Cyber Security: Etu i ga-esi gbalahụ onyonyo aramara gị ịpụta ihe

Nwaanyị

Ebe foto si, Iwaria

Dịka ikuku onyonyo aramara na ihe nkiri ọtọ ndị mmadụ na-efesa n'ịntanetị ugbua, ndị ọkachamara na nchekwa ịntaneetị, bekee kpọrọ 'cyber security' akọwaala etu mmadụ ga-esi chekwaa ihe dị n'ekwentị ya ka ọ ghara ịrapụta ya.

Nke bụ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị ntorobịa ugbua na-ese onwe ha foto maọbụ mee ihe nkiri na-egosi akụkụ ahụ ha ndị ọzo ekwesighi ihụ maọbụ ebe ha na ndị nke ha na-enwe mmekọ.

N'ọdị nso a, akụkọ gbasara ihe nkiri aramara maọbụ foto ọtọ apụtala ọka nkụ.

Akụkọ ndị a metụtara otiegwu Tiwa Savage, onye ejije Tonto Dike, ọgba egwu Jane Mena, Cross (Big Brother Naija), na ụfọdụ ndị ọzọ.

Etu ị ga-esi zeere ụdị ihe m gara mara dị otu a

Ikechukwu Sunday Okonkwo

Ebe foto si, Big Brother Naija

Nkọwa foto, Cross BBNaija ji amaghị ama gbasaa foto ebe ọ gba ọtọ n'achọ ịsa ahụ

Eyitemi Egbejule, onye bụ ọkacha mara na 'Cyber Security Expert', gwara BBC Igbo ihe olemole mmadụ ga-eme iji chekwaa onwe ya:

  • Gbachie ekwenti gị: Ekwenti gị ekwesighi ị bụ ụlọ na-anaghi emechi ụzọ ya emechị. "Ọ di ezigbo mkpa na mmadụ gbachiri ekwenti ya ka mmadụ ghara inyocha ihe dị n'ime ya mgbe ị maghi ama.""Akara ị ga-eji agbachi ekwenti gị kwesiri ita ezigbo akpụ, ka ọ ghara ịdị mfe mmadụ ịkata ya."Agwakwala mmadụ akara i ji gbachịe ekwentị gị, maka akụkọ agbakwaa nwa nnụnụ nne ya efepụ'.
  • Mara ndị i na-enye ekwentị gị: "Ọ bụghị mmadụ niile ka i kwesiri i na-enye ekwenti gị mgbe o gbapere a gbape."Tupu inye mmadụ ekwenti gị, ọ ga adị mma ka i cheta wepụ ihe olemole ị chọghị ka mmadụ hụ.
Nwaanyị

Ebe foto si, Iwaria

Nkọwa foto, Ụzọ kacha mma ka onyonyo ọtọ gị ghara ịgba na soshal midia bụ ka ị hapụ ise ya chaachaa
  • Gbachie ma chekwawa akara soshal midia gị: Ọtụtụ ndị mmadụ na-hapụ ọnụ ụzọ akara soshal mịdịa ha ka ma oke ma ngwere na awụbata ma na-ekiri ihe ha na-ekesa. Ọtụtụ soshal midia enyela ohere olemole mmadụ nwere ike i ji gbochie mmadụ niile ịhụ ihe ha na-eke nke a ka bekee kpọrọ 'Privacy settings'.Ọ bụrụ na ọ na-amasị gị ikesa ihe n'ịntaneetị, gaa hazie 'Privacy settings' gị. I nwekwara ike inye naanị onye ị chọrọ ohere ikiri ihe i tinyere na soshal midia
  • Esela foto ọtọ gị chaachaa: Ụzọ kacha mma ka onyonyo ọtọ gị ghara ịgba na soshal midia bụ ka ị hapụ ise ya chaachaa, maka na ndị Igbo na-atụ ilu na "mmiri anaghị eri onye ọ hụghị ụkwụ ya anya".
Nwoke na nwaanyí

Ebe foto si, Iwaria

Nkọwa foto, I nwekwara ike inye naanị onye ị chọrọ ohere ikiri ihe i tinyere na soshal midia

N'aka nke ọzọ, Jake Effoduh, bụ onye ọkaiwu gbasara nchekwa onwe na ikike diri mmadụ, gwara BBC Igbo na iwu Naịjirịa nyere mmadụ ikike maka ihe dịịrị onye ahụ, nke bekee kpọrọ 'right to privacy'.

O kwuru na nke a dị na ngalaba nke iri atọ na asaa (Section 37) n'akwụkwọ iwu Naịjrịa.

Onyonyo aka mkpa

Ebe foto si, Getty Images

"Mgbe ọbụla mmadụ kesara ihe onyonyo maọbụ fọtọ maọbụ mgbasaozi ọbụla ị chọghị ka ọha hụ, onye ahụ na-emegide iwu ala Naịjirịa nke pụtara na i nwere ikike igba onye ahụ akwụkwọ n'ụlọikpe."

Maazị Effoduh kwukwara na e nwere iwu mba ụwa a kpọrọ 'International Covenant on Civil and Political Rights', nke na-echekwa ihe ọbụla ndị mmadụ achọghị igba n'anwụ ka ọha hụ.