Tracy Zille: Onye bụdị Tracy Zille a ndị Nigeria kpụ n'ọnụ na soshal midia?

Ebe foto si, TRACY ZILLIE/TWITTER
Kemgbe o wepụtara na nsonso a ozi ndị e nwere ike ịkpọ 'ikpu nkata n'ihu gwa eze okwu' nke metụtara ndị isiojii Afrika na ndị ndu ha, aha @TracyZille na-ewu na Twitter na Naijiria nakwa Afrịka niile.
N'ozi o wepụtara n'ụtụtụ Wenezde, abali isii nke ọnwa Jenụwarị afọ 2020, Tracy Zille kwuru na "ndị ndu Afrịka na-aga ụlọọgwụ ala Bekee. Ọ bụrụ na e mepụtara ọgwụ mgbochi n'Afrịka, ndị ndu Afrịka ga-ahapụ ya gawa Alabekee ịga gba ọgwụ mgbochi."
Ọ gara n'ihu kwuo na ọrịa Covid-19 bụ ihe ncheta na ndị mpụ na-edu Afrịka enweghị mgbe anya ha dị n'ọganihu Afrịka.

Ebe foto si, Tracy Zille
Okwu ahụ dịka ịwasara ahụhụ nnu Bekee dịka ọtụtụ ụmụ Afrịka ruru otu puku tinyere ọnụ n'okwu akụ , ebe ndị ọzọ kekọrịtara ya na-egbughị oge.
Ihe ndị mmadụ na-ajụ bụ onye bụ 'nwaaanyị' a obi kara ịkpọ okwu aha na atụghị ụjọ ọbụla ịgwa ndị isiojii Afrịka ebe ha si adajọ n'okwu mmepe obodo na ọganihu mpaghara ahụ?
N'akara Twitter ya, naanị ihe ị ga-ahụ dịka nkọwa onye ọ bụ bụ "Aha m bụ Tracy Zille. Nke a bụ ọba ozi m," nakwa foto nwaanyị onye ọcha.

Ebe foto si, Tracy Zille
Mana, na-agbanyeghị na ọ bụ n'ọnwa Juune afọ 2020 ka o mepere ọba ozi ahụ nke e chere n'ọ bụ onye Saụt Afrịka nwe ya, mana ọbaozi ya na-apụ ọkụ dịka o nwere mmadụ puku iri ise na itoolu na ụma isii(59,600 ) na-eso ya na Twitter.
A na-eche na ọ bụ okwu na-ese okwu ọ na-edepụtakarị bụ ihe na-adọtara ya ndị mmadụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Nke a bụ n'ihi na oge ụfọdụ, Tracy Zille na-akwa ndị isiojii emo maka ọnọdụ "ohu" ha nọ na ya n'ihi ihe ndị ndu ha nakwa ndịọcha gbakọtara aka na-eme ha.

Ebe foto si, Tracy Zille
Ngalaba na-ahụ maka ikike dịrị onye na Saụt Afrịka bụ South African Human Rights Commission (SAHRC) kwuru n'afọ 2020 na ha ga-akpụpụ onye nwe ọbaozi Tracy Zille nke ha akpọghị aha ya ụlọikpe maka okwu asị (hate speech).
Mana onye bụdị 'Tracy Zille'
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụta Tracy Zille ka nwaanyị onyeọcha onye Saut Afrika na-agba mbọ maka ọdimma ndị isiojii Afrịka.
Mana ndị ịma ihe ekwe na-akụ na-ekwu na ọ bụghị nwaanyị nwe ọbaozi ahụ, kama ọ bụ ọbaozi adigboroja nke otu onye ndọrọndọtọ ọchịchị Saut Afrịka ji achụ akpa ya.
A na-enyo ọbaozi Tracy Ville dịka nke e ji arata ndị mmadụ site n'ikwu okwu na-akpa oke agbụrụ(Saụt Afrịka bụ ebe oke agbụrụ nnwere ntọala) iji dọta ndị mmadụ gaa na websaiti atọ ebe a na-agbasa ozi maka ịnweta ọrụ iji si na ya rite ego 'Google Adsence' maka mmadụ ole a dọtara na websaiti ahụ.
Ụlọọrụ na-eme nchọpụta maka akụkọ ụgha a kpọrọ 'Africa Check' kwuru na Tracy Zille bụ akara obaozi adigboroja.
AfricaCheck na ụlọọrụ nnyocha miri emi nke Atlantic Council nwe bụ "Digital Forensic Research Lab" (DFRLab) gbara n'anwụ na @TracyZille bụ ọbaozi adigboroja nke otu na-agba onya ego nke otu onye n'ime otu "Economic Freedom Fighters (EFF), nwe."
Economic Freedom Fighters (EFF) otu ndọrọndọrọ ọchịchị mba Saụt Afrịka na-anọghị na gọọmenti nke onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama bụ Julius Malema hiwere n'afọ 2013.
Ewezụga, ịgbasa ozi na-ese okwu,Tracy Zille na-ejikarị akara Twitter ya agbasaozi ọrụ maka ndị na-achọ ọrụ.
'Africa Check' na-akọwa na websaiti atọ ndị Tracy Zille na-adọga ndị mmadụ na ya bụ nke otu nwoke a ma ama mana nwoke ahụ agọọla na o nweghị ihe gbasara ya n'akara Tracy Zille.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
- Eastern Security Network: "Anyị akwadoghi mba ọgụ Nnamdi Kanu na-abara ndị gọvanọ"
- Gịnị ka akpa, abụzụ na nri ndị ọzọ na-eyi ndị mmadụ izizi ndị Igbo na-eri oge gboo na-enye n'ahụ?
- Orji Uzor Kalu akpọọla oku ka APC na PDP nye ndị Igbo ohere na 2023
- Nkwenye ndị Igbo oge gboo banyere ịlọụwa, agwụ, ọgbanje na ihe dị ọzọ metụtara ọnwụ na ndụ
- Igbo Proverbs: I dabanye n'ọnọdụ ndị a, were ilu igbo ndị a kwuo okwu
































