Orlu Imo State: Kedụ ihe na-eme n'Orlu ugbua?

N'agbanyeghi kepukepu na-efegharị na soshal midia gbasara Orlu, ndị bi ebe ahụ na-ekwu na ha anụbeghị maọbụ hụ ihe ọbụla.
Onyonyo na-agbasa na Twitter nke na-egosi ebe ụgbọelu helịkọpta na-efegharị; ọtụtụ na-ekwu na ụgbọelu ahụ na-akwa mgbọ.
Odz Chioma onye bi na Orlu gwara BBC Igbo na enweghi ihe ọbụla gbara gharịị na-eme.
O kwuru na ndị agha ka nọ ebe niile mana o nweghi onye ha na-enye nsogbu.
Onye ọzọkwa kwuru na mpaghara Orlu ebe o bi enweghị nsogbu ọbụla.
Onye a na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ụgbọelu Hhelịkọpta na-efegharị, ndị agha nọkwa n'ụzọ mana ha anụbeghị ụdaegbe ọbụla.
Rochas Okorocha agaala Orlu sị ha ka 'Ọzọemena!'

Ebe foto si, Sam Onwuemeodo
Aka chịburu Imo steeti na onye bụ Sinetọ Imo West bụ Rochas Okorocha, onye nnọchiteanya ndị Orlu Imo State gara ebe ahụ, ka ọgbaghara dapụtara na ya biri.
Ọ gwara ndị isi obodo na ndị bi n'Orlu ka ha jikọọ aka hụ na ọgbaghara dapụtara n'Orlu nke tara isi ọtụtụ mmadụ ma mebiekwa akụnaụba ndị mmadụ ghara ime ọzọ.
O kwuru nke a mgbe ọ gara njem nleta nakwa iti aka n'obi na nke Eze Boniface Okereke so na ndị ihe metụtara.
O hibere kọmiti mmadụ asaa ga-elebanye anya n'ọdịmma ndị ihe a metụtara ma nyekwa ha enyemaka ego na ihe ndị ọzọ ha chọrọ.

Ebe foto si, Sam Onwuemeodo
O nyekwara ụmụaka niile nne maọbụ nna ha nwụrụ n'ọgbaghara ahụ onyinye agụmakwụkwọ n'efu.
Ndị ọzọ ọ letakwara bụ ndị si mba Naịja nakwa ezinaụlọ ndị ọzọ ihe a metụtara.
N'ọnụ ya "Obi gbawara m mgbe nụrụ maka ihe mere ebe ụfọdụ ndị mmadụ gụnyere ndị nche tufuru ndụ ha, Ọ bụ ihe ọjọọ mere n'Orlu nke m katọrọ kpam kpam"
Nnamdi Kanu gwara ndị ESN wụsa ọwa n'Orlu

Nnamdi Kanu bụ onyendu ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ ndị na-achọ nnwereonwe Biafra nakwa otu
Eastern Security Network (ESN), agwala ha wụsa ọwa n'Orlu.
Nke a na-abịa dịka o kwuru na ọ nụrụ na a gwala ndị agha na ndị uweojii e zigara obodo ahụ mgbe ọgbaghara dapụtara si ebe ahụ pụta.
Kanu gara n'ihu kwuo na ESN laghachị n'ịgbado anya n'ịhe gbasara nsogbu ndị ọchị ehi n'obodo ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Akụnaụba obodo a adaala kemgbe ihe mere n'Orlu - Eze Amaifeke
Kedụ ọnọdụ Orlu nọ n'ime ya ugbua kemgbe ndị agha na ndị a na-eche na ha bụ ndị Eastern Security Network (ESN) kwatachara?
BBC garuru obodo ahụ iji anya ha hụ ka ihe dị ugbua.
Eze dkt. E.C. Okeke gwara BBC Igbo na ndị mmadụ anaghị agagharịcha etu ha si emebu mbụ.
Ka o si gaa n'Orlu n'ụbọchị nke atọ

Taa bụ ụbọchị Tọzde ga-eme ya alabị atọ kemgbe amachiri ngagharị ma nọchie ụzọ e si abanye obodo Orlu.
Onye ntaakụkọ BBC ka nọkwa ebe ahụ ahụta ka o si aga nakwa etu ndị mmadụ nọ ebe ahụ si ebi.
Ọ gwakwara Igwe obodo ahụ okwu ịchọpụta ihe mere. Lee ya ebe a:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
BBC Igbo chọpụtara na ọpụpụ na mbata n'obodo Orlu adịghịzị mfe.
O kwuru na ndị agha na ndị uweojii nọchiri ebe niile iji kwụsị ndị mmadụ ọpụpụ na mbata.
Ihe ọzọ bụ na mmachi ngagharị nke gọọmentị steeti ahụ ka dị mana o nweghi onye ma mgbe ọ ga-ebi.
O kwukwara na rue ụbọchị taa, ụda egbe ka na-ada n'obodo ahụ
Ụjọ ka ji ndị mmadụ ịpụta mbara
Orlu tọgbọọ chakọọ tata dịka ndị mmadụ n'eze isi onwe ha.
Nsogbu ahụ dapụtara n'etiti ndị ọrụ agha na ndị Ipob n'Orlu, Imo steeti ka na-agakwa n'ihu ugbua.
BBC chọpụtara na okporo ụzọ nakwa obodo dị iche iche n'Orlu dịka Amaifeke, Okporo na Banana junction dịka ebe agbara ọsọ n'ọdụ ahịa, ụlọ akwụkwọ na ụlọ ọrụ niile gbachiri agbachi.
Lee mmadụ ole nwụrụ n'ọgbaghara dapụtara n'Orlu ụnyahụ

