Lee ọhịa dị iche iche ndị ntọrị mmadụ na-akpa ike n'Enugwu Steeti

Ndị njem kwụsrị maka ndị ntọ

Ebe foto si, Screengrab

Ntọrị mmadụ abụrụla chi foo anụ ọzọ n'Enugwu Steeti ugbua. Ka atọrọ nwoke bụ ka atọrọ nwaanyi, ndị ji ụgbọ ala nke onwe ha nakwa ndị mkpata ego gunyekwa ndị ji ụkwụ ha aga n'okporo ụzọ.

Ndị Uweojii Enugwu steeti ewepụtala ozi were kpọpụta ọhịa atọ n'Enugwu ebe ha zọpụtara mmadụ iri na abụọ na-aka ndị ntọrị mmadụ n'ime izuụka ole ma ole gara aga.

Kọmishịọna Uweojii n'Enugwu bụ CP Ahmed Ammani kọwara site n'ọnụ onye na ekwuchitere ndị uweojii bụ Daniel Ndukwe na ha zọpụtara ndị ahụ n'ọhịa ndịa:

1: Ekwegbe-Agu na Neke Uno.

Ụmụnwoke abụọ ka ha napụtara ndị omekaome ahụ gbachiri ụzọ esi aga nsụkka ụbọchị 21/9/2022 ka o ji nkeji iri gafee elekere asaa nke abalị.

2: 9th Mile-Okpatụ- Ụmụlumgbe

Ụbọchị 16/09/2022 ka ndị uweojii zọpụtara mmadụ anọ n'Ohịa okpatu nke dị na Okpuru ọchịchị Udi.

3: Awhum Udi LGA : 14/09/2022 ka oji nkeji iri na ise gafee elekere anọ nke mgbede, ndị uweojii , forest Guard na neighbourhood watch zọpụtara mmadu isii gara ikpe ekpere na akụkụ Awhum Monastery tupu ndị ntọrị eburu ha.

Ndị uweojii na onye ntọ ha jidere

Ebe foto si, RIVERS STATE POLICE COMMAND

Gịnị ka ndị uweojii na-eme?

Kọmishịọna ọhụrụ ndị uweojii nke Enugwu Steeti bụ Ahmed Ammani kwuru na ya ga-enye ndị ntọrị nille nọ n'ọhịa Enugwu ọsọ ụkwụ eru ala. Ọ wepụtara akara ekwentị ndịa maka ozị gbata gbata ọbụla

08032003702

08075390883

08086671202

Lee ihe ndị gabigara ihe na-aka ndị ntọrị mmadụ n'Enugwu gwara BBC.

Ọhịa Egede-Afa Udi LGA

Ọhịa
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọ bụ eziokwu na Onye isi uweojii ohụrụ ụbọchị atọ nke ọnwa Jun n'afọ a (3/6/2022) ka okey Ibe ( ọbụghị ezigbo aha ya ) kọọrọ BBC na ya na enyi ya nwoke gara olili ozu nna enyi ha nwoke n'Egede dị n' okpuruọchịchị Udi n'Enugwu steeti.

Ngwa ngwa ọ kụrụ elekere isii nke mgbede, ya na enyi ya nwoke jiri ụgbọala ha tinye isi na ụzọ awara awara Egede lawa isi obodo Enugwu.

Ka ha na agba n'ụzọ ahụ ndị ntọrị ji egbe gbawaa ụkwụ ụgbọala ha nke kwụsịrị ụgbọala ha n'ike. Ndị ntọrị ahụ buuru ha banye ọhịa Egede na Afa.

Ha jiri ekwe ntị ha kpọọ ndị ezinụlọ ha sị ha weta nde naịra iri ise.

Mazi Ibe na enyi ya nwoke nọrọ abalị atọ n'aka ndị ntọrị tupu ndi ezinụlọ ha akwụọ nde naira abụọ ejiri tọhapụ ha.

N'ime ụbọchị atọ ahụ dịka osiri kwuo, ndị uweojii 9th mile na anti-Kidnapping Enugwu enyehị aka ịga na ime ọhịa kpọpụta ha, kama ha gwara ndị ezinụlọ ha ka ha kwụọ ya bụ ego.

" mmiri mara anyị na ahụ ụtụtụ, ehihe ma abalị rue ụbọchị anọ tupu ha atọhapụ anyị"

"Apa niile a nọ m na ahụ bụ ihe ha tiri mụ na enyi m mwoke, onwere oge m chere na ha ga agbagbu anyị m'ime ọhịa ahụ"

Ọhịa Awhum Udi LGA ( na akụkụ Awhum Cistercian Monastery Awhum) 12/9/2022

Mmiri nọ n'etiti ọhịa

Nwada Ifeoma Ude ( ọbụghị ezigbo aha ya) ji mkpu ekele na ọṅụ kọwaa na ya ji anya ya hụ ntị ya ebe ya na mmadụ ise ọzọ gara na-ohịa Awhum ikpe ekpere. Awhum Monastery bụ ebe ndi ụka katọliki na-aga ekpere mgbe niile n'Enugwu. Ifeoma kwuru na ha gara denye aha n'akwụkwọ dịka iwu ya bụ monastery siri dị.

Oteghị aka ha bara ime ọhịa ịmalite ekpere, ndị ọchụehị wakporo ha kpụrụ ha niile baa ime ime ọhịa. Ha naara ha ekwe nti ha gwa ndị ezinụlọ ha weta ego dị nde naira iri ise.

Ifeoma kwuru " ha tiri anyị nnukwu ihe, mana obi siri m ike makana m na ekpe ekpere n'obi m oge niile."

"ihe m na-ekpe n'obi m bụ...God of Zion Deliver me"

Ka o ruru ụbọchị nke atọ, ndị ntọrị ahụ zara ekwe ntị ha, were hapụ ha n'ime ọhịa ahụ gbaa ọsọ. "Orụghị 5 minutes ha gbara ọsọ, ndị uweojii, forest guard na neighborhood watch awụchịe n'ime ọhịa ahụ tọhapụ anyị"

" ndị uweojii gwara anyị na kamgbe abalị atọ ka ndị monastery gwara neighborhood watch na ndị gara ekpere n'ime ọhịa alachiteghị azụ.

Akụkọ ndị a pụtara na-aka ndị ntọrị na ndụ kọọrọ anyị bụ mkpụrụ ole ma ole n'ihe karịrị akarị dịka ọ na eme n'Enugwu.

Ndị Enugwu na-elegide ọchịchị ọhụrụ Ammed Ammani ka ọ ga esi kwọọ onye ukwu wara ka ọhịa Enugwu dịkwa n'udo k aọ dị mbụ.