Etu nwagbọghọ si tapụ amụ nwoke dinara ya n'ike

Nwoke na-awakpo nwaanyị n'ike

Otu nwagbọghọ a kpọrọ Juanita dị afọ 24 tapụrụ amụ nwoke a sị dinara ya n'ike mgbe nwoke a sị ka ọ ṅụọ ya amụ.

Nke a mere n'obodo Obuasi, Ashanti dị na Ghana mgbe nwoke a batara n'ụlọ nwaghọghọ ahụ n'etiti ime abalị dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Godwin Ahianyo si gwa BBC Pidgin.

Na nkọwa nwagbọghọ a nyere, ọ sị na " nwoke ahụ gwara ya ka ọ ṅụọ ya amụ na ọ bụ mgbe ahụ ka ọ tapụrụ amụ ya."

Nwoke a kpọrọ Emmanuel Ankron dị afọ 23 ji mma na egbe baa n'ụlọ nwata akwụkwọ na. Mgbe o zuchara ego, TV na ekwentị nwaghọghọ a, ọ sị zie ya ṅụọ ya amụ.

Mgbe ọ tapụchara amụ nwoke, o bu ọbara si n'ụlọ nwagbọghọ gbapụta n'ezi.

Juanita mere mkpesa n'aka ndị uweojii ma gaa n'ụlọọgwụ 'Anglogold Ashanti bụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ. O mechara chọpụta na nwoke ahụ bịakwa n'ụlọọgwụ ahụ ịnata ọgwụgwọ ma tie mkpu sị ka a nwuchie ya.

Ndị uweojii tụtụtara mpaghara amụ ahụ a tapụrụ dịka nyocha ka na-aga n'ihu.

Ndị uweojii sị na nwoke dinachara nwaanyị ma gwazie ya ṅụọ ya amụ, na ọ bụ mgbe ahụ ka nwagbọghọ a tapụrụ amụ ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: