Biafra Referendum: Ndị ọkaiwu Igbo etinyela akwụkwọ ka agụnye ha n'akwụkwọ ndị Ugwu gbara ka enye Igbo 'referendum'

Ndị na-eti mkpu ka e nye ha Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Ụfọdụ ndị Ọkaiwu Naijiria nọ n'otu a kpọrọ Igbo Lawyers Association' etinyela akwụkwọ ka ụlọikpe gụnye ha na ndị ga-asatara ndị Igbo ọnụ n'akwụkwọ nke otu jikọrọ ndị okenye Ugwu gbara ka Ụlọomeiwu hazie atụtụmatụ inye ndị Ọwụwa Anyanwụ ikike ikewapụ na Naijiria.

Ndị okenye na Kano Steeti agbara akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja na-arịọ ka ụlọikpe manye ndị ụlọomeiwu nta na nke ukwu ịmalite usoro ga-enye aka ime ka ndị Igbo nwere onwe ha Naịjirịa.

N'akwụkwọ ahụ nke Onye nchịkọta otu Igbo Lawyers Association bụ Victor Onweremadu tinyere, ọ sịrị ha ha mere nke a na ndị okenye Ugwu gbara akwụkwọ ahụ etinyeghị ndị Ọwụwa Anaynwụ bụ ndị ikpe ahụ metụtara na ndị nwere okwu ha ga-asaa n'ime ahụ.

Ọkaikpe Tsoho gaara n'ihu tinye ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba 2021 dịka ụbọchị a ga-amalite ya bụ ikpe ebe a hanye ikpe ahụ n'aka Jọstịs Inyang Ekwo nke Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja.

Ndị okenye ndị ugwu agbala akwụkwọ n'ụlọikpe na-arịọ ka Naịjirịa malite usoro 'referendum' maka Biafra ngwangwa

Ipob

Ebe foto si, Uche Akolisa

Ụfọdụ ndị okenye na Kano Steeti agbaala akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja n'arịrọ ka ụlọikpe a manye ndị ụlọomeiwu nta na nke ukwu ka ha malite usoro ga-enyeaka ịme ka ndị Igbo nwere onwe ha Naịjirịa tupu e megharịa akwụkwọ iwu Naịjirịa.

Ndị gbara akwụkwọ a nke akara ya bụ FHC/ABJ/CS/538/2021 bụ Nastura Ashir Shariff, Balarabe Rufa'I, Abdul-Aziz Sulaiman na Aminu Adam.

Ndị a sị na iwe ha sitere na mkpọtụ niile otu dị iche iche na-eme gbasara nwereonwe na Naịjrịa.

Ndị a gbara ya bụ akwụkwọ gụnyere onyeisi ndị Sineti bụ Ahmed Lawan, onye nke House of Rep bụ Femi Gbajabiamila na ndị ọkpakọ ha niile na Abubakar Malami bụ ọkaikpe ukwu Naịjirịa.

Aha onyonyo, Ifeanyi Ubah : Gọọmenti etiti bia kọwara sineti etu ha si nwụchie Nnamdi Kanu

Ihe akaebe ndị a tinyere n'akwụkwọ ikpe a bụ na ha achọghị ka ihe mere na 1967 - 1970 mee ọzọ maka ọtụtụ ndụ etufuru na ya bụ agha Biafra.

Ha gụnyekwara agha Biafra na nsogbu niile ndị otu Ipob na MASSOB na enye kegbe na Naịjirịa.

Ha kwuru na nke a bụ maka igbochi ọgụ na nsogbu bụ nke nwereike ịpụtara na Naịjirịa.