Etu ọtụtụ ndụ si laa n'iyi na mwakpo mere n'Eha-Amufu

Ebe foto si, Enugu Govt
Ọtụtụ mmadụ tụfuru ndụ ha na mwakpo mere n'Eha-Amufu, obodo dị n'okpuru ọchịchị Isi Uzo n'Enugu Steeti, n'ụbọchị Sọnde, abalị iri na asatọ nke ọnwa Disemba 2022.
Ndị obodo gwara BBC Igbo okwu kwuru na ọ bụ ndị ọchịehi mere mwakpo a, mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe azaghị oku nakwa ozi anyị zigaara ya maka nke a.
Nke a abụghị nke mbụ a na-awakpo obodo Eha-Amufu n'ime ọnwa olemole gara aga, ụdị mwakpo a emeela ugboro ugboro, dịka gọọmentị Enugwu steeti na-ekwe nkwa na ha ga-ewulite ọnọdụ nchekwa n'ebe ahụ.
"Mwakpo nke ụnyaahụ kacha njọ kamgbe ha ndị ọchịehi a malitere ịwakpo obodo anyị," otu onye Eha-Amufu na-achọghị ka anyị kpọpụta aha ya gwara BBC Igbo.
"Ndị bịara mwakpo a karịrị akarị ọnụọgụgụ ha bụ narị kwuru narị."
Onye a kwuru na ndị ọchịehi ahụ kuriri ụlọ ndị mmadụ karịrị 12, ma gbukwaa ọtụtụ ndị mmadụ.
Oge anyị jụrụ ya ihe ndị agha na-eche nche na mpaghara ahụ mere maka ya bụ mwakpo, o kwuru na oge ha bịarutere, onweghị ihe ọbụla ha mere.
Nwa amadi a mechara zitere anyi foto otu onye ọ sị na ndị mere mwakpo ahụ gburu, mana ya bụ foto adịghị mma n'anya itinye ya n'akụkọ a.
Onye ọzọkwa aha ya bụ Ọkaiwu Festus Ede, kwuru na ndị ọchịehi ahụ si mpaghara Abo Eha-Amufu wee wakpoo ha.
"Ha gbuchara ndị nche na-eche nche n'obodo anyị tupu ha abata n'ime obodo malite imebi ụlọ ndị mmadụ," Ọkaiwu Festus kwuru.
"Ha wakporo ụlọahịa ndị mmadụ, kụkaa ya ma bupụta mmanya ndị mmadụ na-ere ere na-aṅụ. Ha na-aṅụ ha a na-asị onye ọbụla chọrọ ọgụ ya pụta."
Ọkaiwu Festus kwuru na tupu ndị agha esi na mpaghara ebe e nwere ụlọakwụkwọ 'College of Education' gbataruo ebe mwakpo a mere, ihe niile emechaala.
Oge BBC Igbo jụrụ ọkaiwu Festus ihe o che na-akpata mwakpo ndị a, o kwuru sị, "amaghị m ihe ndị ọchịehi a chọrọ. Ọ bụghị ala ka anyị na ha na-azọ, maka na anyị na ha enweghị oke ala."
"Ndị anyị na ha gbara agbatobi bụ ndị Benue, onweghịkwanụ esemokwu dị n'etiti anyị na ha," ka o kwuru.
Mwakpo Eha-Amufu n'oge gara aga
Awakpoola ndị obodo Eha-Amufu ugboro ugboro n'afọ a bụ 2022.
N'ụbọchị 21 nke ọnwa Nọvemba, ndị ọchịehi gburu ọtụtụ mmadụ oge ha wakporo obodo Eha-Amufu.
Gọvanọ Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Okowa gara tie ndị ya bụ ihe metụtara aka n'obi ma nyekwa ha onyinye nde naịra iri.
N'ụbọchị itoolu nke ọnwa Disemba, ndị ekperima yicha uwe ndị uweojii na uwe ndị agha wakpokwara Eha-Amufu, gbuo ọtụtụ mmadụ ma laa ọtụtụ ụlọ n'iyi.
N'ọnwa Mee 2022, ndị ọchịehi gburu otu nwoke aha ya bụ Ejike Odo, n'Eha-Amufu, dịka ndị obodo ahụ si kọọrọ BBC Igbo.









