Nigeria Inflation: Ọnụahịa ejirila pasenti abụọ ria elu kamgbe Ọktoba 2019 - NBS

ahịa osikapa na nrị mkpụrụ ibe ya

Gọọmentị site n'aka ndị National Bureau of Statistics (NBS) kwetere n'ezie na ọnụahịa ji ihe dịka pasenti iri na otu na ụma (11.85%) rịa elu.

Nke a pụtara na ọnụahịa ejirila ihe ruru pasenti 0.24 ria elu kamgbe ọnwa ọktoba afọ 2019.

Ndị ọrụ a kwuru nke a n'akwụkwọ ha kpọrọ 'ITS Consumer Price Index (CPI) and Inflation' nke ha wepụtara n'ọnwa Nọvemba 2019.

Dịka Ekeresimesi na-atụnye ụkwụ ihe oriri ụfọdụ arịala ọnụ ebe ụfọdụ dara ada.

Ebe gọọmenti na ndị ọrụ ugbo na aṅụrị n'ọnụahịa osikapa rịrị ọnụ ugbua maka okeala Naịjirịa e mechiri, ndị na-azụ azụ na-eti mkpụ na ọnụahịa nrị dị oke ọnụ.

ahịa osikapa na nrị mkpụrụ ibe ya

Ebe foto si, AFP

Nke a mere BBC Igbo ji gbawa ndị mgbere osikapa ajụjụ ọnụ ịmata ka ihe siri kwuru n'ahịa osikapa, iji maa atụ.

Toyin Lawal bụ onye na-ere ahịa nri n'Enugwu ji Igbo kọwa ihe ọ na-eri ha na-ere osikapa site kemgbe Jenuwarị.

Aha onyonyo, Christmas Day: Kedụ ka ahịa Ekeresimesi si ada n'ogbe gị?

Toyin sị na Jenuwarị ruo na Maachị ha rere akpa osikapa puku naira iri (N10,000) nke gbara narịa iri ise n'otu iko.

N'ọnwa Apreelu ruo Mee, ha rere otu akpa osikapa puku naịra iri na atọ ruo iri na anọ (N13,000 - N14,000) bụ nke gbara naịra iri isii maọbụ iri asaa n'otu iko.

Ebe ahụ ka o si rigoo puku naịra iri na anọ na Seputemba.

Mgbe ọnwa Nọvemba ruru, akpa osikapa ruru ọnụ puku naịra iri na isii.

Ebe ahụ ka o si ruo ebe ọ nọ ugbua bụ puku naịra iri na asatọ kwa otu akpa.

Nke a bụ ọnụahịa osikapa Naịjirịa, ebe nke ofesi nọ na puku naịra iri abụọ na anọ otu akpa (N24,000).

Lee ihe nkiri a

Aha onyonyo, Christmas Day: Kedụ ka ahịa Ekeresimesi si ada n'ogbe gị?

Akụkọ ga-amasị gị