrụiche nke bụ “National Archive” maọbụ na akụkụ pụrụiche n’ụlọ ya bụ “Personal Archive” ka ọ bụrụ ihe nkiri i ji cheta ihe ọ gabigara.
Ọ gaghịzị eyi uwe ahụ butere ya nsogbu ọzọ
O kwukwara na ọ ga-akwa akwa ọcha ọzọ nke a ga ese ọnwuwa anyawụ i jị gọsi na obi ya dị ọcha.
Maazị Chiwetalụ ji ndụmọdụ chịkọta okwu ya gwa ndị ọchịchị nke gụnyere onyeisiala Buhari ka ha soro ụzọ udo na nke mkparịtaụka n’ọchịchị ọha ma hapụ oke aka ike.
O kwukwara ka e hiwe ọgbakọ ndị okenye ga-anọchite anya akụkụ Naịjirịa niile ime ya bụ mkparịtaụka.
