Lee ụfọdụ okporoụzọ bụ ọnya ndị ntọrị ji atọrọ ndị mmadụ n'Enugwu Steeti

OKporoụzọ Fourcorner

Mkpamkpa ndị ntọrị na-akpa n’ụfọdụ okporoụzọ Enugwu steeti ugbua emeela ka ndi njem na-achịzi n'obi ha n’aka.

Ọtụtụ ndị njem a na-agbazị ọsọ ime njem n’okporoụzọ Ugwogo-Opi, Fourcorner nakwa Eke-Affa-Egede maka etu ndị ntọri si akpa ike ebe ahụ

Akụkọ na ndi ntọrị na-eburu ndị njem n'okporoụzọ ndị a abụrụla ọkpụkpụ gbadoro n’akpịrị.

Kwa izuụka a nụ otu akụkọ ka ha siri kpokọrọ ndị na-eme njem baa ime ọhia, ma nara ezinaụlọ ha nde kwụrụ nde, puku kwụrụ puku naịra tupu a tọhapụ ha. Ọtụtụ n'ime ndị a tọọrọ anwụọla maka na ezinaụlọ ha ewetaghị ego iji kwụọ ụgwọ n'isi ha nke a kpọrọ “Ransome”.

Lee ụfọdụ okporoụzọ ndị ntọrị kachasị akpaike n'Enugu;

Okporoụzọ Fourcorner gawa Udi

Okporoụzọ Four corner gawara Udi n'Enugwu

Ụzọ Four Corner gwara Udi bụ nke ndị njem si Enugwu gawa Awka na-esi ka njem dịrị ha nkenke.

Mana ndị ntọrị jizi ya bụ ụzọ mere ebe ha na-akpa ike. Ọtụtụ oge ka ihe onyonyo na-egosi ka ndị ntọrị sị kwụsi ụgbọala ndị njem ma kporo ha baa n'ime ọhịa na-efegharị na soshal midia.

Ebe ha kachasị akpa ike n'ologolog ụzọ ahụ bụ na mpaghara Ishi Ozalla na Nvene.

Ndịagha Naịjirịa na ndị uweojii nwere ọdọ nchekwa a kpọrọ 'checkpoint' dị nso n'Ishi Ozalla na Nvene ahụ.

Okporoụzọ Ugwuogo-Opi-Nsukka

Ụzọ a bụ mpio e ji esi Enugwu aga Nsukka dịzị ka ọ bụzị isioche ndị ntọrị.

Ngwa ngwa ndị njem na-aga Nsukka ruru n'Ugwuogo roundabout, ha na-achịzi obi n'aka ruo mgbe ha ga-agafecha Ekwegbe Agu, gafee Opi tupu ume ekudaa ha.

Site n'ọhịa Alụsị Apị-Opi ka ndị ntọrị mmadụ ahụ na-anọ na-akpa ike.

N'ọnwa ole ma ole gara aga, ka ndị ntọri tọọrọ onye jibu ọkwa 'Chief of staff n’Enugwu bụ Dọkinta Dan Shere n'ọhịa Opi.

Nwamadị ahụ gbara ama na ọ kwụrụ nde kwuru nde naịra tupu ha atọhapụ ya. Shere kwukwara na onwere ndị ọzọ ha jikwa n’ime ọhịa ebe ekedoro ya.

Ọtụtụ oge ka ndị uweojii na ndịagha na-agba ndị omekome ha jidere n’ime ọhịa Ugwuogo-Opi-Nsukka, mana ihe na-ebe ka na-ebe.

Okporoụzọ Eke-Affa-Egede

Ụzọ a bụzi kwa izuụka ka ndị ọchịehi ji eburu ndị njem aba ime n'ọhịa.

Ọ bụzi akaọrụ ọtụtụ n’ime ha n’ihi na ha na-enweta nnukwu ego na ya.

N'ụbọchị 17 nke ọnwa a bụ Septemba ka ndị ntọri tọọrọ ụkọchukwu Katọlika bụ Fada Marcellinus Obioma Okide ka ọ na-agba n’ụzọ Eke-Affa-Egede iji laghachị n'ebo ọzụzụ a tụrụ ya dị na St. Mary Amofia-Agu dị n’Affa.

Onye Chanselọr nke Enugwu Dayọsis bụ Fada Agubuchie kwuru ndị ntọri ahụ tọkwaara mmadụ isii ọzọ n'ebe ahụ ma sị ka a kwụọ ego ruru nde naịra 100 n'isi ụkọchukwu ahụ.

Okporoụzọ Ezzeagu-Ugwuoba

Ndị omekome a nọkwa n'ọhia Ezeagụ nakwa Ugwuoba na-akpakwa ike kwa mgbe kwa mgbe.

Ajọ ọnọdụ a mere na onye ọbụla chi jigidere n'abalị na-achịzi obi ya n’aka.

Kọmishọna Uweojii ọhụrụ ewetara n’Enugwu steeti bụ Kanayo Uzuegbu aṅụọla iyi na ọ ga-ekpochapụ ndị ohi na ndị ama juru n'Enugwu Steeti.