Lion Heart: Ejije Genevieve Nnaji wepụtara nwere ike ituru ugo 'Oscar'

Ebe foto si, Instagram/genevievennaji
Ihe ejije nke nwaada Igbo bụ Genevieve Nnaji mepụtara aha ya bụ 'Lion Heart' nwere ike ituru ugo 'Oscar'.
Otu a kpọrọ 'Nigerian Oscars Selection Committee' (NOSC) bụ ndị họpụtara ejije a ka o soro na ndị a ga-atule maka nturuugo 'Oscar'.
'Lion Heart' bụ ejije maka onye ọgaranya nwere ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọala.
Mgbe ụlọọrụ ahụ chọrọ imechi n'ihi ụgwọ ha ji otu ụlọakụ, ada ọgaranya ahụ gbalịrị ike ya iji hụ na-emechighi ya.
Otu n'ime ihe mmụta dị n'ejije a bụ na nwanyị bụ ihe.
Ndị a ma ama dịka Genevieve Nnaji, Pete Edochie, Nkem Owoh, Kanayo Kanayo na oti egwu Phyno socha mee ya bụ ejije.
Buhari agaala Saụt Afrịka

Ebe foto si, Twitter/Bashir Ahmed
Onyeisiala Muhammadu Buhari ahapụla Naịjiria taa bụ Wenezde gawa Saụt Afrịka.
Njem a bụ ka ya na onyeisiala mba ahụ bụ Cyril Ramaphosa tinye ọnụ n'okwu gbasara 'Xenophobia'.
Ndị so Buhari mee nje m gunyere gọvanọ Kano steeti, Umaru Ganduje, Dave Umahi nke Ebonyi nakwa Simon Lalong nke Plateau.
Cheta na ndịisiala abụọ ahụ bu ụzọ zigara onwe ndị ozi gbasara ya bụ okwu.
A na-atụ anya na nzute Buhari na Ramaphosa ga-eweta okwu ịkpa oke agbụrụ n'isi njedebe maka na o si taa dịwa mma ọ dịwara gboo.
Tambuwal na Ganduje enwetala mmeri

Ebe foto si, TWITTER/@DAWISU
Ụlọikpe ntuliaka na Kano Steeti eweliela gọvanọ Umar Ganduje aka elu.
Ha kwuru na ọbụ Ganduje tuuru ugo n'ezie na ntuliaka oche gọvanọ e mere n'ọnwa Mach afọ a.

Ebe foto si, Tambuwal/Facebook
N'otu aka ahụ, ụlọikpe ntuliaka nke Sokoto steeti kpebikwara na ọbụ Aminu Tambuwal meriri ntuliaka gọvanọ steeti ahụ taa.
Ikpe ahụ dị n'etiti gọvanọ Aminu Tambuwal nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' na Ahmed Aliyu nke otu 'All Progressives Congress'.
N'ofesi
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mba Amerịka amachiela ntụbata ọla dayamọnd site n'obodo Zimbabwe.
Iwe ha bụ na Zimbabwe na-amanye ndị mmadụ amanye ịrụ ọrụ n'ebe a na-egwuputa 'diamond' ndị ahụ.
Mana ndị ọchịchị Zimbabwe kwuru na Amerịka asigbuola onwe ha n'asị, maka na onweghị onye ha manyere ka ọ rụọ ọrụ ebe ahụ.
Jamal Khashoggi

Taa ka o mere otu afọ e ji gbuo Jamal Khashoggi onye ntaakụkọ si mba Saudi Arebia.
N'ụbọchị Wenezdee, ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ n'ihu ụlọ embasi ndị Saụdi Arebia nke dị na mba Tọkị.
Ọ bụ n'ime embasi ahụ ka a nọ gbuo Khashoggi n'afọ gara aga.
Hatice Cengiz, onye Khashoggi chọbụrụ ịlụ, na-akpọ oku ka ejide ndị gburu ya ma maa ha ikpe.
A na-ebo ọkparaeze ndị Saudi Arebia bụ Mohammed bin Salman ebubo na aka ya dị n'ọnwụ Khashoggi.
Mana ọ gọrọla ọnụ ya na aka ya adịghị ya.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Twitter/Champions League
Asọmpi UEFA Champions League ka na-agakwa n'ihu.
Otu egwu bọọlụ Liverpool, Chelsea, Barcelona, Inter Milan na ndị ọzọ ga-apịrị ya n'abalị taa
N'asọmpị nke ụnyaahụ, Bayern Munich ji goolu asaa asatara abụọ saa Tottenham ahụ.
Manchester City meriri Dinamo Zagreb 2-0, Real Madrid na Club Brugge gbara onwe ha 2-2.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










