Rev Fr Ejike Mbaka: Onye ụkọchukwu Katọlik ọbụla na-akatọ m agaghị enwe ọṅụ

Fr Ejike Mbaka

Ebe foto si, Adoration Ministry Enugu Nigeria/Facebook

Nkọwa foto, Fr Ejike Mbaka

Ụkọchukwu Katọlik a ma ama bụ Rev. Fr. Ejike Mbaka ekwupụtala etu ọtụtụ ndị ụkọchukwu ibe ya si atajiri ya anya ma na-akatọ ọrụ ya.

Fada Mbaka kwuru nke a n'ụbọchị Wenezde, n'ụlọ ekpere ọ bụ onye ndu ya a na-akpọ 'Adoration Ministry' dị n'Enugwu.

O kwuru na ọtụtụ ndị ụkọchukwu na-ekwutọ aha ya ebe niile, ma na-agbasi mbọ ike ka e mechie ụlọ ekpere ya.

Aha onyonyo, Ejike Mbaka(Rev Father) adọọla ndị ọchichị Naịjirịa aka na nti

Ọ gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ndị na-akatọ ya abịatụbeghị n'ụlọụka ya bịa hụrụ etu ha si eme ihe, mana ha na-eburu aha ya n'akpagharị.

"Ihe ka njọ bụ na ọgụ a na-alụso m bụzi ndị Fada na-aluso fada ibe ha," Mbaka na-ekwu.

"Ị hụ na soshal midia, ọ bụrụ ndị Fada ga na-ede."

"Ọgbakọ ndị Bishọp ga-abịa n'Enugwu, ọtụtụ ndị Fada edewela akwụkwọ gwawa ha ihe ha ga-eme Mbaka mgbe ha bịara n'Enugwu."

Aha onyonyo, 'Amụma Fada Mbaka buru maka Hope Uzodinma n'Imo na-eme ihere'

Mbaka kwuru ka ndị dị otu a kpachara anya ha n'ihi na ọ bụ Mmụọ Nsọ na-arụ ọrụ n'ime ya.

"Agaghị m adị ka mmadụ, onweghịkwanụ onye ga-adị ka m."

"Ana m enwe aṅụrị maka Mbaka m bụ, gị onwe gị nwekwaa aṅụrị maka onye ị bụ."

"Ị chọwa ịkatọ Mbaka oge niile, ị gaghị enwenata ọṅụ."

Ihe merela Mbaka n'ọdị nso a

Aha onyonyo, Father Ejike Mbaka na ihe ndị ị maghị maka ya

Aha Mbaka na-ewu ewo n'ọdị nso n'ihi ọtụtụ okwu okwu o kwurula n'ụlọụka ya.

Okwu ndị a gụnyere nkatọ ọ katọrọ ọchịchị Onyeisiala Buhari, na-agbanyeghị na ya bụ Mbaka kwadoburu Buhari n'oge gara aga.

Ọzọkwa bụ nke o kwuru gbasara onyeisi ndị IPOB bụ Mazi Nnamdi Kanu, onye Mbaka kwadoro ma kwuo na Chineke ga-agọzi ya.

Aha onyonyo, Okwu mbaka maka amụma o buru Hope Uzodinma

Cheta na gọọmentị Naịjirịa ji Nnamdi Kanu eji maka ebubo na ọ na-emegide obodo Naịjirịa.

Mana Mbaka akpọọla oku ka Buhari tọhapụ Kanu, kama ka o lebaa anya n'okwu mere ndị mmadụ ji achọ ikewapụ na Naịjirịa.

Chetakwa n'ọdị nso a oge ndị ekpere 'Adoration Ministry' mere ngagharịiwe ma mebie ọtụtụ ihe n'ihi na akụkọ fesara na a tọrọla Mbaka.

Mana o mechara bụrụ na ọ bụ Bishop Enugwu bụ Callistus Onaga kpọrọ ya oku.

Bishop Onaga mechara nye Mbaka ntaramahụhụ nke bụ ịgwa ya ka ọ kwụsị ikwu okwu n'ọha ruo abalị iri atọ.