Southeast attacks: 'Anyị anwụchiela ndị ESN gburu onye otu anyị ma nara ya egbe n'Imo' - Ndị Uweojii

Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela mmadụ ise ha na-eche na aka ha dị n'ogbugbu onye uweojii aha ya bụ Joseph Nwaka.
Ha sị na ha natakwara ha egbe akpụrakpụ na mgbọ ha ji akpa mkpamkpa a.
A nwuchiri otu n'ime ndị a aha ya bụ Onyekachi Mmadufo n'abalị iri na atọ nke ọnwa Mee.
Ha kwuru na ya bụ nwa amadị a sara asịsa na ya so na ndị otu Ipob/ESN bụ ndị gọọmentị Naịjiria machiri dịka ndị omekatara ihe pụọ ụjọọ.
A na-ebo Mmadufo ebubo ịgbakọ aka ọnụ were wakpo ndị uweojii na steeti ahụ mgbe gara aga.
A napụtara Mmadufo egbe AK47 akara ya bụ 56-258115 na mgbọegbe iri na ise.
N'asịsa ya, Mmadufo kwetere na aka ha dị mwakpo ndị uweojii dịka ndị uweojii dere n'akwụkwọ ha zigaara ndị ntaakụkọ.
N'otu aka ahụ, ndị uweojii Imo steeti sị kwa na e jidere mmadụ ise ndị ọzọ n'Amanato dị n'Okpuruọchịchị Isu n'abali iri na anọ nke ọnwa Mee.
Ha sị na ya na ndị isiekwe ọnwụ a kwakọrịtara mgbo tupu ha ejide ndi a.
Ha sịkwa na ha jider egbe anọ na mgbe isii n;aka ndị a,
Ha sị na nnyoch ka na-aga n'ihu gbasara ndị otu a nakwa ọrụaka ha.
Chete na ndị omekome amaghị ndị ha bụ na-ebuso gọọmentị Imi steeti agha ihe karịrị otu ọnwa ugbua.









