Porn Addiction: Lee ihe o nwereike ibutere gị

Ebe foto si, Terrycrews/Instagram
N'afọ 2016 ka onye na-eme ihe ejije ama ama bụ Terry Crews kọwara etu ihe onyonyo aramara bụ siri baa ya n'ọbara ma bụrụ nsogbu nye ya.
Bekee na-akpọ ọnọdụ nke a Maazị Crews hụrụ onwe ya "Pornography Addiction".
Okwu ahụ o kwuru mere ka ọtụtụ ndị mmadụ kwuputa etu ha na ihe aramara onyonyo si agba mgba.
Ndị ntaakụkọ BBC kọwara na ihe dịka ndị mba Briten mmadụ nde iri na ise lere ihe onyonyo a site n'ọnwa Sepụtemba afọ 2020 ruo ọnwa Jun afọ 2021.
A bịa na Naijirịa, ndị na-ekiri ihe aramara ka nkụ.
Otu websait na-eme ihe onyonyo aramara a kpọrọ PornHub kọwara na Naijirịa kachasị na ndị na-achọ ihe onyonyo aramara ụmụ nwaanyị buru ibu.
Dịka PornHub siri kwuo, Naịjirịa nọ n'elu mba 25 kachasị ekiri onyonyo aramara na-egosi ụmụ nwaanyị buru ibu na mba ụwa.

Ebe foto si, Pornhub.com/Insights- Screengrab
Ọ bụghị sọsọ aramara nwere ụmụnwaanyị buru ibu ka nchọpụta na-egosi ka na-amasị ndị Naịjirịa.
Na-agbanyeghị na Naịjirịa na-agbarụrụ mmekọ nwoke na nwoke maọbụ mmekọ nwaanyị na nwaanyị, n'afọ 2016, Google dere na mba ahụ so n'ebe kachasị ekiri atụmatụ Bekee kpọrọ "Gay Porn".
Nke a pụtara na ọtụtụ mmadụ na mba ahụ, dịka n'ụwa dum, na-ekiri ụdịrị onyonyo a.
Mana, dịka ụfọdụ nwere ike kirie ya gara onwe ha ihu na-enweghị nsogbu ọbụla, o nwere ndị ọ na-arịa ahụ ịhapụ ha - maọbụ ndị adịghị anọnwụ ma ya bụrụ na ha ekirighi ya.
Etu Adeniyi Adebola Atiba siri merie Porn Addiction

Ebe foto si, Adeniyi Adebola Atiba
Dịka Maazị Crews, Maazị Adeniyi Adebola Atiba nwekara nsogbu site n'etu o siri na-ekiri ụdịrị onyonyo a. Ọ sị na ihe onyonyo aramara chere ya ezigbo aka mgba.
Ugbua, ọ bụzị onye na-adụ ndị mmadụ ndụmọdụ maka nsogbu dị iche iche nke gụnyere maka ihe onyonyo aramara ọkachasị Porn Addiction.
Etu o siri bido
Atiba kọwara na ọ bụ maka na ọ na-anọkarị onwe ya nke Bekee na-akpọ "loneliness" soro kpata ya ile ihe onyonyo aramara.
O kwuru sị, "Dịka onye na-arụ ọrụ gbasara ịntanetị, ị nwereike na-arụ ọrụ n'oge abalị ihe gbasara pornography etipụta isi ka ị nyochaa ya".
O kwukwara na ọ bụ n'akwụkwọ nwere ihe aramara n'ime ya ka o siri bido banyezia na nke nkịrị.

Ebe foto si, Getty Images
Atiba kwuru, "Ọ bụ ụfọdụ akụko anyị na-agụ oge anyị pere mpe soro bido ọnwụnwa ilele ihe aramara".
O kwuru na dịka onye toro n'ụlọụka, na onweghị ihe ọ ma maka mmekọ nwoke na nwaanyị.
Atiba kwuru maka na enweghị onye guziri ya maka mmekọ nwoke na nwaanyị so na ihe mere o jiri bido ikiri ihe onyonyo aramara.
Kedụ ihe Porn Addiction na-ebute
Adeniyi Adebola Atiba kwuru na Porn addiction mere na ọ bụrụ na ya eleghị ihe aramara maọbụ gbọọ ncha na ọ nweghị ike ịche uche nke ọma.
Lee ụfọdụ ihe o kwuru na-eso Porn Addiction :
Oke ịgbọ ncha (Masturbation)
Adeniyi kọwara na ile ihe onyonyo aramara mere ka o bido gbọwa ncha.
Ọ kọwara, "ịleecha ihe onyonyo aramara ị ga-achọ ụzọ ị ga-esi nwereonwe gị nke ga-ebute oke ịgbọ ncha".
O kwuru na ya bụ ihe ga-adịzị ka usoro nke bụ onye leecha ihe onyonyo a, ọ chọwa ịgbọ ncha.
Obi Amamikpe
Dịka m bụ onye na-eziza oziọma n'ụka, ihe aramara mere ka obi na-ama m ikpe mgbe ọbụla m chọrọ ịrụ ọrụ oziọma.

