Rochas Okorocha: 'Ọ bụ sọ ọgọ m Uche Nwosu ga-emeri ntụlịaka gọvanọ n'ọkwa APC'
Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ
Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ọ bụ sọ ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu ga-emeri ntụlịaka gọvanọ n'ọkwa APC.
O kwuru nke a dịka otu ụlọịkpe n'Abuja mapụrụ ikpe dị n'etịtị Uche Nwosu na Hope Uzodinma bụ ndị abụọ meriri ntụlịka imeụlọ n'Imo iji zọọ ọkwa gọvanọ n'okpuru APC.

Ebe foto si, INEC official Facebook page
Victor Umeh bụ sinetọ nọchitere anya Anambra Central agwaala onyeisiala bụ Muhammdu Buhari ya gbaa mbọ tinye aha onye Igbo si n'ọwụwa anyanwụ n'ime aha ndị ewpụtara maka ndị ga-eso na National Defence Council nakwa National Security council iji gosi nhatanha.

Ebe foto si, Reuters
Mba Amerịka akagbuola akwụkwọ ikike ịbata ala ha nke ha nyere mmadụ iri abụọ n'otu bụ ndị mba Saudi Arabia echere na aka ha dị n'ogbugbu Jahmal Khasoggi
Onyeisiala ahụ bụ Donald Trump kwukwara na mkpuchi ọnwụ Khasoggi bụ nke kachasị njọ kemgbe oge bidoro.

Ebe foto si, Getty Images
Onye nkuzi otu Manchester United bụ Jose Mourinho ekwuola na otu Juventus abụghị ọgbọ ndị Manchester United n'ihe gbasara egwuregwu.
O kwuru nke a mgbe Juventus ji otu ọkpụ merie Man U mgbe ha zutere na Old Trafford.
Akụkọ dị mkpa taa

Ebe foto si, Kingsley Dozie
Ndị ntoroọbịa Ohanaeze Ndigbo akpọkuola ụmụ nne ha ndị IPOB ka ha bịa ka e mee udo maka ọdị mma ndị Igbo na mwulite mpaghara ọwụwanyanwụ.
Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisi ha bụ KingsKingsley Dozie kwuru na ọ ga-aghọ ndị Igbo ahịa ma ọ bụrụ na ha e sonyeghi na ntuliaka afọ 2019.
Ọgbaghara Zamfara Steeti

Ebe foto si, AFP
E gbuola ọtụtụ ndị mmadụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ n'ime ọgbaghara dapụtara n'etiti obodo Lafiya na Boshikiri nke Adamawa Steeti.
Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ bụ Abubakar Othman kwuru na ọ nụghị maka onye ọbụla e gburu kama ndị merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ ugbua.
N'ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Ndị a na-amaghị ndị ha bụ zigara ozi ogbunigwe n'ụlọ onye bụbu onyeisiala mba Amerịka bụ Barack Obama nakwa onye bụbu odeakwụkwọ mba ahụ bụ Hillary Clinton.
Ndị ọrụ nchekwa Secret Service kwuru na ha gbochiri ozi ndị a n'ụzọ tupu o rue ebe e zigara ha.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
N'abalịa Barcelona na Intermilan ga-achịpụ ya n'asọmpi Uefa Champịọns, ebe Dortmund na Atletico Madrid ga-ezute ibe ha.
Liverpool, Tottenham, Monaco, Napoli, FC Porto, na ndị ọzọ ga-anọkwa n'egwu.
Nkeji abalịa
Ihe nkiri nke abalịa
Gee Nkeji nke ụtụtụ