Ebe foto si, UGC/Other
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu ekwuola na ụfọdụ mmadụ pụtara ụnyahụ bụ Jenụwarị 26,2021 wakpoo ogige ndị Hausa bi n'Orlu ma gbuo ndị agha anọ.
O kwuru na nke a mere ka ndị agha wuchie ebe ahụ .
Ọ gara n'ihu kwuo na ya ejichaghị akụkọ zuruoke gbasara ya bụ mkpa mkpa kpara n'Orlu ụnyahụ.
O kwuru na ka ihe si kwụrụ n'ụtụtụ a, udo alaghachitela ebe ahụ dịka ụfọdụ ndị otu ya nọ ebe ahụ ugbua.
Orlando kwuru na mmachị ngagharị ka dị n'Orlu ugbua.

Anyị ka na-ege ntị ịnụta n'ọnụ ya gbasara ọdachị a.
Lee ihe Nnamdi Kanu kwuru maka ihe na-eme n'Orlu

Ebe foto si, Getty Images/UGC/Other
Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu etinyela ọnụ n'okwu gbasara ihe na-eme n'Orlu ma kwuo na "Orlu agaghị abụ Obigbo ọzọ".
O ji Obigbo nke dị na Rivas steeti ebe echeere na ndị agha gburu ndị mmadụ n'ụzọ ezighi ezi were amaatụ n'ihe na-eme n'Orlu.
O kwukwara na ọ ga-aga n'ihu ị me ihe ọ na-eme rue mgbe akpọrọ ya oku na "Hague".
Hague bụ ebe ụlọikpe kachasị na-ekpe ndị omekome n'ụwa niile ikpe nọ, ọ dị na mba Netherlands.
"Nwụchie nu ndị aka ha dị n'ọgbaghara a" - Hope Uzodimma

Ebe foto si, UGC/Other
Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma etinyela mmachị ngagharị n'obodo Orlu dịka ọgbaghara dapụtara n'ebe ahụ.
Amabeghi mgbe mmachi a ga-ebi mana o ga-esi n'abalị rue n'ụtụtụ.
Uzodinma n'ozi ziputere kwukwara na obi adịghị ya mma maka ogbugbu na ọgbaghara ahụ dapụtara.
O zikwara ndị ọrụ nchekwa ozi ka ha nyoo anya n'ala chọpụta ndị aka ha dị n'ogbugbu a.
Ebe ndị mmachi a metụtara bụ
Ihe anyị ma maka ihe na-eme n'Orlu

Ebe foto si, Abs Radio/Tv
Akụkọ na-efegharị na-ekwu na ndị nọ n'Orlu agbaala ọsọ ndụ dịka otu amaghị ndị ha bụ na ndị echere na ha bụ ndị agha Naịjirịa na-akwa mgbọ.
Otu onye nọ ebe ihe mere aha ya bụ Chimezie kwuru na ọ gbapụrụ na be ya gbalaga obodo ọzọ dị nso n'ebe ahụ.
O kwuru sị "ụzọ abụọ banyere n'ime ogbe ebe m bi bụ ndị agha nọchiri ya, ha hiri nne ju ebe niile"
Onye ọzọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ bụ Precious kọwara ihe anya ya hụrụ n'ụzọ Orlu taa.
O kwuru na ọ nọ n'ụzọ a ga Orlu mgbe mmadụ ụgbọala anọ bụ ndị mmadụ na-agbali egbe elu zutere ha n'ụzọ.
O kọwara na mmadụ niile nọ n'ụzọ ahụ gbahapụrụ ụgbọala ha mgbe ha hụrụ ihe na-eme.
Precious kwukwara na ọ maghị otu bụ otu ahụ na-agbli egbe elu.
Mgbe BBC kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu, o kwuru na ọ nọ na nzụkọ ma sị anyị kpọghachi ya.
Kedụ etu ọgbaghara a si bido?

Ebe foto si, TWITTER/HQNIGERIANARMY
Otụ onye na-achoghi ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na oruola izu ụka abụọ ọ bidoro ịhụ ụmụ okorobịa bu ngwa ọgụ na anọkari n'ime ụgbọala na-agbali egbe elu ka ha na-agbafe n'orlu.
Ọ kwuru na ndi a na-eyikari uwe ojii na okpu na-achaa mmemmé.
Ha nwere-ike ịbụ ụgbọala Sienna, hilux maọbụ jeep.
Ọ kwuru na ndị a anaghị achọ ndị obodo okwu kama ha na-awakpo onye ọrụ nchekwa Obula ha hụrụ n'ụzọ.
Ọ kwukwara na egbe nke a gbara taa na ha gbara ya gbatee ya aka.
Ọ kwuru na enweghị onye ma ndi ha bụ.
Ọ kwuru na ụbọchị olee gara aga ka ndị agha gara obodo ụmụtanze bụ ebe ndị a si aputa, were nwuchie ma gbuo kwa ụfọdụ ụmụ okorobịa ha jidere.
Kama ọ kwuru na ọ bụghị ndị a ka ndị agha ahụ jidere.
Ọ kọwara na ndị agha gbara keke ụfọdụ ndị mmadụ ọkụ dika ndi agha na-ekwu na egburu otu onye otu ha n'obodo ahụ.
Onye akaebe a kwuru na ndị nọ n'obodo Umutanze agbaala ọsọ ndụ ha. Ma sikwa na ya bụ ogbaaghara na ha abanyela obodo ndị ọzọ.












