Nnamdi Kanu Court Case: Ozi ọhụrụ Nnmadi Kanu ziputere gbasara ikpe ya na-abịa n'October 21

Ebe foto si, Getty Images
Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor ekwuola na onye ndu Indigenous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu na-ekele ndị otu ya maka ezi nkwado ha na-enye ya kamgbe ọ nọ n'ụlọ mkpọrọ.
N'ozi o ziputere ụnyahụ bụ ụbọchị Oktoba 18,2021, ọkaiwu Nnamdi Kanu kwuru na ọ bụ ya na ogbo ya bụ okaiwu Alloy Ejimakor so mee ya bụ njem nleta.
O kwuru na ahụ dị Maazi Kanu mma, kwukwa na obi di ya ụtọ maka nwado ndị otu ya na-enye ya.
Ozi ya ruturu aka na mpụtara ọhụrụ nọ n'isi Maazị Kanu nke bụ na gọọmentị Naịjirịa site n'aka ọkaiwu ukwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami agbala Nnamdi Kanu akwụkwọ ọhụrụ n'ụlọ ikpe n'ụbọchị Mọnde nke gụnyere ebubo ikpa nkata itisa idinaotu Naijịrịa nakwa nkata ọgbahara na iyi egwu na Naịjirịa.

Ebe foto si, Arise TV/Youtube
Cheta na e hiwere ikpe ikpe Maazị Kanu n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktoba, 2021 dịka ndị otu Ipob zipụtara ozi iwu onye nọrọ n'ụlọ maka nkwanye ugwu ya bụ ikpe.
Ozi Maazi Ejiofor rịọrọ ndị niile na-eso Maazị Kanu ka ha gaa n'ihu na-ebu ọnụ ma na-ekpere ya ekpere maka ikpe ya na-abịa n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Oktoba.
Maazị Ejiofor gara n'ihu zipụta ozi ịdọ aka na nti nye ndị niile na-esi n'ụzọ Soshal Midia na-akparị maọbụ na arụ ndị okaiwu Kanu aka.
O kwuru na Maazị Kanu agaghi agbaghara onye ọbụla na-akwadoghi ndị ọkaiwu ya.
Ozi Ejiofor kwukwara na Maazị Kanu si na ọchọghị ịma ọkwa onye ọbụla na-akpari ndị ọkaiwu ya maọbụ etụ ya na onye ahụ siri dị nso, onye ahụ mara na ya na ya anọghị n'otu ụgbọ.
Ọ gara n'ihu rịọ ka mkparị niile nye ndị ọkaiwu ya kwụsi n'ike ugbua.
Na nchikọta ozi ya, Ejiofor kwuru na ha akwadola ya bụ ikpe ma nyefee ya n'aka Chineke.









