Ngwa nri, mmanụ ụgbọala, ọkụ latrik na ihe ndị ọzọ ọnụego ha rịrị elu ọrji na 2020

Ebe foto si, BBC na Getty Images
Igbo tụrụ ilu sị na mberede nyịrị dike,na mberede ka e ji ama dike. Mana ọ dị ka a ga-asị na ihe mberede mere n'afọ 2020 nyịrị dike n'ezie.
Ihe mberede ndị dịka ọrịa coronavirus, ọgbaghara ngagharịiwe End SARS na ihe ndi dakwasịrị ụwa ọkachasi Naịjirịa gbanwere ọtụtụ ihe dị iche iche.
Otu n'ime ihe ndị gbanwere bụ mbuli n'ọnụ ego ụfọdụ ngwa ndị e ji ebi ndụ na Naịjirịa.
Akụkọ a ga-atụle ụfọdụ ihe ndị ọnụ ego ya rịrị elu, ihe kpatara ya na etu o si metụta ndị mmadụ na Naịjirịa.
Ngwa nri

Nri bụ ihe dị oke mkpa na ndụ onye ọbụla, ọ bụ ihe a na-etinye n'ọnụ maọbụ n'ahụ iji chekwaa ndụ, nwete ikike, kwalite otuto dgz,
Ọnụego ọtụtụ ngwa nri dịka osikapa, agwa, garị,yabasị na ndị ọzọ rịrị elu site n'ihe ọnụ ego ọ nọ bu na mbido afọ 2020.
Akpa osikapa nọ bu n'ọnụego puku naịra 18 ruo puku naịra 25 mana ugbua ọ nọ zi na puku naịra 30 ruo puku naịra 40.
Otu akpa garị nọ bụ na puku naịra asatọ mana ugbua ọ nọ zi na puku naịra 17.
Mba ji iri nọ bụ n'ọnụego puku naịra atọ na ụma, ugbua mba ji iri abụọ nọ na puku naịra ise.
Na mbido afọ a, a na-ere mkpụrụ yabasị anọ n'ọnụego otu nari naịra mana ugbua yabasị anọ bụ zi narị naịra ise.
Mmanụ ugbọala

Na mbido afọ 2020, ọnu ego otu lita mmanụ ụgbọala bụ N145 mana ọ gbaturu ala bụrụ N125 n'ọnwa Maachị maka ọdịda mmanụ agbịdị n'ụwa gbaa gburugburu.
N'ọnwa Eprelụ, ọgbatukwuru ala ma bụrụ N123 dịka ndị na-achikwa ọnụego mmanụ ụgbọala na Naịjirịa bụ Petroleum Product Pricing Regulatory Agency (PPPRA) si kwuo.
E ruru n'ọnwa Julaị, afọ 2020 gọọmentị ebulie ọnụego mmadụ ụgbọala ka ọ bụrụzie N143 otu litre maka ha sị na ha chọrọ isepu aka n'ụgwọ ha na-akwụ n'isi mmanụ agbịdị.
Mana e ruru n'ọnwa Sepụtemba, afọ 2020 gọọmentị bulikwara ọnụego mmanụ ụgbọala ka ọ bụrụ N151 kwa otu lita.
Naanị n'ime afọ 2020, ọnụego mmanụ ụgbọala agbanweela ugboro opekatampe ugboro atọ, dịka ọ na-agbanwe ka ọ na-emetụta ndụ ndị mmadụ.
Njem ụgbọala

Mgbe ọbụla mmanụ ụgbọala rịrị elu, ndị na-ata ahụhụ ya karịa bụ ndị na-agba ụgbọala eme njem dị iche iche.
Nke a bụ maka na ndị na-akwọ ụgbọala na-ebuli ego njem na-egbughi oge maka nke a.
N'afọ a, ọ bụghị naanị maka mbuli elu ọnụego mmanụ ụgbọala mere ọnụego njem ugbọala ji rịa elu.
Oge coronavirus malitere n'ụwa ma rute na Naịjirịa, gọọmentị tinyere mmachi onye apụla n'ezi maka mgbochi mfesasị ọrịa.
Ngwa ngwa gọọmentị buliri mmachi a, ha nyere iwu sị ka a na-anọsa anọsa n'ụlọụka, ụgbọala, ụlọọrụ na ebe ndị ọzọ.
Nke a mere ndị ọkwọ ụgbọala ji bulie ọnụego njem iji mee ka ha gbazuo ego ha maka na ụgbọala na-ebu mmadụ iri na asatọ malitere buwezie mmadụ itoolu.
Ego ole a na-agba i si Legọs a ga Ọwụwanyanwụ nọ bụ n'ihe dịka puku naịra ise ruo puku naịra asaa n'ọnwa Febụwarị na Maachị.
Mana dịka coronavirus bịachara n'ihe dịka n'ọnwa Ọgọstụ mgbe e buliri mmachi njem, i si Legọs gaa Ọwụwanyanwụ rịrị elu ọrji dawazie puku naịra iri ruo puku naịra iri na otu.
N'otu aka ahụ, ime njem n'ime steetị, ebe a na-agbabu otu narị naịra aga gbanwere bụrụzie narị naịra abụọ.
Etu a ka ọnụego njem ụgbọala na-ada ugbua nke nwereike itinyekwu ego n'ihi ka na-abịa abịa.
Ọkụ Latrik

Ebe foto si, sciencephotolibrary
Ọkụ latrik bụ otu ihe ọzọ dị mkpa na ndụ ndị mmadụ mana o tinyekwuru ego na Naịjirịa n'afọ 2020 dịka ibe ya.
Na mbido afọ 2020 ruo ihe dịka n'ọnwa Maachị, ọnụegọ otu kilowat ọku latrik bụ N25.731 maka ịmụ ọkụ n'ụlọ, ebe ọ bụ N41.661 maka ndị ji ya na-eme azụmaahịa dịka ụlọọrụ 'GlobalPetroPrice.com' si deputa ya.
Mana n'ọnwa Sepụtemba, ụlọọrụ na-ahụ maka ọkụ Latrik bụ Nigerian Electricity Regulatory Commission (NERC) buliri ọnụego ọkụ latrik.
Ugbua ọnụego ọkụ latrik per kilowat nọ zi na N34.28 ruo N58.22 na mpaghara Ọwụwanyanwụ nke Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) na-ahụ maka ya.
Etu a ka atụmatụ ọhụrụ a malitere n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba afọ 2020 dịkwa na mpaghara Ugwu, Ndịda nakwa Ọdịdanyanwụ nke Naịjirịa.
Kedụ etu o si metụta ndị Naịjirịa?
Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa etiela ebewu etu mgbanwe n'ọnụego ihe ndị si metụta ha nakwa ezinaụlọ.
Otu nwaanyị na-ere ahịa nri na-achọghị ka a kpọọ aha ha sị na ọ na-arazi ahụ ịzụta ngwa nri ka ọ fọdụzie irizu isi ego.
Otu nwoke sị na ọ na-ama ụzọ aga ọrụ maka ego e tinyere n'ọnụego ime njem.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:












