Ndịagha Naịjirịa anwụchiela gwogworo ato bu mgbọ

Ndị agha Naịjirịa na-ebuso Boko Haram agha

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndịagha Naịjirịa nọ ọrụ nchekwa na Plateau, Benue na Steeti ndi ọzọ

Ndịagha Naịjirịa nwụchịrị gwogworo atọ bu mgbọ esi mba Bene ebụbata Naịjirịa.

Na akụkọ General Olaniyi Olatunde, gwogworo atọ a bu mgbọ ruru narị puku atọ. Mgbọ ndị a bụ nke egbe a na-akpọ "pump action" na Bekee.

Olatunde sị na ndị nya gwogworo ndị a gbara ọsọ mana ndị nchekwa na-agba mbọ ị nweta ha.

Ka ọ na-egosi ndị ntaakụko ụgbọala ha nwụdere, Olatunde kwuru na ọ bụ site na ama agbara ha ka ha si nweta gwogworo ndị a bu mgbọ.

O kwuru: "Ndị Naịjirịa ihe ọma na-adi mma gbara anyị ama ka anyị na-arụ ọrụ nchekwa. N'ụbọchị Mee 30, n'ime abalị, ndịagha gunyere ndị uweojii na ndi nchekwa ndi ọzọ nwụchịkọrọ gwogworo atọ a n'obodo akpọrọ Balogun dị n'ụzọ Igbogila-Ilara n'Ogun steeti.

"Mgbọ di n'ụgbọala ndị a dị n'ime akpati emechiri ọfụma. Ndị nya ugbọala ndị a gbara ọsọ mgbe ha hụrụ ndiagha. Anyị na-achọ ha, ma na-emekwa nyocha banyere ndi aka ha dị na ya bu mgbọ atubatara."

Cheta na ndị na-arụ ọrụ gbasara ihe ahịa na-abata Naịjirịa akpọrọ "Customs" na Bekee nwụchịkọrọ ọtụtụ egbe "pump action" esi mba ofesi tụbata Naịjirịa na-afọ gara aga.