Asari Dokubo : Nnamdi Kanu zọọrọ okwu Biafra ka ọ bụ nke naanị Igbo

Asari Dokubo na Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Asari Dokubo

Asari Dokubo bụ onye ama dịka onye ndu otu ndị agha nnupuisi ndị Niger-Delta akatọọla onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu maka etu o si achụ nnwereonwe biafra.

Dokubo, onye kpọrọ Nnamdị Kanu 'okpokoro isi', katọrọ ya maka ihe ọ kpọrọ ime okwu Biafra okwu ndị Igbo ma gụpụ ndị Ijaw.

Ọ sịrị na a chọwa achọwa na ọ bụ ala Ijaw bụ ebe 'Bight of Biafra' bụ ebe ya bụ aha 'Biafra' siri pụta, na ọ bụ ndị Ijaw bụ ha nwe Biafra n'ezie.

Dokubo, onye ndu otu 'Biafra de facto Customary Government' kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọntakụkọ Arise TV nwere ụbọchị Wenezde.

Asari Dokubo

Ebe foto si, Asari Dokubo/Facebook

Asari bụ onye gbadoro ụkwụ n'akwụkwọ Isaac Boro dere ọ kpọrọ 12-Day Revolution', sịrị "Nnamdi bụ okpokoro isi. Ọ chọrọ ime okwu Biafra okwu ndị Igbo."

"Ijaw bụ Biafra. E kere Ijaw ụzọ abụọ; 'Bight of Benin' na 'Bight of Biafra.'"

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu anaghị achụ maka nnwereonwe Biafra - Asari Dokubo

"Biafra bụ aha Ijaw. Ọ bụ Anyị bụ ndị nwe Biafra. Ebe a na-akpọ Biafra bụ ndị Ijaw na obere ndị Ibibio na ndị Ọrọn nwe ya."

"N'afọ 1967, ndị Eastern Ijaw nọbụ n'Mpagara Ọwụwa Anyanwụ ochie (old Eastern Region)."

" Oge a kpọrọ Ọgbakọ 'Eastern Consultative Forum' n'Enugwu ebe Francis Opigo, nwoke Ijaw kporo oku ka e weghara aha Biafra dịka aha a ga- akpọ mba ọhụrụ"( a na-achọ ikewapụta na Naijiria), e were okwu ya."

Aha onyonyo, 'Asari Dokubo enweghị ike imegheri anyị anya n'inweta Biafra'- Ipob

"N'abalị 30 nke ọnwa Mee afọ 1967, a kwupụtara mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ochie (old Eastern Region) aghọọla Biafra nke gụnyere Ọwụwa Anyanwụ Ijaw."

Ọ gara n'ihu kwuo na "Biafra enweghị ihe jịkọrọ ya na Igbo. Biafra bụ obodo niile dịbu n'ebe ndị ọchịchị Briten kewapụtaburu kpọ ha 'Eastern Region nke Naijiria.'"

Kedụ ihe na-esere gị na Nnamdi Kanu?

Nnamdi Kanu na Asari Dokubo

Ebe foto si, Getty Images/Asari Dokubo/Facebook

O kwuru na ọ bụ ime ka okwu Biafra abụ sọsọ nke ndị Igbo nakwa isi na ndị Biafra bụ ndị Juu bụ iwe ya nakwa na a ga-enwe .

Ọ sịrị na "Nnamdi Kanu were aha anyị kpara naanị ya, ọ bụghị nke naanị ya".

" Nnamdi Kanu bụ okporo isi. Nnamdi chọrọ Biafra Igbo, iwere ihe dịrị anyị niile sị na ọ bụ nke naanị ndị Igbo."

"Nnamdị sị na ndị Biafra sị na ndị Juu. Abụghị m onye Juu. Akarịrị m ndị Juu."

"Ọ sịrị na Islam agaghị adị na Biafra."

Dokubo kwuru na o nweghị okwu gbasara ya na Ipob mana e kwube okwu Biafra na ya so na ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị: