Gọvanọ Hope Uzodịnma ọ chụrụ onyeisi 'Imo state University' n'ọrụ?

Ụzọ Mahadum Imo steeti

Ebe foto si, Adaobi Obasi/Facebook

Kepukepu na-ekwu na a chụọla onyeisi mahadum nke Imo steeti bụ Ọkankuzi Adaobi Obasi n'ọrụ.

Mana ozi ahụ ọ bụ eziokwu?

ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Mahadum bụ Ralph Njokuobi kwuru sị na ọ bụ eziokwu na-akwụsịrị Obasi n'ọrụ kama na ọ bụ n'ọnwa oktoba nke afọ 2021 ka ekwesịrị ịkwụsị ya n'ọrụ.

Njokuobi gara n'ihu kwuo, " Dịka anyị siri nụ, ọ bụ n'ọnwa oktoba nke afọ 2021 ka ọ kwesịrị imezu afọ ise ya dịka onyeisi mahadum".

Ọ kọwara na ọ bụ ndị Executive Council mechara ọgbakọ ka ha pụtara gwa ndị ntaakụkọ na ha ekpebiela na ọ bụ n'ụbọchi iri atọ na otu nke ọnwa Disemba afọ 2020 ka ọ ga-akwụsi ọrụ dịka onyeisi mahadum.

N'aka nke ọzọ, Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasaozi nke Imo steeti bụ Declan Emelumba Uzodinma kwuru sị, " E nweghị onye hụrụ onyeisi mahadum Imo steeti n'ọrụ kama oge o kwesịrị ịnọ n'oche dịka onyeisi mahadum agwụla."

Adaobi Obasi

Ebe foto si, Adaobi Obasi/Facebook

Nkọwa foto, Ọkankuzi Adaobi Obasi

Kama kọmịshọna Emelumba kọwara na Obasị rụburu ọrụ dịka onye na-anọchịte onyeisi Mahadum nke IMo steeti otu afọ tupu e mee ya onyeisi ya bụ mahadum n'ụjụ ya.

O kwuru sị " dịka ọrụ gọọmentị siri dị, ọrụọla ọrụ afọ ise dịka onyeisi mahadum ahụ".

Ọ kọwara na agbakọọ otu afọ ọ nọro dịka onye nnọchite onyeisi mahadum ahụ na afọ anọ ọ chịrịla dịka onyeisi ga-eme ya afọ ise ọ kwesịrị ịnọ.

Kedụ maka kepukepu na Gọvanọ Uzodinma chụrụ Adaobi Obasị n'ọrụ maka na ọ bụ nwanne Rochas Okorocha?

Kepụkepụ na-eso akụkọ a bụ na Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma chụrụ Adaobi Obasị n'ọrụ maka na e nwere etu ya na Rochas Okorocha bụ onye chịbụrụ Imo steeti si bụrụ nwanne.

Emelumba zara sị " Ọ bụrụ na Obasị bụ nwanne Rochas Okorocha, anyị amaghị. Nke a bụ mbụ gọọmentị na-anụ maka nke a".

Ọ jụkwara sị, "gọọmentị a agbaala otu afọ, gịnị mere na e wepụbeghị ya kemgbe ma ọ bụrụ etu ahụ?"

O kwuru sị, " ma ọ bụ nwanne Rochas Okorocha, ọ gbasaghị gọọmentị, Anyị nabatara ya dịka onyeisi Mahadum, ọ rụo ọrụ, oge ọrụ ya ebiela".

Ahọpụtala onye ọzọ ga-anọchị ya?

Kọmịshọna mgbasa ozi Imo steeti bụ Declan Uzodinma kwuru na a họpụtabeghị onye ga-anọchị Obasi n'ọrụ.

Ọ kọwara na ọ ka nwere izuụka abụọ ịrụ ya bụ ọrụ.

Mbọ BBC Igbo gbara inweta uche Ọkankuzi Adaobi Obasi amịtaghị mkpuru dịka a kpọrọ ya n'ekwenti mana ọ zaghị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: