Abba Kyari Police: 'Anyị ebidola nnyocha ebubo nrụrụaka 'Hushpuppi' boro ya'

Ebe foto si, Abba Kyari/Hushpuppi
Ndị uweojii Naijirịa ekwuola na ha ebidola nnyocha maka ebubo ngalaba nyocha mba Amerịka bụ 'Federal Bureau of Investigation' boro otu oyeisi uweojii Naijirịa bụ Abba Kyari nke kwuru na onye omekome ama ama bụ Raymond Abbas eji Hushpuppi mara kwuru na ọ nyere Kyari ego ruru otu nde dọla na ụma ka omekpaa otu onye ahụ.
Dịka akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Naijirịa bụ Frank Mba kwuru na onyeisi ndị uweojii na Naijirịa bụ Alkali Baba enyela iwu ka ha bido nyocha imeụlọ maka ya bụ ebubo.
Ya bụ akwụkwọ ozi kwukwara na ndị uweojii Naijirịa kwadoro ikpe zịrị ezi ma kwuo kwa na ha ga-eme ihe ha kwesịrị iji hụ na ọdịmma ha na ndị FBI nọ mma.
Marakwa na akwụkwọ ozi ndị uweojii Naijirịa pụtara dịka ngalaba 'US Department of Justice' nyere iwu ka a nwụchie osote Kọmịshọna ndị uweojii na Naijirịa bụ Abba Kyari.
Thom Mrozek bụ onye-ahụ maka mgbasa ozi 'US Department of Justice' kwuru na ha chọkwara ka a nwụchie mmadụ abụo ọzọ ha sịrị na-enyere Abbas aka n'ohi ịntanet ha na-ebo ya ebubo.
Mrozek kwukwara na obi siri ha ike na mmadụ abụọ a ka nọ n'Afrịka.
Kama Mrozel kwuru na ya agaghị aza ajụjụ ndị BBC jụrụ ya ma ha a ga-achọ ka akpọta Kyari Amerịka ka ekpee ya ikpe.
Ebubo a na-ebo Abba Kyari
- Ngalaba Department of Justice nke mba Amerịka na-ekwu na Hushpippi gwara ha na o nyere Abba Kyari aka azụ otu nde dọla na ụma ka ọ jiri ya nwuchie onye otu ya n'ọrụ omekome bụ Kelly Chibuzor Vincent dịka ha nwere nhọtaghe.
- Na Kyari bịara Dubai n'ọnwa Sepụtemba afọ 2019 ebe ọkwa ụgbọala Hushpuppi gara bute ya.
- Na Kyari mere ka anwụchie Vincent ma zịgara Hushpippi foto ebe anụchịrị ya bụ nwoke
- Ọzọ bụ na Kyari zịgara Hushpuppi akara ọbaego ọ ga-eji kwụọ ya ụgwọ aka azụ maka nwuchi Vincent.
Abba Kyari agọọla na o nweghi ego ọ naara Hushpuppi

Ebe foto si, Abba Kyari /Hushpuppi /Instagram
Abba Kyari bụ Osote komishona ndị uweojii Naijiria a ma ama ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ọ naara Ramon Abbas bụ onye aha otutu ya bụ 'Hushpuppi' aka azụ.
Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na ụlọikpe mba Amerịka nyere iwu ka a nwuchie Kyari ka ọ zara ọnụ ya n'ebubo ahụ.
Ha sị na Hushpuppi nyere Kyari ego ka ọ nwụchie Vincent Chibuzo bụ onye ya na Hushpuppi kpara nkata wee gwuo mmadụ wayo ruru nde kwuru nde dọla ( $330,000) maka na ịchọ ịgba Huspuppi n'anwụ.
Dịka akwụkwọ ụlọikpe nke ụlọntaakụkọ People's Gazette gbara n'anwụ siri kwuo, Hushpuppi na mmadụ ise ndị ọzọ gụnyere Chibuzo Vincent gwuru otu onye ojiegoachu ego chamdum sị ya na ha bụ ndị ọrụ ụlọakụ nwere ike ibinye ya ego ịrụ ụlọakwụkwọ na mba Qatar.
Ndị a na-enye maka ị kpa ajọ agwa ahụ gụnyere; Rukayat Fashola, Bolatito Agbabiaka, Yusuf Anifowoshe bụcha ndị Naijiria na Abdulrahman Juma, nwa afọ Kenya.
Dịka nghọtahie dapụtara n'etiti ha, Chibuzo majara Hushpuppi na ya ga-agba ya n'anwụ n'aka onye ojiegoachuego ahụ ha napụrụ ego nke mere Hushpuppi jiri sị Abba Kyari nwuchie ya.

