Armed attack in Imo: Etu ndị uweojii si napụ ndị ojiegbe akwụ n'ọnụ n'Owere taa bụ Satode

Ebe foto si, ImoState Police Command
Ndị uweojii Imo steeeti ekponyerela otu ndị ojiegbe mmadụ ise wakporo mpaghara Ikenegbu dị n'Owere n'ehihie mụ anya n'ụbọchị Satode, aja na garị dịka ha zọchiri oge ha nọ ọrụ ohi, gbagbuo otu n'ime ha ma nwụchie mmadụ abụọ ndị ọzọ.
A nwụchiri Peter Gaura gbara afọ 27, onye Kogi steeti bụ onye agha a chụrụ n' ọrụ na Promise Joshua gbara afọ 25, onye Delta steeti na-arụ ọrụ akpụobi (bouncer)n'ụlọnkwari dị n'Owere, ebe a gbagburu onye otu ha kwọrọ ha gaa ya bụ ohi nke a kpọghị aha ya.
Ndị nọ ebe ihe mere gwara BBC Igbo na ndị omekome ahụ a na-enyo enyo yi akwa ndịagha, ji ngwaagha kara aka ma kwọrọ ụgbọala Hilux dị ọcha wakporo ọdọ ebe a na-ere ọla dị na ncherita ihu ụlọnri a ma ama n'Ikenegbu, Owere.
Otu onye n'ime ha kwuru na oge ndị omekome ahụ rutere, na ha zuru ọla dara nde kwuru nde naira, na-apụzị oge ndị uweojii du onye ọzọ bịara ịzụ ihe na nso ebe ndị ohi ahụ nọ ghọtara ihe na-eme ma malite kwawa ha mgbọ.
Ndị omekome ahụ sara ha, ma malite kwawa mgbọ nke ha , nke mere ka ndị nile nọ nsọ; oke n'ọsọ, ngwere n'ụzọ dịka ndị nwere ọdọahịa ji ọsọ gbachie ọdọahia ma rie mbọ mbọ ọsọ.

Ebe foto si, Imo state Police Command
Mgbọ egbe ndị uweojii tụrụ ọkwọụgbọala ndị ojiegbe ahụ, ọ nwụọ ozigbo.
Ndị otu ya rituru n'ụgbọala Hilux ahụ, chọwa ụzọ ma na-agba egbe aghar aghara dika ha na ọsọ na-eme.
Mana aka ndị uweojii kpatara abụọ n'ime ha.
Komishona ndị uweojii Imo steeti bụ Muhammed Berde kelere ndị ọrụ ya site n'olu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Henry Okoye, maka ikposa atụmatụ ndị omekome ahụ oge e gosiri ndị ntaakụkọ ndị omekome ahụ a na-enyo enyo n'isiụlọọrụ ndị uweojii dị n'Owere ụbọchị Satode.











