Kankara Kidnap: Ihe niile anyị ma maka ntọrọ ụmụakwụkwọ na Katsina steeti

Ụlọakwụkwọ Kankara

Ebe foto si, Gali Kankara

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ka chi na-efo kwa ụbọchị ka ihe ọhụrụ na-apụta banyere ihe karịrị ụmụakwụkwọ narị atọ a tọọrọ n'ụlọakwụkwọ ha dị na Kankara, Katsina steeti.

Ọ bụ n'ụbọchị Satọde ka akụkọ pụtara na ndị amaghị ndị ha bụ wakporo ma tọrọ ihe ruru ụmụakwụkwọ 500 bi na Government Secondary School(GSS) Kankara.

N'ihi nke ahụ, Gọvanọ steeti ahụ bụ Bello Masari nyere iwu ka a kpọchie ụlọakwụkwọ obibi niile dị na steeti ahụ.

N'ụbọchị Monde kwa, akụkọ pụtara na gọọmentị na ndị ahụ amalitela mkparịtaụka maka ntọghapụ ụmụakwụkwọ ahụ.

Lee ihe niile merela kemgbe ahụ:

Boko Haram ekwerela na ọ bụ ha kpara ya bụ mkpamkpa

Abubakar Shekau

Ebe foto si, AFP

Ụfọdụ na-eche na ọ bụ ndị ekperima mmadụ amaghị ndị ha bụ kpara ya bụ arụ ebe ụfọdụ na-ekwu na ọ ga-abụ otu ndị na-eyi ndụ egwu nke a kpọrọ Boko Haram mere nke a.

Mana ugbua, ndị Boko Haram ekwuola n'ezie na ọ bụ ha kpara ya bụ mkpamkpa.

Onyeisi ha bụ Abubakar Shekau kwuru nke a site n'ozi o zipụtara n'isi ụtụtụ Tuzde.

Shekau kwuru na ihe kpatara ha ji tọrọ ụmụakwụkwọ ahụ bụ iji kwụsị agụmakwụkwBekee bụ nke ha kwuru na ọ bụ ihe arụ n'okpukperechi Alakụba.

Ndị agha Naijiría agbaala ogige ndị tọọrọ ụmụakwụkwọ na Katsina steeti okirikiri

GSS Kankara

Ebe foto si, Gail Kankara

Akụkọ na-ekwu na ndị agha Naijirịa gbaala ogige ebe e chere ndị tọọrọ ụmụakwụkwọ na Katsina steeti gburugburu.

A mabeghị ụmụakwụkwọ ole ndị a tọọrọ kama n'ime ụmụ akwụkwọ narị asatọ na-agụ akwụkwọ n'ụlo akwụkwọ ahụ, a maghị ebe ihe dịka ọkara n'ime ha nọ ugbua.

Otu onye na-arụrụ onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ọrụ kwuru na a na-atụanya na ọ bụ ego ka ndị ntọ a na-achọ.

Gọọmentị Naijirịa kwuru na ọ bụ ndị omekome bụ ndị na-akpa mkpamkpa a.

Ihe ndị nwere agba na-ekwu gbasara ya bụ ọdachi mere

Ndị mmadụ dịka Oby Ezekwesili na ndị ọzọ tinyere ọnụ n'ihe mere.

Ezekwesili kwuru n'akara Twitter ya na gịnị ka onyeisiala Muhammadu Buhari na-eme ebe nne na nna ụmụakwụkwọ ahụ na-akwa akwa.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Otu kpọrọ onwe ha 'Bring Back Our Girls' kwukwara na otu ihe di ire bụ na o nwebeghi ihe gọọmentị Naịjirịa mụtara n'ihe mere na Chibok, Dapchi na ugbua Kankara.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Onye zọburu ọkwa onyeisiala na Naịjirịa bụ Atiku Abubakar zigaara ezinaụlọ ndị ahụ ozi itiakanobi ma gwa ha ka ha nwee ntụkwasiobi na ndị ọrụ nchekwa ka akpọpụta ụmụ ha.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ihe ọzọ mere

Cheta na ndị otu Ugwu dị icheiche a kpọrọ 'Coalition of Northern Groups' (CNG)hibere nzụkọ gbasara ọnọdụ nchekwa n'ụbọchị Monde.

Ebe akwasasịrị

Ebe foto si, CNG

Mana ọgbakọ ha enweghi isi dịka ndị omekome a batara ogige nzụkọ ndị Arewa n'ihe dịka Elekere iri na otu nke ụtụtụ were chụpụ ndị ntoroọbịa ahụ na-eme nzụkọ.

Ha napụkwara ọtụtụ ndị a bịara nzụkọ a ekwentị ha.

Nzụkọ a bụ maka atụmatụ ha kpọro,"Arewa Security Review".

Onyeisioche CNG bụ Balarabe Rufai kwuru sị, " Anyị kwenyere na ọ bụ ndị mmadu zitere ndị omekome a, obi adịghi anyị mma chaa chaa"