Ebe foto si, Abba Kyari/Facebook
Mana Abba Kyari kwuru na aka ya dị ọcha.
N'ozi o wepụtara ụbọchị Friade n'akara Facebook ya, onye uweojii ahụ a na-anụ aha ya kwuru na afọ abụọ gara aga Hushpuppi wetara ya mkpesa na o nwere nwoke na-eyi ezinaụlọ ya egwu, chọrọ igbu ha.
Ọ gara n'ihu kwuo na ha nwụchiri nwa amadi ahụ, mechaa nnyocha ma tọhapụ ya na anaghị ya ego ọbụla.
Ọ sịrị, "Abbas kpọrọ anyị afọ abụọ gara aga sị na o nwere onye na-ekwu na ọ ga-egbu ndị ezinaụlọ ya na Naijiria,zitere anyị akara ekwentị ya."
" Anyị nwuchiri ya mee nnyocha were hụ na onye ahụ bụ enyi ya maarala ogologo oge, nke ya na ya nwere esemokwu ego nke mere ka anyị tọhapụ ya.
" O nweghị onye sịrị Abbas weta ego, o nweghị onye nara ya ego."

Ebe foto si, Abba Kyari
Mana Kyari kọwara na o nweela oge Hushpuppi zitere ya ozi na o nwere uwe o ti masịrị ya, ya maziere ya onye ọkwa akwa kwara ya ahụ nke o zigara ego dị puku nari atọ maka ịkwara ya akwa.
Kyari gara n'ihu sị, "Maka ndị na-anụ anyị maka akụkọ na-arụ anyị aka, aka anyị dị ọcha" .
Cheta na ndị uweojii mbaụwa 'Interpol' nwụchiri Hushpuppi (bụ onye na-ewu ewu n' Instagram maka igosi akụ; akwa, akpụkpọụkwụ, elekere aka na ihe ndị ọgalanya ndị ọzọ) na Dubai n'ọnwa Juun,afọ 2020.
Ha kpụpụrụ ya ụlọikpe Amerịka maka igwu otu ojiegoachụego chamdum ruru nde kwuru nde dọla site na ịntanet.
Ndị isi uweojii eborola ebubo nrụrụaka na ndị ikpe mara
1) Mustafa Adebayo Balogun

Ebe foto si, Getty Images
N'afọ 2005 ka ngalaba Electronic and Financial Crimes Commission nwụchịrị Tafa Balogun bụ onyeisi ndị uweojii oge ahụ.
Kama Balogun kwụsịrị ọrụ osugbo osugbo ndị EFCC wepụtara ebubo ha.
Atụrụ ya nga ọnwa isii.
2) Fidelis Oyakhilome
Oyakhilome bụ onyeuweojii bụ onyeisi ngalaba National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) site n'afọ 1988 ruo afọ 1991.
Achụrụ ya n'ọrụ dịka a eboro ya ebubo na ya na Jennifer Madike onye anụchịrị maka ihe gbasara mgbere ọgwụike.
Madike kwuru na ọ chọrọ ịnye Oyakhilome dọla puku iri asatọ ka ọ were kpọpụta ụmunwoke abụọ anwụchiri maka ibu ọgwụ ike.
3) George Iyanu
Anwụchịrị DSP George Iyamu n'afọ 1986 na Bini.
Anwụchịrị ya maka ebubo na ọ bụ ya na-enye ndị ojiegbe ezu bụ Kawrence Anini na Monday Osunbor egbe ha ji ezu ohi ma na-egbe mmadụ.
Agbagburu ya na Anini na Osunbor n'ọnwa March 1987.











