Nnamdi Kanu's trial: Mkpu ọṅụ dara n'ụlọ ndị mmadụ dịka Nnamdi Kanu wuchiri n'ụlọikpe

Ndị bi n'Owere na-enwe aṅụrị
Nkọwa foto, Ndị bi n'Owere na-enwe aṅụrị
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

N'Owere, Imo Steeti, onye ntaakụkọ BBC Igbo gwara anyị ka ndị mmadụ na-ekiri ihe onyonyo ebe akpụtara Maazị Kanu n'ụlọikpe taa tipụrụ n'ọṅụ, ma gbapụ egwu aṅụrị.

Ụfọdụ ha nọ n'agbataobi ha na-atụ onwe ha mmanya sị na ha hụrụ site n'ihe onyonyo nakwa foto ha hụrụ na ahụ siri Nnamdi Kanu ike.

Ndị bi n'Owere na-enwe aṅụrị
Nkọwa foto, Ndị bi n'Owere nọ n'ụlọ na-atụ onwe ha mmanya ji gosi ọnụ na Nnamdi Kanu pụtara n'ụlọikpe n'ahụike

A kpụtara Kanu n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja na Tọzde ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba afọ 2021 maka ebubo asaa gọọmentị etiti boro ya.

Nnamdi Kanu

Ebubo ndị ahụ gụnyere ịkpa nkata iwepụ Ọwụwa Anyanwụ, mpaghara 'South South', Benue na Kogi steeti na Naijiria, ịkparị onyeisiala Muhammadu Buhari, iyi ndụ egwu na ịkpọ oku ka a chụwa ndị ọrụ nchekwa na ndị ezinaụlọ ha.

BBC Igbo nọ n'ụlọikpe 'Federal High Court nke Abuja bụ ụlọikpe ukwu Naịjirịa ebe a ga-ekpe ikpe Nnamdi Kanu bụ onye ndụ ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob).

Ndị ọrụ nchekwa pụtara n'igwe n'ezi oge na-enyocha ụgbọala nakwa ndị na-agafee n'ogige ụlọikpe ahụ.

Ha nyochakwara ndị ntaakụkọ ịma ndị kwesiri ibanye ụlọikpe na ndị ekwesighi.

Ọtụtụ ndị ọkaiwụ dị iche iche gbakọtara, anya niile na-ele ịhụ ma Gọọmentị Naijiria a ga-akpọpụta Nnamdi Kanu n'ụlọikpe dịka e ji ya ụlọ nga pụrụiche nke ndị DSS kemgbe ọnwa Jụụn afọ a.

N'Abia steeti

Umuahia, Abia Steetị
Nkọwa foto, Umuahia, Abia Steetị

N'Umuahia bụ isi obodo Abia Steeti bụrụkwa akụkọ ebe ndị Nnamdi Kanu si, ndị mmadụ nọ n'ime ụlọ ha taa dịka enwebeghi, ụlọ akwụkwọ, ụlọ ahịa, ụgbọ ala na-ebughari ndị mmadụ, maọbụ ụlọ akụ ọbụla.

Ka o si aga ndị mmadụ anaghi a ga mkpa ha taa.

Aba adịghị ka Aba

Aba
Nkọwa foto, Iro tọgbọọ chakoo n'Aba

Ndị Aba agaghị ọrụ, ahịa maọbụ ọdọahịa ha dịka ha sonyere na 'nọrọn'ụlọ' maka ikpe Nnamdi Kanu taa n'Abuja.Onye ntaakụkọ anyi gagharịị ịhụ ka ihe siri gaa n'Aba kwuru na nkwonwo e ji mara Aba adị ya taa dịka ebe nile tọgbọrọ chakoo.

Aba

A kpọchikwara ọnụama Ahịa Ariariana na nnukwu ahịa ndị ọzọ.A hụrụ ndị ọrụ nchekwa na mpaghara dị iche iche n' Aba, ikekwa, iji hụ n'ọdachi adapụtaghị.

