Mwakpo Ekweremadu: Ikpe mmadụ abụọ 'so wakpoo' Ekweremadu ga-abụ n'ụbọchị 15 nke ọnwa Sepụtemba 2020

Ekweremadu

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Miriam Knetzger bụ osote ọnụ na-ekwuru ụlọikpe dị na Nuremberg (nke Bekee kpọrọ "Nürnberg Higher Regional Court") agwaala BBC na mmadụ abụọ rịọrọ mkpeghara banyere ikpe mara ha na aka ha dị ịwakpo Sinetọ Ike Ekweremmadụ ga-ezute ọkaikpe n'ụbọchị 15 nke ọnwa Sepụtemba 2020.

Knetzeger dọrọ anya na ikpe amaala ndị a nke butere ịma ha nha, mana ha riọrọ mkpegharị.

Mmadụ abụọ ndị ọzọ arịọghị mpkegharị.Cheta na ụlọikpe a adaala ndị a nha maka mwakpo onye omeiwu bụ Ike Ekweremadu n'obodo Nuremberg n'afọ 2019.

Ihe a mere dịka Ekweremadụ gara mba Jamini maka emume iri ji ndị Igbo bi na mba ahụ mere.

N'ozi ha ziteere BBC, ha kọwara na ha nyochara ihe mere ọfụma tupu a kpụpụ ndị a ụlọikpe ma daa ha nha.

Ozi ahụ kwukwara na mmadụ abụọ n'ime ndị ahụ na-eme mkpesa maka nha adara ha.

Amabeghi nha ego ole adara ndị a mana ozi ahụ kwuru na ọ bụ ụbọchị iri abụọ ka ha ji akwụ ya bụ ụgwọ.

Rebecca Übler bụ onye ziteere BBC ozi banyere okwu sị na ụlọikpe amala mmadụ abụọ ikpe dịka ikpe mmadu abụo ọzọ ka na-aga n'ihu makana ha riọọrọ arịrọ mkpegharị maka nha a adara ha.

Übler sị na nha ndị a ga-akwụ bụ "nke kwa ụbọchị ruo ụbọchị 20" n'otu n'otu.

Mwakpo ekweremadu

Ebe foto si, Facebook

Mgbe BBC kpọtụrụ Ekweremadu ịnụ olu ya gbasara okwu a, onye na-ekwuchitere ya bụ Uche Anichuwku kwuru sị; ""achọghị m ikwu ihe ọbụla gbasara ya bụ okwu n'ihi na anyị echefuola ya bụ okwu kamgbe n'ihi na Senator kwuru na ya agbagharala ha".

Cheta na ndị uweojii n'obodo Nuremberg na Jamini nwụchiri mmadụ anọ maka ebubo mwakpo Ike Ekweremadu n'emume iri ji na mba ahụ .

Lee ihe onyonyo gosiri etu mwakpo ahụ siri mee:

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Etu ị ga-esi pụta n'arịrị maka ọnwụ onye ị hụrụ n'anya