Obi Cubana: Ihe ị kwesiri ịma maka nwa amadị a na-ewu ewu

Obi Cubana

Ebe foto si, obi_cubana/IG

Nwa amadị a bụ Obi Iyiegbu nke e ji aha "Obi Cubana" mara bụ onye oji ego achụ ego nwere ọtụtụ ụlọ ezụmịke na kwa ụlọ ịgba abalị ndị ọzọ dị ịche ịche na mpaghara Legọs, Abụja na kwa Owere.

Ọ dị afọ iri anọ na isii, ya na nwunye bụ ọkaiwu Ebere Iyiegbu ji ụmụ anọ. Agbam akwụkwọ ha eruola afo iri na atọ.

Obi Cubana

Ebe foto si, Obi Cubana/Instagram

Nwunye ka na-ere ụlọ na Legọs.

Nne Obi Iyiegbu bụ Ezinne Uche Iyiegbu gbara afọ iri asaa na asato, olili ozu ya bụ n'ụbọchị Sọnde na bia abia na mpaghara be ya nọ na Aboji, Oba, Anambara Steetị.

Dịka Obi Cubana bụ onye a ma ama olili ozu asarala ọkụ n'ọnụ ndị mmadụ ka ndị ọzọ a ma kwa ama n'ezitere ya onyinye, ọzị nkasi obi na ọnwụ nne ya na kwa ndị ọzọ na-ekwe nkwa i bia gbaru nakwa olili ozu nne ya.

Olili nne Obi Cubana na ihe mere ehi jiri dị mkpa

Otu n'ime akụkọ n'ewu na soshal midịa bụ etụ olili ozu nne Obi Iyiegbu eji Obi Cubana mara si dọtara ya onyinye ehị nari abụọ n'ụma nke gụnyere ehi iri anọ na isii onye otu a na akpọ "Cubana High Priest" nyere ya.

Ihe tụru ọtụtụ mmadụ n'anya ọkachasi ndị ntoroọbịa na-ajụ uru ehi bara eji akpụnye onye na-eme akwamozu ya na ọkankụ.

Nke mere anyị jiri were sị na ọ dị mkpa itinye anya na ya were rotere ha uru ihe bara n'omenala Igbo.

Obi Cubana na-ewusike díka o nwetere onyinye ehi púrúiche maka akwamozu nne ya

Ebe foto si, Obi Cubana

Nkọwa foto, Obi Cubana na-ewusike díka o nwetere onyinye ehi púrúiche maka akwamozu nne ya

Lee nkọwa ya na nwa nkenke ebe a.

Ihe ehi jị dị mkpa na mmemme ndị Igbo:

Iji oke anụ lie mmadụ n'ala Igbo na-egosi na onye ahụ a na-eli dị mkpa, maọbụ na ọ bụ onye a ma ama, maọbụ onye kara ezigbo nka, maọbụ na o chiri echichi pụrụ iche.

Eji ehi, ewu maọbụ atụrụ edu onye ahụ ala mụọ ụzọ.

Obi Cubana na-ewusike díka o nwetere onyinye ehi pụrụiche maka akwamozu nne ya

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ezinaụlọ onye a na-eli, ndị enyi ya kwa ndị agbata obi ya na-agbakọta butere ya onyinye anụ dị ịche ịche, ka aka si ruru ha.

Ndị aka erusighi ike na-eji ọkụkọ ole na ole lie ozu.

Cubana Chief Priest nyere Obi Cubana ehi iri ano na ise

Ebe foto si, Cubana Chief Priest

Nkọwa foto, Cubana Chief Priest nyere Obi Cubana ehi iri ano na ise

Dịka anụ ehi gbara oke abụba, a na-eji ya eme mmeme olili ozu, igba akwụkwọ, ichi echịchị na kwa mmeme ndị ozo.

Ikwanyere onye ugwu na ndụ nakwa ọnwụ

Obi Cubana na ndí ezinaúló ya

Ebe foto si, Uche Akolisa

Inye mmadu onyinye ehi na ndụ maọbụ n'ọnwụ bụ oke ihe igosi nkwanye ugwu pụrụiche dịka ya bụ anụ galara oke ọnụ ma gbakwa agba nke ukwu.

Igbụ otu ehi bụ ihe ukwu na anya ndị mmadu na ala Igbo imezu ya abụọ, maọbụ atọ bụ oke ihe, igbufe karia atọ bụ akụkọ dara uda , ya mere eji echi ndị mmadụ echichi "ogbu ehi" na otutu mpaghara ala Igbo.

Dika anyi kọwagoro mkpa igbu ehi na mmeme ala Igbo, kedu ihe mere Nne nwaamadi bụ Obi Cubana ji adata onyinye ehi ehị nari abụọ na iri anọ na isii?

Ndị nwere agba kwụrụ n'ụlọ

Cubana Chiefpriest

Ebe foto si, Cubana Chiefpriest-Instagram

Igbo sị na a hụ dịmkpa, ahụ ogologo, imi ya.

Ndị ọnụ na-eru n'okwu gụnyere ndị ojiegoachmụ ego, ndị ọchịchị, ndị ihe ejije tụrụ ka anwụ n'ime mmanụ anwụ n'ọba maka ya bụ olili ozu.

Junior Pope na e-Money

Ebe foto si, Jnr Pope/Instagram

Mgbe Gboo:

Okpokoro isi anụ ndị a bụ igosi onye ọbịa ọbụla ka aka ruru ezinụlọ ọ batara.

N'oge gboo n'ala Igbo, n'ime obi ndị aka ruru, ị ga-ahụ okpokoro isi anụ dị iche iche egbugoro ndị lara mụọ, dịka okpokoro isi ewụ, okpokoro isi ehi nakwa okpokoro isi ịnyịnya.

Ọ buru na be ndị dinta, i nwekwara ike ịhụ okpokoro isi anụ ọhịa dị iche iche dịka isi agu, isi ele, isi mgbada, isi odum nakwa anụ ndị ọzọ.

Na gboo, ndị mmadu na-edowe ihe ngosi a n'obi ha i ji gosi ka aka ruru ha.