'Gọọmentị Naijirịa anwụchiela Rudy Rochman onye Israel butere Sefer Torah na Naijirịa'

Ebe foto si, wewereneverlost/IG
Otu n'ime ndị Rudy Rochman chọrọ bia Naijirịa ekwuola na gọọmentị Naijirịa anwụchiela Rudy Rochman na ndị mba Israel ọzọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijirịa n'ụbọchị Frịde.
Onye a gwara BBC Igbo na ọ bụ n'obodo Ogidi ka anwụchịrị ha.
Onye a na-achọghị ka a kpoọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu ma sịkwa na anwụchịrị ha iji mata ma e nwere ihe jịkọrọ ndị a na ndị Ipob.

Ebe foto si, Rudy Rochman Facebook Page
Onye a kwuru na Rudy Rochman bụ onye na-eme ihe ejije maka ndị Jew n'ụwa niile.
O kwuru na ha biara ka ha mata maka ndị Igbo na mba ndị ọzọ n'Afrịka.
O kwuru na ya na onye nnochite anya mba Israel kpara were kwuo na ya bụ ihe bụ mparịta ụka dị n'etiti mba Israel na mba Naijirịa.
Onye ahụ kwukwara na n'oge na-adịghị anya na a ga-ahapụ ha.

Ebe foto si, Rudy Rochman Facebook Page
BBC Igbo kpọtụrụ gọọmentị ka ha tinye ọnụ na ya bụ okwu, A kpọtụrụ Garba Shehu bụ onye ndụmọdụ onyeisiala pụrụiche maka mgbasa ozi n'ekwe ntị ya kama ọ nabataghị ọkpụkpọ anyị.
BBC Igbo kpọtụkwara Femi Adesina bụ onye ndụmọdụ pụrụiche onyeisiala Naijirịa na ihe gbasara mmekọ ọha na mgbasa ozi bụ Femi Adesina kama ọgaghị.

Ebe foto si, wewereneverlost.com/Screengrab
Akụkọ ka na-abịa









