Victor Ezugwu: Onye bụ dike a rụpụtara ụgbọagha MRAP mbụ na Naịjirịa?

Ebe foto si, Nigeria Army/Twitter
Dike Igbo aha ya bụ Victor Okwudili Ezugwu edebaala aha ya n'akwụkwọ akụkọ Naịjirịa ruo ụwatụwa.
Ezugwu bụ onye ọchịagha n'otu ndị agha Naịjirịa.
Ọ kpaala ike di egwu tụmadị n'ọgụ Naịjirịa na-aluso ndị otu oyiegwu Boko Haram.
Mana n'ọdị nso a ka o mere ihe nyịrị dike di icheche omume.
Ezugwu rụpụtara ụgbọala e ji aga ọgụ bụ nke a kpọrọ Ezeugwu MRAP (Mine-Resistant Ambush Protected).
Ụgbọala a bụ anwụ anwụ maka na mgbọ egbe maọbụ ogbunigwe agaghị emebinwu ya.

Ebe foto si, Twitter/@NGRPresident
Nke a bụ nke mbụ a na-arụpụta ya bụ ụgbọala na Naịjirịa.
N'ụbọchị Wenezdee ka onyeisiala Muhammadu Buhari meghere ya bụ ụgbọala n'ogige ebe ndị agha na-arụpụta ihe nke dị na Kaduna.
Mana onye bu Ọchịagha Victor Ezeugwu?

Ebe foto si, Nigeria Army
Victor Okwudili Ezugwu bụ onyeisi ụlọọrụ 'Defence Industries Corporation of Nigeria" (DICON).
A mụrụ ya n'afọ 1964 n'ọnwa Jun ebe ọ banyere Nigeria Defence Academy n'afọ 1985.
Lee ihe ndị ọzọ i kwesịrị ịma maka ya:
- Ọ gụrụ 'History' na 'Nigerian Defence Acedemy' dị na Kaduna, mechaa ga gụkwa 'Strategic Studies' na Mahadum Ibadan
- O ji asambodo ọkankụzị nke Bekee kpọrọ Ph.D
- Ọ gakwara ọtụtụ ọzụzụ ndị ọzọ na Naịjriịa ma n'ala Bekee
- Ọ bụbu onyeisi 28 'Task Force Brigade' nakwa osote onyeisi '7 Division'
- Ugbua Ezeugwu bụ onyeisi Nigerian Army Vehicle Manufacturing Company (NAVMC) nke dị na Kaduna
Ndị a bụ nzere ndị o ji:
- FSS MSS DSS psc Golden Jubilee Medal CM Fd Comd Medal of honour
- General Operations Medal ECOMOG in Liberia (NIBATT 11)
- Op TIGER TAIL/ SAND STORM in Sierra Leone (NIBATT 33)
- UNAMSIL na Op ZAMAN LAFIYA DOLE na ndị ọzọ.
N'aka ọzọ, ọ nwere mgbe o wuru na ọ bụ otu nwoke a kpọrọ Emmanuel Ezugwu rụrụ MRAP ahụ.
Mana ndịagha Naịjirịa pụtara kọwa ya nke ọma.













