Orji Uzor Kalu : Ihe m ga-eme ma e nye m ọkwa onyeisiala

Orji Uzo Kalu

Ebe foto si, Orji Uzo Kalu/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye chịburu Abia Steetị bụ Orji Uzor Kalu ekwuola na ọ bụrụ na ndị Naịjirịa nye ya ohere ịbụ onyeisiala n'afọ 2023, na ọ ga-agbanwe ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa ka ọ bụrụ ọ gbara ọhụrụ.

Kalu sị na ikwu maka ọkwa onyeisiala ugbua bụ imegide onyeisiala Buhari maka na e kwesịrị inye ya ohere ịrụ ihe o kwere na nkwa.

Kama ọ sị na ọ bụrụ na e nye ya ọkwa onyeisiala, na ọ ga-ewe ya makana o tozuru ịrụ ọrụ dị ya n'ime.

Dịka ntaakụkọ 'Sun' si dee, Kalu kwuru nke a mgbe a jụrụ ya ebumnobi ya n'ịbụ onyeisiala n'ụlọọrụ mgbasaozi redio a kpọghị aha ya dị n'Umuahia Abia Steetị.

Kalu sị "Ihe dị m n'obi ugbua bụ ịrụ ọrụ m dịka Sịnetọ nye ndị m na-anọchiteanya ha, mana ọ bụrụ na Naịjirịa chọrọ ka m chịa, ha ga-ezi m aka ha."

Aga m arụnwu ọrụ dị na ya. Aga m ebugharịnwu akụnaụba Naịjirịa ka ọ bụrụ nke ọ gbara ọhụrụ."

Ajụjụ ndị ọzọ Kalu zara gụnyere ọchịchị n'Abia Steetị, oge ya n'ụlọmkpọrọ, ọrụ ọ na-arụ n'ụlọomeiwu Naịjirịa na ndị ọzọ.

Cheta na akụkọ fegharịburu na Fada Ejike Mbaka kwadoro ka Orji Uzor Kalu bụrụ onyeisiala n'afọ 2023 mana Fada Mbaka sị na nke a bụ asị.

Fada Mbaka ekwuola na enweghi mgbe o ji sị na Orji Uzor Kalu ga-abụ onyeisiala na 2023

Fada Mbaka

Ebe foto si, Facebook/AMEN

Fada Ejike Mbaka bụ ụkọchukwu na-achịkọta Adoration Ministries n'Enugwu steeti ekwuola na okwu na-efegharị na ọ sị na Orji Uzor Kalu ga-abụ onyeisiala Naịjiria n'afọ 2023 bụ mbada asị.

Mbaka kwuru sị na ọ bụ ndị iro ya, "ndị ekwensu ji akwara ngwaọrụ" na-efesasị akụkọ ụgha a iji mechuo aha ya.

Mbaka dọrọ ha aka na ntị sị na iwe Chineke ga-adakwasị ha na ezinaụlọ ha ma ọ bụrụ na ha akwụsịghị ifesasị "akụkọ ụgha" ahụ.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Cheta na Fada Mbaka kwuru na ụfọdụ ndị gara nga na Naijiria dika Orji Uzor Kalu, agatala ihe ọma.

Fada Mbaka kwuru nke a dịka o bidokwara ekpere Adoration ya ọ kwụsịrị mgbe mkpamkpa ọrịa coronavirus mechiri ya, taa bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Julaị.

Ụbọchị a dabakwara n'ụbọchị mere ya afọ 25 e chiri ya ụkọchukwu.

Na-ataghị okwu arụ, o kwuru na ọtụtụ ndị gara ụlọmkpọrọ na Naijiria gatara ihe ọma ebe ụfọdụ n'ime ha pụtara bụrụ eze.

O kwuru na Orji Uzor Kalu zitere ya ozi ekele na ya agbaala afọ 25 n'ọrụ ụkọchukwu, ma kwuo na mkpọrọ ya bụ nwoke gara ga-ebutere ya ihe ọma.

O jiri ndị chịburu Naijira dịka Olusegun Obasanjo, onyeisiala Muhammadu Buhari nakwa Joseph nke Akwụkwọ Nsọ maa atụ, wee kwubie na ịga mkpọrọ bụ otu ụzọ esi eme mmadụ eze.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: