Etu mgbọ e chere si n’egbe ndị NDLEA si tugbuo nwata dị afọ abụọ

Ebe foto si, Harrison Gwamishu/NDLEA
Ngalaba na-ebu agha megide ọgwụike bụ 'National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA), ekwuola na ha na-enyocha etu ndị ọrụ si gbagbuo onye nọọ onwe ya n'Asaba, Delta steeti dịka ha wakporo ọdọ ebe a na-ere ọgwụike n'Asaba, Delta Steeti.
Akụkọ na-ekwu na mgbọ si n'egbe ndị ọrụ NDLEA wakporo ọdọ ebe a na-ere ọgwụike n'ọkporoụzọ Okpanam n'Asaba Delta steeti ụbọchị Tọzde gara tụgbuo obere nwa dị afọ abụọ nọrọ onwe ya a kpọrọ Ivan Omhonria , ebe a na-azọ ndụ nwanne ya ọzọ bụ Eromonsele Omhonria n'ụlọọgwụ 'Federal Medical Centre (FMC), Asaba.
Nna ụmụaka ahụ kwụrụ na o teghị aka ya si ụlọakwụkwọ kpọlata ụmụ ya abụọ ma hapụ ha n'ọdọahịa nwunye ya pụọ oge nwuye ya kpọrọ ya n'ekwentị kọrọ ya ọdachi dakwasịrị ha.
"Nwunye m kpọrọ n'ekwentị na-ebe akwa, sị m lọghachi n'ọdọahịa na mgbọegbe tụụ ụmụ anyị abụọ."
" Ka m na-alọghachị, ọ kpọrọ m ọzọ sị m a ebugawala ụmụaka ahụ Ụlọogwụbịawa n'ụlọgwụ 'Federal Medical Centre , Asaba".
"Ekpebiri m ịgawa n'ọdọahịa anyị iji mata ihe mere."
" Ahụrụ m ụgbọala Hilux Van, Sienna mini bus na Honda Saloon nke ndị ọrụ NDLEA ji ngwa agha juru n'ime ha."
Ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Femi Babafemi binyere aka ma wepụtara ụbọchị Satọde, n'ọbaozi Facebook, kwuru onyeisi NDLEA bụ Mohamed Buba Marwa ehiwela otu pụrụ iche ga-esi Abuja gaa Asaba maka inyocha ihe mere kpọmkwem.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọ sịrị," National Drug Law Enforcement Agency, NDLEA, ekwuola na ha na-enyocha ọgbụgba egbe metụtara ndị ọrụ oge ha wakporo ọdọ ọgwụike n'ebe Okpanam n' Asaba, Delta seetiti bụ ebe mgbọ tụụ obere onye , e mechaa ọnwụọ n'ụlọgwụ dịka a na-elekọta ya."
Ọ gara n'ihu kọwaa, n'ihe mere bụ na , "Ndị ọrụ NDLEA nwetara ozi nke gbara ha ama maka otu onye na-agba mgbere ọgwụike nke mere ka ha wakpoo ọdọ ya dị n'ebe Okpanam n'Asaba n'ebe Elekere anọ nke ehihie Tọzde, abalị 13 nke ọnwa Julai afọ 2023."
" Ka nke a na-eme, ụgbọala Toyota Camry 2008 model, na-acha anụnụ(blue) zọpụ ọsọ ma kuto , otu na ndị ọrụ anyị bụ onye nọ n'ụlọọgwụ ugbua."
“Iji hụ na ụgbọala ahụ agbaghị ọsọ, otu na ndị ọrụ anyị gbara egbe na 'tyre ụgbọala , nke mechara gbalaga."
"Dịka e ji ọsọ buga onye ọrụ NDLEA ụlọọgwụ, , ndị ọrụ anyị nwetara ozi na mgbọ tụrụ onye na-eto eto ma gbaga chọta nna onye ihe metụtara, soro ya gaa ụlọgwụ ma na-enye aka na nlekọta ya n'ụlọọgwụ tupu ọ nwụọ.
Ọ gara n'ihu sị na ha na ezinaụlọ ndị o metụtara na-akpa dịka nnyocha na-aga n'ihu.












