Ejike Mbaka: Ka onye e ji n'agbụ nwere onwe ya dịka Joseph

Ụkọchukwu Ejike Mbaka

Ebe foto si, Facebook/Adoration Ministry Enugu Nigeria

Nkọwa foto, Ụkọchukwu Ejike Mbaka

Ụkọchukwu ụka Katọlik bụ Father Ejike Mbaka ekpeela ekpere ka Chukwu tọhapụ ngwa ngwa onye ọbụla nọ n'agbụ nakwa na mkpọrọ.

N'ozi ọ gbasara n'oge ọ na-eme ekpere 'Adoration ụbọchị taa Wenezde n'Enugwu, Fada Mbaka kpere ekpere ka amara mee n'isi nwaamadi ahụ dịka o mere n'isi Joseph n'Akwụkwọ Nsọ bụ onye o kwuru siri na mkpọrọ bụrụ eze.

Mbaka akpọghị aha onye ọ na-ekwu maka ya mana ozi ahụ na-abịa ka ọ gachara otu abalị akụkọ gbara na Gọọmentị Naijiria nwụchirị ma kpụlata Naijiria NNamdi Kanu, onye ndu Ipob maka ebubo ịkpa nkata ikewa Naijiria.

Ọ gara n'ihu tie n'oke olu, " O! ndị iro m achịla m ọchị n'ihi na m ga-ekuli ọzọ."

Mbaka onye dọọ aka na ntị na ndị ndu Naijiria akpachaghị anya mee ihe ha kwesịrị ime na Naijiria nwere ike ịgbasa sịrị, "Ịta ahụhụ abụrụla omenala na Naijiria."

"Etu Naijiria si aga ugbua, oge na-abịa mgbe aga akpụrụwa ndị ụkọchukwu."

"Gọọmentị Etiti kpụrụgodi mmadụ niile, ihe na ebe ka ga na- ebe."

"Ndị ọchịchị were ego ha kwesiri iji nye ndị mmadụ ọrụ ka ha ji ego egbe."

" Ndị kwesịrị ịnọ na mkpọrọ bụ ndị na-atụnye mmadụ na mkpọrọ."

Mbaka , onye kwuru na ya zịcha ozi ya, e nwere ike ịkpọ ya oku ọzọ bịa zara ọnụ ya kwuru sị,

"Ịmaja ndị mmadụ agaghị arụ ọrụ. Nnwuchi agaghị egbo nsogbu. Ọ ka mma na gọọmetị gere ndị mmadụ ntị. Enyela nkịta aha ka i were gbuo ya."

Aha onyonyo, End Sars: Ihe Fada Mbaka gwara ndị kwuru na ha ga-agba 'Adoration Ministry' ọkụ

Ọ dọrọ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ aka na ntị sị, "Ndị Gọvanọ ụnụ erela ụmụ n'ihi nkwa ọchịchị ụnụ amaghị ma ọ ga-enwe isi."

Cheta na Mbaka ekpeburola Nnamdi Kanu ekpere ngozi n'oge ọgbakọ ekpere "Adoration" ihe dịka izuụka isii gara aga.

Ụka Katọlik mechara kwsịburu ọrụ dịka onye ndu ọgbakọ ekpere 'Adoration' abalị 30 'iji nye ya ohere ka ọ mee ntụghari uche na ekpere.

Mana oge ndị na-eso ahụghị ya n'ọgbakọ ekepere izu ahụ, ha mere ngagharịiwe ma mebie ọtụtụ ihe n'ụlọụka 'Holy Ghost nakwa ụlọ Bishop Enugwu Katọlik bụ Calistus Onaga.