Sefer Torah arrest: A tọhapụla ndị Isreal atọ mana ọ fọrọ nne anyị so ha, ọ ka nọ na mkpọrọ DSS- Solomon Maduako

Ebe foto si, Solomon Yaakov Maduako
Akụkọ na-ekwu na a tọhapụla Noam Leibman, Rudy Rochman na Edouard David Benaym bụ ndị mba Israel na-eme ihe onyonyo a nwụchiri na Naijirịa, mana nwaanyị Naijirịa bụ Lisbon Agha a nwụchịrị ya na ndị a ka nọ na nga.
Ụlọ ntaakụkọ Times Of Israel depụtara na atọhapụrụ ndị Israel ahụ ma nyefee ha n'aka ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka.
Ha depụtakwara na enyekwara ha akwụkwọ njem ha na ekwentị ha tupu ha alawa.
Dịka ọ dị ugbua, ha abanyela ụgbọelu ha gawa mba ha bụ Israel.
Kama, onye na-ahazị ndị Ntoroọbịa nke National Jewish Council bụ Solomon Yaakov Maduako mere ka anyị ghọta na atọhapụbeghi Lisbon Agha bụ otu ndị na-ahazị Black Jews Association International.
O kwuru na kamgbe anwụchịrị Agha na ha ahụbeghị ya.
Maduako kwuru sị, "Anyị na-atụ anya na ugbua atọhapụrụ ndị mba Israel atọ na anyị nwereike ịleta Agha".
O kwukwara na Judaism na ọchụchọ Biafra abụghị otu ihe, o kwuru sị, "Anyị anọọrọla kamgbe tupu ọchụchọ Biafra ebido".

Ebe foto si, wewereneverlost.com/Screengrab
Cheta na anwụchịrị ndị a n'ụbọchị itolu nke ọnwa Julai afọ 2021 ebe a tọhapụrụ ndị nke mba Israel n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Julaị afọ 2021.
A nwụchịrị ndị a ma jide ha ruo ụbọchị iri abụọ, cheta na o teghịaka ụbọchị olenole ndị Gọọmentị Naịjirịa anwụchiri Nnamdi Kanu.
Akwụkwọ ozi ha depụtara ka ha kwuru na akpọchiri ha na obere ọnụ ụlọ nga, ha rahụrụ n'ala ma ekweghị ha saa ahụ maọbụ gb.anwee uwe ha.













