Lee obodo ụmụnwaanyị ji aramara echere ọbịa ọjị
Ndị Himba

Ebe foto si, Getty Images
Ka ndị si dị iche, ka omenala ha si dị iche. Ndị Himba dị na mpaghara Ugwu mba Nambia dị na Ndịda Afrika bụ ndị a na-akpọ' ndị uhie' bụ ndị ka na-eso omenala nna nna ha.
Ndị Ovahimba nakwa Ovazemba bụ ndị a sị mba Angola bịa biri na Nambia bụ ndị na-achịgharị ehi,ewu na atụrụ.
Mgbuchapụ agbụrụ ha gabigara n'aka ndị agha mba Jamini, ndị Himba bụ agbụrụ na-ala ala dị ihe puku ise.
Na-agbanyeghị mgbanwe mmepe obodo, ndị agbụrụ ka ji omenala ji nwaanyị eche ọjị biri bụ ihe ha kpọrọ "Okujepusa Omukazenda" .
Di bi ụlọ nwere ikike inye onye ọbịa pụrụ iche nwunye ya dịka ọjị.
Nwoke ahụ ga-ehi n'ọnụmara ọzọ, ebe nwaayị ya n'ọbịa ahụ ga-ehikọ.

A na-ahụtakwa ụmụnwaanyị ha dịka ndị mmara ezi mma karịcha n'Afrika.
Mana ha anaghị asa ahụ n'ihi na ha na-ebikarị n'ikpa ebe mmiri adịghị.
Mana ha na-eji ụgọfụ si na mkpọrọgwu na mkpagwụkwọ enucha onwe hakwa ụbọchị.
N'afọ 2014, otu onye omeiwu mba Namibia bụ Kazeonjere Tjeundo kpọrọ oku ka e tinye ya n'iwu ikike nwoke nye nwoke ọzọ nwunye ya ka ya na ya hie, sị na "ọ bụ omenala na-eweta udo eme ka ụdọ ji enyi na-enyi siwanye ike".
Ugbua, Eze obodo, Omuhoro, Chief Nongaba tụrụ arịrị na mmepe obodo emebiwela ọtụtụ ihe ndị e ji mara ha.
"Uwa agbanwela."
Ndị Wodaabe

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụghị naanị ndị Himba, na agbụrụ Wodaabe, nwaanyị nwere ike is oro di ya gaa mmemme, soro nwoke ka ya mma larie.
Ndị agbụrụ Wodaabe na mba Nijie bụ ndị na-eme emume a kpọrọ "Gerewol" bụ ịma aka nwoke kachasị mma.
Ụmụnwoke ga-eyi akwa mara mma, techasịa ma yiri ọla dị iche eche na-ete egwu,na-aja eze,ụmụnwaanyị bịara mmemme ahụ ga-elezikwanụ anya nwoke kachasị maasị onye.
Nwaanyị nwere ike gbahapụ di ya, soro nwoke ọzọ ka ya mma ọ hụrụ n'emume ahụ gawara ụwa ya.
N'otu aka ahụ, nwoke nwere ike ịso nwaanyị ọbụla họrọ ya; ma ọ luola di ma ọ lubeghị, banye ọhịa.
Ndị Kreung

Ebe foto si, Getty Images
Ha bụ agbụrụ dị na mba Cambodia.
Nwaanyị tolite agbọghọ , nna ya alụpụrụ ya ụlọ ebe ya na ụmụokorobia chọtara ya ga na-anọ akpa.
O nwere ike nkata abụ aghọ ngịga, ha alụwa onwe ha.
Dịka National Geographi siri kọwaa, naanị ma ha kwekọrịta ịlụ onwe ha ka ị ga-ahụ nwagbọghọ na nwaokorobia ka ha na-egosi na ha na-agakọ.
N'omenala ala ha, nwaagboghọ nwere ikike inwe ọtụtụ enyi nwoke, ọ bụghị nsọ n'ihi na oọ bụ n'ime ndị a ka o nwere ike ịhọrọ onye ọ chọrọ ka ọ bụrụ di ya.