Ebe foto si, Getty Images
O kwuru sị, " Ọ bụ ibu arụ dịịrị m, nke mere na ụfọdụ mgbe m na-atule ịkwụsị ọrụ oziọma n'ụka".
Obi Ịdamba (Depression)
Atiba kwuru sị, "ịkwu eziokwu, ọ mere ka obi daa m mba".
Ọ kọwara na mgbe ọbụla ọ chetara etu ihe aramara sị echere ya aka mgba na obi na-ada ya mba.
Ike okpụkpe ịgwụ mmadụ
O kọwara na nke a mere ka ọ kwụsị ịkpere Chi ya ekpere.
O kwuru sị," Ọ mere ka m chere na m adịghị ọcha nke mere na ọ naghị ekwe m kpee ekpere".
Kedụ mgbe mmadụ ga-ama na Porn Addiction ejidela ya?
Atiba kwuru na mgbe mmadụ na akacha amata na ihe onyonyo aramara abanyela ya n'ọbara bụ mgbe ọ nweghịike ịkwụsị ile ya.

Ebe foto si, Adeniyi Adebola Atiba
Ọ kọwara sị, "ọ bụ ijị aka gị bido ihe kama ịnweghịzị ike ịkwụsị ya".
Ihe ọbụla dị etu a na-ejisi ndụ mmadụ ike.
"Etu m sịrị merie Porn Addiction" - Adeniyi Adebola Atiba
Adeniyi Adebola Atiba kwuru sị, "Porn addiction na-eme ka onye na aṅụ ọgwụ ike".
Atiba kwuru na ọ bụ dịka ọ chọrọ ịlụ nwaanyị were kọọrọ nwunye ya ka njem mmeri ya siri bido.
O kwuru sị, "A gwara m nwunye m nsogbu Porn addiction m nwere, ọ nyere m aka nke ụkwụ. Ọ hụrụ na m anaghị anọ naani m mgbe niile ma na-akpọtụrụ m ọtụtụ mgbe".
O kwukwara na ihe ndị dị mkpa mmadụ kwesịrị ịme iji merie porn addiction bụ:
- Ezola ọnọdụ gị ezo
- Chọta onye enyemaka ị ga-akọsara
- Kwuo eziokwu maka etu o siri eche gị aka mgba
- Mata ihe ndị na-ebute ya ma gbara ihe ndị ahụ ọsọ.
Kedụ ihe ndị Nne na Nna ga-eme iji gbochie ụmụ ha ịbanye n'aka Porn Addiction?
Adeniyi Adebola Atiba kwuru sị, "Ọ dị mkpa ka nne na nna hapụ izoro ụmụ ha ihe gbasara ahụ nwoke na nwaanyị, na ihe gbasakwara mmekọ nwoke na nwaanyị".
Ndụmọdụ Atiba nyere ha gụnyere -

Ebe foto si, Adeniyi Adebola Atiba
- Nne na nna kuziere ụmụ ha maka ihe gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị
- Ka nne na nna na ụmụ ha nwee mkparịtaụka maka ihe ndị a
- Ka nne na nna kọwara ụmụ ha mpụtara itinye aka n'ihe ndị a niile
Ihe ndị nnyocha ọkaibe sayensi na-ekwu
Lee ihe Robert Hudson onye bụ ọkaibe na nyocha maka ndị aramara bara n'ụmị nke bụ "Sex addiction" na bekee kwuru maka nsogbu Porn addiction.
Hudson kwuru sị," ịle ihe onyonyo aramara abụghị nsogbu. Ọ dịka ịṅụ mmanya. Ụfọdụ nwereike ịṅụ mmanya etu ha kwesịrị".
O kwuru sị," Mgbe ihe onyonyo aramara bụ nsogbu bụ mgbe ya bụ ihe wegharịrị ọnọdụ chịwazie na ndụ onye ahụ".
Hudson gara n'ihu kwuo, " Ihe onyonyo aramara aghọọla nsogbu mgbe onye ahụ bidoro hapụ mmekọ ndị mmadụ dịka ọ na-achọ ohere ka ọ kịrịe ihe aramara".
O kwuru na ihe mbụ ha na-agwa ndị nwere nsogbu Porn Addiction bụ ka ha kwụsị ịgbọ ncha ọnwa atọ nke ga-eme ka ha nweta onwe ha ma kwụsị ịle ihe onyonyo aramara.
Hudson kọwara sị, "Nke a abụghị na a gwọọla gị kama ọ bụ ihe ngosi na ịnwereike ibi ndụ gị ma ịleghị ihe onyonyo aramara".













