Imo State Attacks: Etu anyị si gbuo ndị oji egbe eyiegwu isii na steeti ahụ- Uweojii

Imo State Police

Ebe foto si, Imo State Police

N'ebe elekere anọ nke mgbede ụnyaahụ ka akwụsịrị ndị oji egbe egbu nọ n'ụgbọala atọ na-abanye obodo Omuma dị n'okpuruọchịchị Oru East dị n'imo steeti.

Onyeisi ndị uweojii n'ogbe Omuma bụ ACP Benjamin Abang depụtere nke a n'akwụkwọ ozi o zitere ndị ntaakụkọ.

Abang kwuru na ya na ndị otu ya kwụsịnwụrụ ndị omekome ahụ dịka ha nwetechara ozi na ndị omekome ahụ na-abanye n'obodo Omuma.

Nke a mere ka ọ kpọkuo ndị otu ya ka ha banye ọrụ ozigbo ma wakpoo ha, gbuo ndị omekome ruru isii ma nwụchie mmadụ iri na otu, kpọrọ ha gawa ụlọọrụ ndị uweojii.

Abang kwuru na CSP Fatmann Dooiyor bụ "Divisional Police Officer" nwụrụ mgbe ndị uweojii na ndị omekome na-akwakọrịta mgbọ.

Imo State Police

Ebe foto si, Imo State Police

Nkọwa foto, Otu n'ime ụgbọala ndị ahụ ndị uweojii napụtara ndị omekome

Ndị uweojii mechara napụta ndị omekome ahụ ụgbọala atọ ha bụ bia ịwakpo obodo Omụma.

Ka ọ dị ugbua ndị otu uweojii nke ACP Evans E.Shem nọ n'isi ya na-agagharị n'akụkụ ọhịa dị n'ebe ihe a mere ka ha mara ma ha ka ga-anwụchị ndị omekome gbabara n'ime ọhịa.

Onyeisi ndị uwoejii nọ n'Imo steeti bụ CP Abutu Yaro adọọla aka na ntị ka ndị omekome gbara ọgwụ ha nwụọ maọbụ keta hei! n'aka ndị uweojii.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: