International Slavery Abolition Day: Lee ihe omimi dị n'Igbaohu mgbe gboo

Ebe foto si, Getty Images
Taa n'ụwa gba gburugburu ka a na-eme emume ncheta nkwụsị ịgba ohu, iji cheta arụ akpaara oge gboo ma kwuo ọzọ emela n'ihe gbasara mgbere ohu.
Igbo na-atụ n'ilu sị, 'onye amaghị ebe mmiri nọrọ mawa ya, anaghị ama ebe ọ kwụsịrị'.
Ndị ma ihe ekwe na-akụ n' ihe gbasara ndekọ ihe mere oge gboo na- ekwu na ọ bụ n' afọ 1544 ka a malitere bufewa ndị isiojii Afrịka ofe mmiri okeosimiri 'Atlantic' dika ohu ndịọcha.
Ihe dịka agbata nde mmadụ iri na nde iri na abụọ bụ ndị a gbara na mgbere ohu site n' Afrịka gafee oké osimiri Atlanti bụga ha Yorup na Amerika ebe e ji ha mere ndị ọrụ n'ụgbọ shuga na kọfị na mba ndị ahụ bido n'afọ 1700 rue 1900.
N'otu oge ahụ, ihe karịrị ụmụ afọ Igbo mmadụ otu nde na ụma ise so na ndị e refuru ala ndịọcha.
Ụfọdụ ndị Igbo na-ere n'ohu bụ ndị e meriri n'agha obodo na obodo maọbụ ndị ekperima nakwa ndị di isi ike erefulu n'ihi na ndị nwe ha kpọrọ ha ndị abaghị uru maọbụ ndị a tọrọ atọrọ.
Ụfọdụ ndị erere n'ohu bụkwa ndị ha na mmadụ ibe ha maọbụ obodo nwere esemokwu.
Iji maa atụ: Ufọdụ ndị okenye ndị Arochukwu ha na BBC Igbo nwere mkparịtaụka kọwara na, oge gboo, e wetara Ukpabi Asika(Long Juju) ikpe,ndị ochie ha na-ere n'ohu ụfọdụ ndị a mara ikpe ọnwụ n'esemokwu dịrị ha na ibe ha maọbụ obodo kama igbu ha egbu.
Ndị niile si Afrịka e rere n'ohu , dịka akwụkwọ 'Britannica' siri kọwaa ya, bụ akwa, mmanya na ngwaọgụ ndịọcha na-arụpụta oge ahụ ka e jiri kwụọ ụgwọ isi ha.
Etu e siri bido agha ịmachi mgbere ohu

Ebe foto si, Getty Images
- 1803 - Ọ bụ mba Denmark bụ mba mbụ machiri mgbere ohu n'afọ 1803 .
- 1807 - Mba Briten machiri nwa afọ mba ha maọbụ ụgbọmmiri si mba ha itinye aka na mgbere ohu. Iwu ahụ jikwa mba ndị Briten na-achị oge ahụ.
- 1808 - Na mba Amerika, ọ bụ n' afọ a ka e wepụtara iwu machiri ịzụ ndị isiojii Afrịka dịka ohu.
Obere mba ndị ọcha ndị ọzọ dịka Spen, Brazil,Portugal mechara machie mgbere ohu na mpaghara nke ha n'agbata 1860.
Mana iwu ndị a mba dị icheiche mapụtara akwụsịghị mgbere ohu kpam kpam n'ihi na ya bụ ahịa bụ e zuo ka aha eri udele, a tọtuo ngịga.
Ya bụ mgbere mmadụ bụ nkata a dị ọtụtụ akpa site na mba gafere na mba ọzọ.
Nke a pụtara na mkpebi ịkwụsị ya zụrụ oke naanị mgbe e nwere nkwekọrịta mba na mba na ha ga-efopụ ajọ ero ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ndị okwu a doro anya siri kwuo, ọ bụ mgbanwe echiche, obi Chineke nakwa ihe gbasara ndakpọ akụnaụba nke ụgbọ e ji ebu ndị ohu mere ka okwu ịkwụsị mgbere ohu ji nwee ezi isi.
Nke kachasị nke bụ ozioma banyere ikike dịrị onye nke ụfọdụ ndị mmadụ welitere isi bidoro ịgbasa iji katọọ mgbere ohu. Ozi ahụ metụtara ọtụtị n' obi ma mee ka ọtụtụ sonye n' ọgụ " nwere onwe ahụ.
Tupu ihe ndị a e mee, e nwelarịị ọtụtụ ndị ohu nupụrụ isi na mba Haiti nakwa mba Amerika ebe ihe rụrụ mmadụ 300 haara mmiri ịgbagbu ha kama ha ga-abụ ndị ohu.
A na-akpọ ebe ahụ taa dịka "Igbo Landing".
Ndị a ma ama kachasị tinye Ụchụ n'ozioma ka a kwụsị mgbere ohu gụnyere:
1. Olauda Equiano(1745 - 1797)

Ebe foto si, The British Library (Public Domain)
Olaudah Equiano bụ nwa afọ Igbo a tọọrọ ya na nwanne ya nwaanyị oge ọ dị afọ iri na otu, ree ha n'ohu buga ha ala Bekee.
Ọ nọrọ ebe ọ bụ ohu mụta akwụkwọ ma rutakwa ego o jiri gbara isi onwe.
Equaino so n'otu ndị isiojii mmadụ iri na abụọ soro gbaa mbọ maka nkwụsị mgbere ohu n'ihe dịka afọ 1786.
O mechara dee akwụkwọ maka ije ụwa ya.
2. William Wilberforce(1759 - 1833)

Ebe foto si, Getty Images
William Wilberforce bụ onye mba Briten ma bụrụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị na mba ahụ.
A mụrụ ya n'ikpo ego mana ọnọdụ ahụhụ ndị a gbatara n'ohu na-eri ya nri n'afọ nke ukwuu.
Onye omeiwu bido n' afọ 1784-1812, Wilberforce iji ọkwa ya nakwa ihe ọ nwere tinye nnukwu uchu n'ịkwụsị mgbere ohu na mba Briten.
3. William Lloyd Garrison

Ebe foto si, Getty Images
Na mba Amerịka ka okwu ịkwụsị mgbere ohu malitechara, e bidoro zilawa ụfọdụ ndị eri uru n'ohu Afrịka.
Ihe dịka mmadụ 12000 nụ ihe a kpọlatara.
Mana nzọpụ ụkwụ ahụ ezughị oke dịka mgbere ahụ na mmegbu ndị ohu na-aga n'ihu.
Garrison ji akwụkwọ akụkọ ọ na-ede were gbasaa ozi ka akwụ ya bụ ajọ ihe na mba Amerịka.
E mechara pịachie akwụkwọ banyere ịgba ohu oge gboo.
Mana arịrị na-eri obi ụfọdụ dịka otu ndị ọrụ mba ụwa bụ 'International Labour Organization' (ILO) n'ihi na ụfọdụ ndị mmadụ alọghachila n'agwa ọjọọ ahụ e kpochapụrụ afọ kwuru afọ gara aga.
Dịka ILO siri gbaa n'ama, mmadụ karịrị nde narị anọ nọ n'ohu nke agba ọhụrụ dika a gbara ha na mgbere maọbụ manye ha ọrụ n'ụlọ ha anabataghị.
N'afọ 2018, otu African Union kwuru na ihe ruru mmadụ dị n'agbata 400,000 na 700,000 bụ ndị na-agbaga ala Bekee bụ ndị tọrọ na ebe anwụchiri ha dịka ohu na mba Libya.Ụfọdụ n'ime ndị a n'anwụfu n'elu oke osimmiri 'Mediterran, ebe a na-erefu ụfọdụ were ha mere ohu n'ọnọdụ na-gbawa obi.

Ihe nkiri ga-amasị gị:













