APC, PDP nyenu ndị Igbo ohere na 2023 - Orji Uzor Kalu

Aha onyonyo, Igbere Declaration: Ihe anyị ma maka mkpebi a

Ọ bụ n'ụbọchị Tuzde ka ndị isi ahụrụ kwaba okpu na ndọrọndọrọ ọchịchị si na pati dị icheiche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bịakọtara ọnụ nwee nkwekọrịta gbasara ihe bụ oke ndị Igbo n'ọkwa onyeisiala afọ 2023.

Nkwekọrịta ahụ dịka Orji Uzor Kalu kọwara bụ maka ọdịmma ndị Igbo n'ihe metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.

Ọ bụ nkwekọrịta a ka ha kpọrọ 'Igbere Declaration'.

Mpụtara nzụkọ ahụ bụ na ha ezigaara ndị isi otu APC na PDP akwụkwọ ozi na-akpọ oku ka pati abụọ a nye ndị Igbo ohere ka ha nọchie anya ha na ntuliaka ọkwa onyeisiala 2023.

Otu onye so kpokọba ya bụ nzụkọ bụ Orji Uzor Kalu gwara BBC Igbo na mkparịtaụka ekwentị na ọ bụ mbịakọta ndị ndọrọndọrọ Igbo niile ka ọ bụ.

O kwuru sị "a na-eche na ndị Igbo adịghị n'otu mana ugbua anyị abịakọtala ọnụ kwuo okwu maka ihe a"

"Anyị chọrọ ka o dịrị etu e si mere ndị Yoroba na (ntụliaka ọkwa onyeisiala) afọ 1999."

O ji ohere ahụ kpọọ ndị Igbo niile bi na mba ụwa niile oku ka ha bịa kwụnyere onye ọbụla ga-apụta zọọ ya bụ ọkwa onyeisiala.