Ndị ojiegbe egbuola otu eze ọdịnala n'Aboh Mbaise, Imo Steeti, n'ime obi ya

Ebe foto si, James Nnamdi Family
Ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ wakporo mpaghara Aboh Mbaise n'Imo Steeti, taa bụ Mọnde, Julaị 17, gbagbuo eze ọdịnala na-achị obodo Nguru, aha ya bụ Eze James Nnamdi.
Nke a mere n'ebe elekere atọ nke ehihie dịka eze ahụ na-anabata onye ọbịa chọtara ya n'obi ya.
Ndị ojiegbe a malitere ịgba egbe aghara aghara oge ha batara nke mere ka ndị mmadụ nọ na gburugburu ahụ tinye isi n'ọhịa, tupu ha abanye n'obie eze ahụ gbagbuo ya.
Otu onye obodo ahụ na-achọghị ka anyị kpọpụta aha ya gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ọ bụ ihe oke egwu mere n'obodo ha.
"Ihe e ji mara Eze anyị bụ 'Eze Mmiri ọma'," ka onye ahụ kwuru. "Ọ bụ nnukwu ihe mwute nakwa ihe egwu etu e si gbagbuo ya n'ime obieze ya."
O kwukwara na onye ọbịa ahụ chọtara eze oge mwakpo a mere nọ ugbua anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ akpọghị aha ya.
Ihe ndị uweojii Imo steeti kwuru

Ebe foto si, Imo State Police Command
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye gwara onye ntaakụkọ anyị na ya bụ ihe mere n'ezie.
"Kọmishọna ndị uweojii Imo Steeti bụ Mohammed Ahmed Barde katọrọ mwakpo nakwa ogbugbu Eze Mmiriọma, bụ onye nwụrụ dịka e bugara ya n'ụlọọgwụ n'ihi egbe a gbara ya," Okoye kwuru.
"O hibekwala otu nnyocha pụrụ iche iji lebaa anya n'okwu a, ma chọta ndị kpara arụ ma mee ka ha jiri isi ha buru ihe ha kotere."












