Nnamdi Kanu Trial: Anyị agaghị ahapụ MNK ka ọ taa ahụhụ dịka nwa enwe nne - Ohaneze Ndigbo

Otu ohaneze Ndigbo ekwuola na ha agaghị ahapụ Mazi Nnamdi Kanu ka ọ taa ahụhụ dịka nwa na-enweghị nne na nna.
Alex Ogbonnia bụ onụ na-ekwuru ndị Ohaneze kwuru nkea na mkparịtaụka ya ndị ntaakụkọ Punch nwere n'ụbọchị Fraịde.
Okwu a na-abịa dịka eze ọdịnala a ma ama n'ala Yoruba bụ Oba Enitan Ogunwusi (Ooni of Ife) hibere kọmiti ga-aga kwuchitere nwanne ha nwoke bụ Sunday Igboho, onye nọ na mkpọrọ na mba Bene Rịpọblik.
Maazị Igboho bụ onye isi otu na-achọ nnwereonwe ala Yoruba dịka Nnamdi Kanu si achọ nnwereonwe Biafra.
Ogbonnia kwuru na ndị okenye alaigbo na-enwe nzukọ kwa mgbe kwa mgbe n'ihi Nnamdi Kanu.

Ebe foto si, Alex Ogbonnia
O kwuru sị: "Ọ bụghị ihe niile ka anyị ga na-agwa ndị ntaakụkọ. Anyị na-enwe nzụkọ oge ọbụla n'ihi Mazị Kanu."
"Ọ bụ na nzụkọ ka anyị nọrọ gwa Enyinnaya Abaribe ka ọ kwụrụ dịka onyeakaebe Kanu oge a chọrọ onye ga-ana ya n'akebe."
"Ohaneze nyekwara ya ndị ọkaiwu ga-anọchite anya ya n'oge ahụ."
"Achọghị m ka onye ọbụla katọọ ndị Igbo n'ihi Nnamdi Kanu. Anyị agbachighị nkịtị.
"Kanu abụghị nwa enwe nne enwe nna. Anyịa ahapụghị ya ka ọ kwụrụ naanị ya.
"Anyị na-enwe ọgbakọ ugborougboro iji mara ihe niile anyị nwere ike ime iji nyere ya aka."
Cheta na gọọmentị Naịjirịa na-ebo Kanu ebubo imegide Naịjirịa (treason) nakwa iyi ndụ egwu (terrorism).
A malitere ikpe ya ikpe n'afọ 2016, mana ọ gbara ọsọ pụọ na Naịjirịa n'afọ 2017 oge ndị agha Naịjirịa wakporo ụlọ ya.
A nwuchiri Kanu ọzọ na mba Kenya ma kpụlata ya Naịjirịa n'ọnwa Jun afọ a.
Ọ nọzi n'aka ndị DSS ugbua dịka a ga-akpụpụkwa ya ụlọikpe n'ụbọchị 26 nke ọnwa Julaị.