N'Ụmụahịa, ọkụ na-apụ ndị ọrụ nchekwa n'anya

Michael Okpara Roundabout, Umuahia
Nkọwa foto, Michael Okpara Roundabout, Umuahia

Iji hụ na ọgbaghara adapụtaghị, nndị ọrụ nchekwa wujuru ebe n'ike n'ụmụahịa.Onye ntakụkọ anyyị hụụ ụgbọala ndị ọrụ nchekwa dị iri nke ndị uweojii , ndị agha na ndị 'Civil Defence' juru n'okporoụzọ Aba Road n'Ụmụahịa n'ehihie.

Ụgbọala ndị a nọ na-akwọgharị n'okporoụzọ a ma ama n'Ụmụahịa.

Úmúahía

N' Imo Steetị

Ebe niile tọgbọ chakoo n'obodo atọ kachasị n' Imo steeti; Owerri, Orlu na Okigwe ụbọchị Tọzde maka ikpe Nnamdi Kanu.N'Owere, isiobodo Imo steeti, ụlọakụ, ụlọakwụkwọ, ahịa, ọdọahịa na ọdọ mechiri emechi.

Aladimma Owerri, Imo Steetị

Ebe foto si, BBC

Nkọwa foto, Aladimma Owerri, Imo Steetị
Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Aladimma Owerri, Imo Steetị
Nkọwa foto, Aladimma Owerri, Imo Steetị

Ka o si a ga ugbua, ahụghị ma ijiji ma ngwere n'ezi taa bụ Ọktoba 21 na mpaghara dị ịche ịche n'imo steetị.

Ka ụzọ MCC Owerri dị ugbu a
Nkọwa foto, Ka ụzọ MCC Owerri dị ugbu a

Ndị mmadụ apụtaghị ezi; enweghi ụgbọ ala na-agaghari, ahịa, dị ịche ịche, ụlọ akwụkwọ, ụlọ akụ na-ebe ndị ọzọ emepeghi ịgọsị na ndị mmadụ na erụbere iwu ịnọ n'ụlọ a isi.

Aladimma Owerri, Imo Steetị

Ebe foto si, BBC

Nkọwa foto, Aladimma Owerri, Imo Steetị
Awka, Anambra Steetị
Nkọwa foto, Awka, Anambra Steetị

Enugu Steetị

Ebe niile na akụkụ Enugu dị iche iche tọgbọọ chakọọ, i gosi na ndị mmadụ na-erubere ya bụ iwu onye-noro-n'ụlọ.

Regina Caeli Junction Axis (Enugu - Onitsha Expressway)
Nkọwa foto, Regina Caeli Junction Axis (Enugu - Onitsha Expressway)

N'Anambara Steetị

N'akụkụ Anambara Steetị dị iche iche BBC Igbo hụrụ ka ndị mmadụ si kwanyere iwu 'onye-nọrọ-n'ụlọ' ugwu, dịka ndị mmadụ apụtaghi ezi chaa cha.

Ahịa, ụlọakụ, ọdọahịa na ụlọakwụkwọ emepeghị.

Awka, Anambra Steetị
Nkọwa foto, Awka, Anambra Steetị
Ọka, Anambara
Nkọwa foto, Ọka, Anambara

N'Ebonyi Steetị

Ebonyi Steetị
Nkọwa foto, Ebonyi Steetị

Ndị bi na Ebonyi Steetị nọ n'ụlọ taa, naanị ụgbọ ala na ọgba tom tom ole m ole ka BBC Igbo hụrụ n'okporo ụzọ taa. Ọtụtụ ebe emepeghi, nke gụnyere ahia, dịka ahia Margret Umahi International, Ricemill na ebe ndị ọzọ.

Ódóahía dí n'Ebonyi

Ụlọakwụkwọ, ulọakụ na amaegwuregwu dị ịche ịche emepeghi cha cha.