Gọọmentị ga-akwado ezinụlọ onye ndị uweojii gbagburu n'Igboukwu - Willie Obiano

Ebe foto si, Anambra State Govt
Gọọmentị Anambara steeti ekwela nkwa ịkwado ezinụlọ Ebere Nwogba, bụ onye ahụ ndị uweojii gbagburu n'Igboukwu n'abalị Tuesday.
Gọvanọ Willie Obiano kwere nkwa a n'ụbọchị Tọzde oge ndị ntaakụkọ steeti ahụ gbara ya ajụjụọnụ.
O kwuru na gọọmentị ga-enye ezinụlọ Nwogba nkasị obi niile dị ha mkpa dịka ego nakwa enyemaka ndị ọzọ.
Obiano katọrọ ya bụ ihe merenụ ma kwuo na aka akparala onyeuweojii kpara arụ ahụ.
Kama ọ gakwara n'ihu katọọ ndị ntorobịa gbara ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ.
O kwuru sị: "Ịgba ụlọ ndị uweojii nakwa ụgbọala dị icheiche ọkụ, agaghị eme ka ihe niile dajụọ"
Obodo Igboukwu, Ekwulobia nakwa Oko nke dị n'Anambara steeti nọ n'ọgbaaghara n'ụbọchị Wenezde a n'ihi ebubo aka ike ndị uweojii.
Ndị ntorobịa e jirila iwe gbaa ụlọọrụ ndị uweojii atọ ọkụ n'obodo ndị a n'ihi ogbugbu otu onye ọkada.
Otu onye Igboukwu hụrụ ihe niile merenụ kọọrọ BBC Igbo na ọ bụ ogbugbu ndị uweojii gburu otu onye okada kpatara ngagharịiwe ahụ.

Nwoke achọghị ka ekwuo aha ya kwuru sị: "Ya bụ ihe malitere n'abalị ụbọchị Tuzde oge ndị uweojii nwuchiri otu onye ọgbatumtum"
"Ha kwuru na iwu obodo machiri mmadụ ịgba ọgbatumtum ma elekere itoolu nke abalị kụchaa."
"Mana oge ha kpụ nwoke ahụ aga, ha zutekwara onye ọkada ọzọ mana onye nke ahụ ekweghị ahapụrụ ha ọgbatumtum ya."
"Oge ha na onye ahụ na-agbarị, onye nke mbụ ha jidere buuru ọgbatumtum ya gbalaga."

Nwoke ahụ gara n'ihu kwuo na dịka ndị uweojii na onye ọkada ahụ na-ekwu okwu, ndị mmadụ malitere ịgbakọ nke mere ndị uweojii ji malite ịgba egbe iji chụsaa ndị mmadụ.
Mgbọ tụrụ onye ọkada ahụ - aha ya bụ Ebere Nwogba- n'afọ, mana ndị uweojii hapụrụ ya ebe ahụ, buru ọgbatumtum ya n'ụgbọala ha gbalaga.
Ọ bụ mgbe chi foro ka ndị mmadụ hụrụ ozu onye ọkada ahụ, nke mere ha ji malite ngagharịiwe.
Ụfọdụ akụkọ kwuru na nwunye nwokorobịa ahụ ndị uweojii gbagburu, ka mụrụ nwa ọhụrụ n'ọnwa abụọ gara aga.
Nwaokorobịa na-akwadokwa olili nna ya onye nke nwụrụ n'ọdị nso a.
Dịka nwoke ahụ sị kwụọ, ndị ntorobịa ji iwe gbaa ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Igboukwu ọkụ.
Ha mekwara ngagharịiwe gaa Ekwulobia, ebe ndị uweojii malitekwara ịgbali egbe elu.

Ebe foto si, Others
Egbe ahụ tụkwara mmadụ abụọ ọzọ, nke mere ndị ntorobịa ji gbaa ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ekwulobia nakwa nke dị n'Oko ọkụ.
Ihe ndị uweojii kwuru

Ebe foto si, Facebook/Anambra State Police Command
Onyeisi ndị uweojii Anambara steeti bụị John Abang kwuru na ha anwuchiela ndị uweojii aka ha dị n'ọnwụ nwaamadi ahụ bụ Ebere Nwogba.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Mohammed kwuru na ya bụ ihe dị nnukwu mwute.
Mohammed kwukwara na nnyocha miri emi amalitela maka ihe a merenụ, ma kwe nkwa na eziokwu ga-apụta ihe n'oge adịghị anya.











